Obi Dị Anyị Ụtọ na Anyị Na-etinye Onwe Anyị n’Ozi Jehova!
1 Obi dị Pọl onyeozi ụtọ na e ji ya “mee ihe n’ụzọ zuru ezu” iji jezuo ozi ya dị ka Onye Kraịst. (2 Kọr. 12:15) Taakwa, ọtụtụ Ndị Kraịst bụ ndị ọsụ ụzọ na-arụsi ọrụ ike. Ndị ọzọ na-ewepụta oge iji jee ozi ọma kwa izu n’agbanyeghị nnukwu ibu ọrụ ha nwere n’ezinụlọ ha. N’agbanyeghị na ọrịa ji ụfọdụ ndị aka ọjọọ, ha na-eji obere ike ha nwere ejere Jehova ozi. Lee nnọọ otú o si bụrụ ihe na-agba ume ịhụ ndị Jehova ka ha na-etinye onwe ha n’ozi Jehova n’agbanyeghị afọ ndụ ha na ọnọdụ dịgasị iche iche ha nọ na ya!
2 Ịhụnanya Anyị Nwere n’Ebe Ndị Agbata Obi Anyị Nọ: Ime ihe nile anyị nwere ike ime iji jeere Jehova ozi ma gosi na anyị hụrụ Chineke na ndị agbata obi anyị n’anya na-eme ka anyị nwee akọnuche dị ọcha. Ọ bụ n’ihi na Pọl ji obi ya nile jee ozi ọma mere o ji nwee ike iji obi ụtọ kwuo, sị: “Ana m akpọ unu ka unu gbaa akaebe n’ụbọchị taa na adị m ọcha n’ebe ọbara mmadụ nile dị.” (Ọrụ 20:24, 26; 1 Tesa. 2:8) Ikere òkè n’ozi ubi ruo n’ókè ọnọdụ anyị nyere ohere ya ga-eme ka ikpe ọbara ghara ịma anyị.—Ezik. 3:18-21.
3 Ịrụsi ọrụ ike iji nyere ndị mmadụ aka na-eme anyị obi ụtọ. (Ọrụ 20:35) Otu nwanna nwoke kwuru, sị: “N’eziokwu, ike na-agwụ m n’oge uhuruchi ọ bụla m si ozi ọma lọta. Ma obi na-adị m ụtọ, ana m ekelekwa Jehova n’ihi inye m ụdị ọṅụ nke ọ na-adịghị onye pụrụ ịnapụ m ya.”
4 Ịhụnanya Anyị Nwere n’Ebe Chineke Nọ: Ihe kasị mkpa mere anyị ji etinye onwe anyị n’ozi Jehova bụ na ọ na-atọ Nna anyị nke eluigwe ụtọ. Ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ na-akpali anyị ime ihe o nyere n’iwu, bụ́ nke na-agụnye ikwusa ozi ọma na ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. (1 Jọn 5:3) Ọbụna mgbe ndị mmadụ na-enweghị mmasị n’ozi anyị, ma ọ bụ na-emegide anyị, anyị na-eji ọṅụ anọgide na-arụsiri Jehova ọrụ ike.
5 Ugbu a abụghị oge ike kwesịrị ịgwụ anyị. Oge anyị bi n’ime ya bụ oge owuwe ihe ubi. (Mat. 9:37) N’oge owuwe ihe ubi, onye ọrụ ugbo na-arụkarị ọrụ ruo ogologo oge n’ihi na o nwere nanị obere oge iji chịkọta ihe ubi ya tupu ya amalite imebi. N’otu aka ahụkwa, oge anyị nwere maka owuwe ihe ubi ime mmụọ dị ntakịrị. Ka anyị nile na-eburu oge anyị bi n’ime ya n’obi ma nọgide na-etinyesi onwe anyị ike n’ọrụ ikwusa ozi ọma.—Luk 13:24; 1 Kọr. 7:29-31.