Ihe A Kụrụ n’Ubi Achaala Maka Owuwe Ihe Ubi
1. Olee ọrụ dị mkpa na-aga n’ihu ugbu a?
1 Mgbe Jizọs zichara nwaanyị Sameria ozi ọma, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Welienụ anya unu lee ubi, na ihe a kụrụ na ha achaala maka owuwe ihe ubi.” (Jọn 4:35, 36) Ọrụ ịchịkọta ndị ga-ege ntị n’ozi Alaeze amalitela, Jizọs lepụkwara anya n’ihu hụ otú a ga-esi rụọ ọrụ a n’ụwa niile. N’agbanyeghị na Jizọs nọ n’eluigwe, ọ ka na-elekọta ọrụ owuwe ihe ubi a. (Mat. 28:19, 20) Olee ihe ndị na-egosi na e kwesịrị ịrụsi ọrụ a ike ugbu a oge gwụwarala agwụ?
2. Olee ihe ndị na-egosi na a ka kwesịrị ịrụsi ọrụ owuwe ihe ubi ahụ ike n’ụwa niile?
2 Owuwe Ihe Ubi Zuru Ụwa Ọnụ: N’ụwa niile, ndị nkwusa e nwere n’afọ ije ozi 2009 ji ndị nkwusa narị puku abụọ, puku iri na isii, na narị itoolu, iri isii na anọ karịa ndị nke e nwere n’afọ ije ozi 2008. E nwekwara mmụba ruru pasent iri na anọ ná mba ndị a machibidoro ozi ọma Ndịàmà na-ekwusa iwu. Ndị a na-eduziri ọmụmụ Baịbụl kwa ọnwa karịrị nde asaa, narị puku isii, na puku iri na itoolu. Ọnụ ọgụgụ a karịrị ọnụ ọgụgụ kacha elu nke ndị nkwusa nyere akụkọ ozi ha n’afọ ije ozi 2008, ọ fọkwara obere ka o jiri ọkara nde mmadụ karịa ọnụ ọgụgụ ndị e duziiri ọmụmụ Baịbụl n’afọ ije ozi 2008. Ka a na-enwekwu ọtụtụ ebe ndị a chọkwuru ndị nkwusa, ọtụtụ ndị na-edeta akwụkwọ ka e zitere ha ndị ozi ala ọzọ gara ụlọ akwụkwọ Gilied na ndị gụchara akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi. N’ọtụtụ mba, ebe e nwere ọtụtụ ndị na-asụ asụsụ ala ọzọ, a na-enwekwu ndị na-abata n’eziokwu. O doro anya na Jehova na-eme ka a rụzuo ọrụ a ọsọ ọsọ n’oge ọgwụgwụ nke owuwe ihe ubi ahụ. (Aịza. 60:22) Obi ò siri gị ike na e nwere ndị bi n’ókèala unu ugbu a ga-emecha bata n’eziokwu?
3. Olee ihe ụfọdụ ndị nwere ike ịna-eche banyere ókèala ha?
3 Owuwe Ihe Ubi n’Ókèala Unu: Ụfọdụ ndị nwere ike ịsị, “Ókèala anyị anaghị amị mkpụrụ.” N’eziokwu, o yiri ka ókèala ụfọdụ anaghị amị mkpụrụ ka ndị ọzọ ma ọ bụ ya abụrụ na ha anaghịzi amị mkpụrụ otú ha si amị n’oge gara aga. N’ihi nke a, ụfọdụ Ndịàmà nwere ike ichewe na ọtụtụ ndị ga-abata n’eziokwu n’ebe ndị ahụ abatachaala, nakwa na ozi ọma ha na-aga bụzi naanị iji chọta mmadụ ole na ole fọrọnụ. Ọ̀ bụnụ eziokwu?
4. Olee otú dị mma anyị kwesịrị isi na-ele ozi anyị anya, gịnịkwa mere anyị ga-eji na-ele ya anya otú ahụ?
4 A naghị ezu ike n’oge a na-ewe ihe ubi, malite mgbe e bidoro iwe ihe ubi ruokwa mgbe e wechara ya. Legodị otú ihe a Jizọs kwuru si gosi mkpa ọ dị ịrụ ọrụ a ọsọ ọsọ. Ọ sịrị: “Ihe ubi hiri nne, ma ndị ọrụ dị ole na ole. Ya mere, na-arịọnụ Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ ka o ziga ndị ọrụ n’owuwe ihe ubi ya.” (Mat. 9:37, 38) Ọ bụ Jehova, Onye nwe owuwe ihe ubi, ka ọ dị n’aka ikpebi mgbe ihe a kụrụ n’ubi ga-amị mkpụrụ na ebe ọ ga-amị mkpụrụ. (Jọn 6:44; 1 Kọr. 3:6-8) Gịnị bụ ọrụ anyị? Baịbụl gwara anyị, sị: “Ghaa mkpụrụ gị n’ụtụtụ, ekwekwala ka aka gị zuo ike ruo n’anyasị.” (Ekli. 11:4-6) N’eziokwu, oge ọ fọrọ obere ka e wechaa ihe n’ubi abụghị oge anyị ga-ekwe ka aka anyị zuo ike!
5. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-ejechi ozi ọma anya n’ókèala yiri ka ọ naghị amị mkpụrụ?
5 Akwụsịla Ọrụ Owuwe Ihe Ubi Ahụ: Ọ bụrụgodị na a na-arụcha ókèala anyị ugboro ugboro, ya eyiekwa ka o nweghị ihe a na-arụpụta, e nwere ezigbo ihe mere anyị ga-eji na-anụ ọkụ n’obi n’ọrụ a ma na-arụ ya ka ndị maara na oge agwụwala. (2 Tim. 4:2) Ọtụtụ ihe ndị na-eme n’ụwa taa na-eme ka ndị mmadụ gbanwee otú ha si ele ihe anya ma chesiwe echiche ike banyere ọdịnihu. Ka ụfọdụ ụmụaka ndị anyị na-ezi ozi ọma na-aghọ okenye, ha nwere ike ịchọwa ihe ga-eme ka ha nwee obi ụtọ na ahụ́ iru ala. Ndị ọzọ nwere ike ịmalite ige anyị ntị n’ihi otú anyị si abịa ozi ọma na nke ha mgbe niile. Nke bụ́ eziokwu bụ na ndị na-enweghị mmasị taa nwere ike inwe mmasị echi. Ọ bụrụgodị na e nwere ndị kpachaara anyị jụ ige anyị ntị, o kwesịkwara ka a dọọ ha aka ná ntị.—Ezik. 2:4, 5; 3:19.
6. Ọ bụrụ na ọ na-esi ike ikwusa ozi ọma n’ókèala anyị, gịnị ga-enyere anyị aka iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ya?
6 Ọ bụrụ na ọ na-esi ike ikwusa ozi ọma n’ókèala anyị, gịnị ga-enyere anyị aka ịna-anụ ọkụ n’obi? Ihe anyị nwere ike ime bụ kama ịna-aga naanị ozi ụlọ n’ụlọ, anyị nwere ike ịna-aga ozi ọma n’ebe a na-azụ ahịa ma ọ bụ jiri telefon na-ezi ozi ọma. Ma ọ bụkwanụ anyị nwere ike na-agbanwe otú anyị si ezi ozi ọma ka ọ na-ada ka ihe ọhụrụ ná ntị ndị mmadụ. Anyị nwekwara ike ịgbanwe oge anyị ji aga ozi ọma ma na-aga ozi ọma n’uhuruchi ma ọ bụ n’oge ndị mmadụ na-anọkarị n’ụlọ. Ihe ọzọ anyị nwere ike ime bụ ịmụ asụsụ ọhụrụ ka anyị nwee ike izi ndị ọzọ na-anaghị anụ asụsụ anyị ozi ọma. Anyị nwere ike iwere ọrụ ọsụ ụzọ oge niile, si otú ahụ wepụtakwuo oge maka ozi ọma. Ma ọ bụkwanụ, anyị nwere ike ịkwaga n’ókèala a na-enwechaghị ndị ọrụ owuwe ihe ubi. Ọ bụrụ na anyị ana-ele ọrụ owuwe ihe ubi a anya otú kwesịrị ekwesị, anyị ga-enwe ike iji ike anyị niile rụọ ọrụ a dị mkpa.
7. Ànyị kwesịrị ịrụgide ọrụ nchịkọta a ruo olee mgbe?
7 Oge ndị ọrụ ugbo nwere iji chịkọta ihe ndị ha kụrụ n’ubi ehighị nne, n’ihi ya, ha anaghị ezu ike ma ọ bụ jiri ya nwayọọ ruo mgbe ha chịkọtachara ya. Otú ahụkwa ka ọ dị ma a bịa n’ozi ọma anyị na-ekwusa, anyị kwesịrị ịna-ekwusa ya ka ndị ma n’oge agwụwala. Ànyị kwesịrị ịrụgide ọrụ nchịkọta a ruo ole mgbe? Ọ bụ “ruo ọgwụgwụ usoro ihe a” nakwa ruo “ọgwụgwụ.” (Mat. 24:14; 28:20) Anyị kwesịrị ịrụcha ọrụ a e nyere anyị otú ahụ Onye ozi Jehova nke kachanụ rụchara nke ya. (Jọn 4:34; 17:4) N’ihi ya, tupu ọgwụgwụ abịa, ka anyị na-eji ịnụ ọkụ n’obi na ọṅụ na-ekwusa ozi ọma ma na-ewere na a ka nwere ndị bi n’ókèala anyị ga-emecha bata n’eziokwu. (Mat. 24:13) Ọrụ owuwe ihe ubi agwụbeghị!
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 2]
A naghị ezu ike n’oge a na-ewe ihe ubi, malite mgbe e bidoro iwe ihe ubi ruokwa mgbe e wechara ya