Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 4/1 p. 9
  • Ọrụ Ọma Ndị Na-enye Jehova Otuto

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọrụ Ọma Ndị Na-enye Jehova Otuto
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Chineke Abụghị Onye Na-ele Mmadụ Anya n’Ihu”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • “Onye Ihe Na-agara nke Ọma Ka Mmadụ nke Chọtaworo Amamihe Bụ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Atụrụ Jisọs Na-anụ Olu Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 4/1 p. 9

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

Ọrụ Ọma Ndị Na-enye Jehova Otuto

N’OZIZI Elu Ugwu ya, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Meenụ ka ìhè unu na-enwu n’ihu mmadụ, ka ha wee hụ ọrụ ọma nile unu, wee too Nna unu Nke bi n’eluigwe.” (Matiu 5:16) N’otu aka ahụ, taa ezi ndị Kraịst na-ekere òkè ‘n’ọrụ ọma’ ndị na-enye Jehova otuto.

Gịnị bụ ọrụ ọma ndị a? Ha na-agụnye ikwusa ozi ọma ahụ, ma àgwà ọma anyị bụkwa akụkụ dị mkpa. Ọtụtụ mgbe ọ na-abụ àgwà ọma anyị na-ebu ụzọ adọta mmasị ndị mmadụ n’ebe ọgbakọ ndị Kraịst dị. Ahụmahụ ndị na-esonụ na-egosi otú Ndịàmà Jehova nọ na Martinique si na-eme ka ‘ìhè ha na-enwu n’ihu mmadụ.’

◻ Ka ọ nọ na-arụ ọrụ nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ, otu n’ime Ndịàmà Jehova jere leta otu nwanyị onye Katọlik. Ruo 25 afọ nwanyị a na otu nwoke ya na ya na-alụghị di na nwunye anọwo na-ebi. Ọ maara banyere ozizi Ndịàmà Jehova, ebe ọ bụ na, ihe dị ka afọ asaa tupu mgbe ahụ, ọ nataworị akwụkwọ bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala.a Nwanyị ahụ gwara Onyeàmà ahụ, sị: “E nwere ọtụtụ okpukpe. Amaghị m onye m ga-ekweta nke ya n’etiti ihe mgbagwoju anya a nile.” Onyeàmà ahụ kọwara na a pụrụ ịchọta eziokwu ahụ nanị n’ime Bible nakwa na iji chọta ya, ọ ghaghị iji nlezianya mụọ Akwụkwọ Nsọ ma kpegara Chineke ekpere maka mmụọ ya na nduzi ya.

Ruo oge ụfọdụ ọ bụ ezie na o nwere mmasị n’ịmụ Bible, nwanyị ahụ jụrụ ọtụtụ ịkpọ òkù a kpọrọ ya ije nzukọ ndị Kraịst n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova. N’ihi gịnị? Ọ na-eme ihere nke ukwuu. Otú ọ dị, mgbe ọ natara ọkpụkpọ òkù ije Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst, o meriri ihere ya wee jee.

Ihe kasị masị ya banyere nzukọ ahụ bụ mmetụta ịhụnanya dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ. Ọ hụtụbeghị ụdị ezi ọbụbụenyi dị otú ahụ na chọọchị ya! Mgbe nzukọ ahụ gasịrị ọ malitere ije nzukọ nile nke Ndịàmà nọ n’ógbè ahụ na-eduzi, n’oge na-adịghịkwa anya ya na nwoke ahụ ya na ya nọbu na-ebi lụrụ di na nwunye. Ugbu a ọ bụ onye òtù ọgbakọ nke e mere baptism.

◻ Ọrụ ọma nke Onyeàmà ọzọ rụpụtara ihe ndị dị mma. O nwere ọkwá dị elu n’otu ụlọ ọrụ. Mgbe e weresịịrị otu nwoke nke si àgwàetiti Réunion n’ọrụ, ụfọdụ n’ime ndị ọrụ ya malitere ịkwa ya emo n’ihi ịdị mkpụmkpụ ya. Ọ ghọrọ ihe ọchị. N’ụzọ dị iche na nke ahụ, Onyeàmà ahụ na-emesokarị nwoke ahụ omume obi ọma ma na-akwanyere ya ùgwù. N’oge na-adịghị anya ọ nọ na-ajụ ihe mere o ji dị nnọọ iche.

Onyeàmà ahụ kọwara na àgwà nkwanye ùgwù ya bụ n’ihi ụkpụrụ Bible ndị ọ mụtaworo site n’aka Ndịàmà Jehova. O gosikwara ya ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu banyere nzube Chineke dị iche iche na olileanya nke ụwa ọhụrụ. Nwoke ahụ nakweere ọmụmụ Bible, malite ije nzukọ ndị Kraịst, ma lụọ nwanyị ya na ya nọrịị na-ebi.

Ka e mesịrị ọ laghachiri Réunion. N’oge gara aga, ya na ndị ikwu ya na-enwe nsogbu, karịsịa ya na ezinụlọ nwunye ya. Ma ugbu a àgwà ọma ya nke ndị Kraịst masịrị ha nnọọ. E mere nwoke ahụ baptism, ọ bụkwa ohu na-eje ozi ugbu a. Ọtụtụ ndị ezinụlọ ya, gụnyere nwunye ya na ụmụ ya nwanyị abụọ, na-ejekwa ozi n’ọgbakọ ndị Kraịst dị ka ndị nkwusa nke ozi ọma Alaeze Chineke.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya