Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
“Chineke Abụghị Onye Na-ele Mmadụ Anya n’Ihu”
NARỊ afọ iri na itoolu gara aga, Pita onyeozi e nyere ike mmụọ nsọ dere, sị: “Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’ihu: kama n’ime mba ọ bụla onye na-atụ egwu Ya, onye na-arụkwa ọrụ ezi omume, bụ onye Ọ na-anara nke ọma.” (Ọrụ 10:34, 35) A na-achọta n’etiti Ndịàmà Jehova ndị sitere n’agbụrụ na nzụlite okpukpe nile. Ha na-achọsi ezi omume ike, ha na-atụkwa egwu Chineke. Jehova na-anabata ha n’òtù ụwa ọhụrụ ahụ, dị ka, iji maa atụ, o mere otu nwanyị na Chad.
Afọ ejughị nwanyị a n’okpukpe ya. Ọtụtụ afọ tupu oge a ọ naara otu akwụkwọ Ibu Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gi—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya, nke Ndịàmà Jehova bipụtara, ọmarịcha ndụmọdụ dị n’akwụkwọ ahụ masịkwara ya. A malitere ọmụmụ Bible, ọ na-anọkwa ya mgbe nile maka ọmụmụ ihe ahụ. Otú ọ dị, mgbe a gbara ya ume ịbịa nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, o kweghị. N’ihi gịnị? Ọ bụ ezie na di ya emegideghị ya ịmụ ihe, ọ jụrụ inye ya ohere ịga nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.
Mgbe nwanyị ahụ chọrọ ịga mgbakọ sekit, Onyeàmà na-eduzi ọmụmụ ihe ahụ gosiri di ya usoro ihe omume ya, na-akọwapụta ọmarịcha ndụmọdụ a ga-enye. O kwere ka nwunye ya gaa “nanị otu oge.” Ọ gara, usoro ihe omume ahụ atọọkwa ya ụtọ. Mgbe ọ kọwaara di ya ihe ọ mụtaworo, o megideghị ya ịga nzukọ ndị ọzọ. Eziokwu bụ́ na ndị sitere n’agbụrụ dị iche iche bụ́ ndị na-eche banyere ibe ha n’ụzọ miri emi mejupụtara ọgbakọ ahụ metụrụ ya n’obi. E mesịa ọ gara mgbakọ distrikti, o buokwa ya isi ịhụ ka ụmụ ya nọdụrụ n’apata ụkwụ nke Ndịàmà si mba ndị ọzọ. Ndịàmà ndị ahụ so ụmụaka ahụ kerịta nri, mesookwa ha dị ka ndị òtù ezinụlọ. Nke a bụ ebe a nọ nwee oké mgbanwe ná ndụ ya.
Ma mmegide sochiri. Ọ bụ ezie na ọ bụ onye na-eme ihere, ọ malitere ịza ajụjụ ná nzukọ, na-ejikwa nkwuwa okwu na-azaghachi okwu ndị na-adịghị mma nke ndị ikwu na ndị agbata obi na-ekwu. Ọ bụ ezie na ya na di ya ebiwo ọtụtụ afọ, agbamakwụkwọ ha abụwo nanị nke nkwekọrịta omenala. Olee otú ọ ga-esi welite okwu nke ịgba akwụkwọ dị ka iwu si dị? Mgbe o jisịworo ezi obi kpegara Jehova ekpere, ọ gwara di ya okwu, onye sịrị na ya ga-eleba ya anya. O mesịrị mee otú ahụ, di na nwunye ahụ gbakwara akwụkwọ dị ka iwu si dị.
Nwanne di ya binyeere ha kpatara ọtụtụ nsogbu, ma di ya kwụnyeere nwunye ya. E mesịa nna di ya bịara ileta ha. O nyere nwa ya nwoke iwu ịgba nwunye ya alụkwaghịm, ebe ọ gbanweworo okpukpe ya. Nna ahụ gwara nwa ya na ya ga-akwụ ụgwọ isi nwanyị maka “nwunye ka nnọọ mma.” Nzaghachi nwa ya bụ: “Ee e, m gaghị eme nke ahụ. Ọ bụ ezi nwunye. Ọ bụrụ na ọ chọrọ ịla, nke ahụ dị iche, ma m gaghị agwa ya laa.” Nwunye ahụ mesoro nna di ya omume ọma, ihere mekwara nna di ya n’ihi omume ya. Otú ọ dị, mgbe ọ laghachiri obodo ya, o detaara nwa ya nwoke akwụkwọ, n’oge nke a, na-agwa ya ihe ọ na-aghaghị ime. Ọ sịrị na ọ bụrụ na nwa ya ajụ izilaga nwunye ya, na ọ bụkwaghị nwa ya. Ọzọkwa, nwa ya nwoke gbachiteere nwunye ya. Cheedị echiche aha ọṅụ nwunye ya ga-enwe n’ịhụ ka di ya weere nguzo ahụ doro anya.
Ugbu a ụmụntakịrị nwoke ha abụọ na-enwe mmasị isonyere nne ha aga Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ha gwadịrị nna ha ka o nye ha taị olu, ebe ha hụrụ na ụmụnna nwoke nile na-enye okwu na-eyi ya. Taa nwanyị a bụ nwanna nwanyị e mere baptism.
Ọ bụ otu n’ime 345 Ndịàmà nwere obi ụtọ na Chad bụ́ ndị na-akpọsa ozi ọma Alaeze Jehova, na-enwekwa ekele na, n’eziokwu, “Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’ihu.”