Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
“Onye Ihe Na-agara nke Ọma Ka Mmadụ nke Chọtaworo Amamihe Bụ”
ILU nke a aghọwo eziokwu na Korea, ebe e nwere ugbu a ihe karịrị 71,000 Ndịàmà Jehova na-enwe obi ụtọ. (Ilu 3:13) Cheedị echiche, 42 pasent n’ime ndị a na-eje ozi nọ n’ozi oge nile! Ahụmahụ ndị na-esonụ ga-egosi na obi ụtọ bụ òkè nke ndị na-achọ ezi amamihe na-eketa.
Otu nwanyị bi na Pusan ejewo otu n’ime chọọchị ndị dị na Krisendọm ruo afọ 16. O debewo ọtụtụ n’ime ihe omume ndị na-adịghị n’Akwụkwọ Nsọ nke na ọ malitere iche na ọ dịghị Chineke dịnụ. N’aka nke ọzọ, ọ pụghị ịgọnarị ịdị adị nke Chineke, ya mere o ji obi eziokwu kpegara Chineke ekpere ka ya nwee ike chọta ezi chọọchị ahụ ma ọ bụrụ na e nwere ihe dị otú ahụ. N’oge a o chere echiche na mberede banyere Ndịàmà Jehova, o chetakwara na chọọchị ya elelịwo ha ma dọọ ndị na-abịa chọọchị aka ná ntị megide ha n’ihi na Ndịàmà ekweghị n’Atọ n’Ime Otu, ọkụ mmụọ, na ozizi ndị ọzọ nke Krisendọm. Ọ̀ pụrụ ịbụ ha ma eleghị anya bụ ezi chọọchị ahụ? Site n’enyemaka nke otu onye agbata obi ya, ọ chọtara ebe Ụlọ Nzukọ Alaeze dị. N’ụbọchị na-esonụ, ọ bịara otu nzukọ.
O riri ya ọnụ ịhụ ịdị n’usoro nke nzukọ ahụ. E nweghị iti mkpu ịnụ ọkụ n’obi gabigara ókè ma ọ bụ ịbụ abụ oké mmetụta dị ka a na-eme na chọọchị ya. E mere ka ya na otu Onyeàmà mata bụ́ onye dị njikere ịmụrụ ya Bible, ọmụmụ ihe nke mbụ wekwara ọtụtụ hour n’ihi ọtụtụ ajụjụ ndị ọ jụrụ. N’ọmụmụ ihe nke abụọ, o kwupụtara na ya ga-etinye akwụkwọ maka ịpụ na chọọchị ya ma ghọọ Onyeàmà. Ọ gwara nwanna nwanyị ahụ na ya agaghị achọ ka ọ na-amụrụ ya ihe ọzọ, ebe ya pụrụ nnọọ ịdị na-abịa nzukọ nile. Otú ọ dị, e gosiri ya abamuru nke inwe ọmụmụ Bible onwe onye tinyekwara ịbịa nzukọ nile. Ọ nakweere aro ahụ, dịrị uchu n’ọmụmụ ihe ya, mgbe oge ruru e mekwara ya baptism.
Ugbu a ọ na-enwe obi ụtọ na ya achọtawo amamihe nke ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, nweekwa olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ Chineke.
Ọchịagha Lara Ezumike Nká Amụta Eziokwu
E mere nwunye nke otu onye ọchịagha baptism na 1962. Di ya megidere ya na mbụ, ma mgbe e mesịrị ọ kwụsịrị imegide ya, sitekwa n’oge ruo n’oge ruo 28 afọ, ụmụnna dị iche iche mụụrụ ya ihe, na-agbalị ime ka o nwee mmasị n’eziokwu. Ọ bịara nzukọ na mgbakọ ụfọdụ, o so ná ndị ahụ jụrụ iji eziokwu kpọrọ ihe. Na 1990 ya na nwunye ya gara Japan, bụ́ ebe ha gara otu mgbakọ distrikti. N’oge a ọ ṅara ntị nke ọma n’okwu e kwuru—ihe nke ọ na-emebeghị na mbụ. O riri ya ọnụ ịnụ okwu ndị dị ike na-ekpughe okpukpe ụgha, ma n’ezie ndị a meghere anya ya ịhụ ihu abụọ nke Krisendọm. A kpaliri mmasị ya site n’ịdị n’usoro na obi ụtọ nke ndị Chineke na Japan, nke bụkwa otu ihe ahụ dị ka ọ hụworo na Korea. N’ịlaghachi na Korea, ọ malitere ọmụmụ Bible nke o ji kpọrọ ihe wee mesịa bụrụ onye e mere baptism.
Ya mere mgbe baptism ya gasịrị, gịnị ka o kwesịrị ime? Ọ gbara arụkwaghịm n’ọkwá ya dị ka onye isi oche nke otu ụlọ oriri ndị njem a ma ama wee sonyere nwunye ya n’ozi ọsụ ụzọ oge nile. Ọ na-eche na ịbụ onye ọsụ ụzọ oge nile bụ ụzọ kasị mma isi kwụọ ụgwọ maka 28 afọ ndị funahụrụ ya mgbe ọ jụrụ ịnara eziokwu.
Ugbu a ọ na-aghọta na ilu ahụ bụ́ “onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ nke chọtaworo amamihe bụ” metụtakwara ya!