Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
Atụrụ Jisọs Na-anụ Olu Ya
KA ỌRỤ nkwusa ahụ na-amụba gaa n’akụkụ nile nke ụwa, Jehova site n’aka ndị mmụọ ozi ya na-eduzi ndị ohu ya gaa n’ebe ndị yiri atụrụ nọ. Ha na-anụ olu Jisọs ma na-amụta ijere ya ozi n’olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi. Jisọs kwuru na Jọn 10:27, 28, sị: “Atụrụ nke m na-anụ olu m, mụ onwe m makwaara ha, ha na-esokwa m: mụ onwe m na-enyekwa ha ndụ ebighị ebi.” Rịba ama ụzọ ndị obi ha ziri ezi na Madagascar si nụrụ olu Jisọs.
Otu onye n’ime Ndịàmà Jehova nyere onye dọkịta bịara ile otú nna ya na-arịa ọrịa dị akwụkwọ ndị ahụ bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala na Ibu Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gi—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya.
Dọkịta ahụ bụ onye Protestant, ọ na-emegidekwa Ndịàmà nke ukwuu, ma ọ gụrụ akwụkwọ ahụ, tụleekwa akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ahụ na Bible nke ya. Nwunye ya, bụ́ onye Katọlik nakwa dọkịta, gụrụ akwụkwọ Ibu Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gi ọtụtụ mgbe n’ihi na ọ sịrị na o yiri ka e dere ya kpọmkwem maka ya. Nkọwa dabeere na Bible nke Society nyere ịdị mkpa nke 1914 kpaliri mmasị ha abụọ. Di ya gakwuuru Onyeàmà ahụ nyere ya akwụkwọ ndị ahụ. Onyeàmà ahụ nyere ya akwụkwọ Life—How Did It Get Here? By Evolution or by Creation? ma mee ndokwa ileta ya na nwunye iji zaa ajụjụ ha. Mgbe o letara ha, ọ maliteere di na nwunye ahụ na ụmụ ha atọ ọmụmụ Bible chiri anya. Ọganihu ha nwere n’ịghọta ihe dị na Bible gara ngwa ngwa.
Mgbe ọmụmụ ihe nke mbụ gasịrị, ezinụlọ ahụ dum malitere ịbịa nzukọ nile a na-enwe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, n’oge na-adịghịkwa anya mgbe nke ahụ gasịrị, ha debanyere aha ha n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Omume nke ụmụ ha kawanyere mma nke ukwuu. Site n’ọmụmụ Bible ha, ha mụtara na ime ememe ncheta ọmụmụ na ememe okpukpe ndị ọzọ ekwesịghịrị ndị Kraịst; ya mere, ha kwụsịrị ime ha. Onye nke bụ di jụrụ inye ọbara maka onye ikwu ya, ọ bụ ezie na a tụlebeghị isiokwu ahụ n’ọmụmụ Bible ha. N’oge na-adịghị anya, uwe karate ya adịkwaghị n’ebe ọ na-ekowe uwe; ọ chịgara ya na nke onye na-akwara ha ákwà iji kwatara ụmụ ya uwe. O suru magazin na akwụkwọ ya nile na-akọ banyere ịgụ kpakpando ọkụ. Nanị ọnwa atọ mgbe ha malitesịrị ọmụmụ ihe, ma di na nwunye ya siri na chọọchị ha dị iche iche pụta, na-ekwupụtakwa ọchịchọ ha ikere òkè n’ọrụ nkwusa ahụ. Ugbu a, e mewo ha baptism.
◻ Otu nwanyị nọ na Thailand na-achọ eziokwu ahụ. Ọ bụ ezie na ọ bụ onye okpukpe Buddha, ọ dịghị mgbe ọ bụla ọ raara onwe ya nye okpukpe ya n’ihi na ọ hụwo ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu nke ihu abụọ na anyaukwu. E wezụga nke ahụ, e nwere ọtụtụ ọdịnala ndị ọ chọpụtara na ha na-akpasu iwe. Ihe ahụ nile gwụrụ ya ike.
Mgbe ahụ, otu onye agbata obi tụrụ aro ka ọ nwalee ndị Kristian wee kpọrọ ya gaa n’otu chọọchị Pentecostal. Otú ọ dị, n’oge ofufe ha, nwanyị ahụ nwere ọchịchọ siri ike isi n’ebe ahụ pụọ ma laa n’ihi mkpọtụ ha na-eme, ka ndị nile nọ n’ebe ahụ na-ekpe ekpere n’olu dara ụda. Nke ahụ bụ nke ikpeazụ ọ gara na chọọchị ahụ.
Mgbe e mesịrị, ọ nwalere chọọchị Roman Katọlik. Otú ọ dị, mgbe ọ gara ugboro ole na ole, ọ chọpụtakwara ihu abụọ na anyaukwu, tinyekwara ndụ okomoko nke ndị ụkọchukwu. Nke ahụ rụrụ arụ n’anya ya, o wee kwụsị ịga n’ebe ahụ. Onye ụkọchukwu ahụ chọrọ ịma ihe mere o ji pụọ. Mgbe ha matara ihe kpatara ya, o kwuru n’ụzọ ịkwa emo, sị: “Ọ bụrụ na ị chọrọ isonyere ndị na-adịghị ekwe ka mmadụ mee ihe sọrọ ya n’ezie, gakwuru Ndịàmà Jehova.” Ọ jụrụ, sị: “Olee ebe ha nọ?” Onye ụkọchukwu ahụ zaghachiri, sị: “Ha nọ n’ebe dị nso n’ụlọ ọrụ na-enye mmiri.” N’echi ya, ọ chọgharịrị ha ma ọ chọtaghị ha. N’inwe nkụda aka, ọ nọgidere na-eche echiche banyere Ndịàmà Jehova n’agbanyeghị nke ahụ.
Otu ụbọchị ọ nụpetere ka otu n’ime ndị agbata obi ya ji ịkwa emo na-agwa onye ọzọ, sị: “N’oge na-adịghị anya ị ga-aghọ otu n’ime Ndịàmà Jehova!” Mgbe ọ nụrụ nke ahụ, nwanyị ahụ gbagara na nke onye agbata obi ahụ wee jụọ, sị: “È nwere Ndịàmà Jehova n’ebe a?” “Ee,” bụ azịza o nwetara. “Ụfọdụ ga-abịa n’ógbè a ime nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Ị ga-amata ha site n’ejiji ha nke dị ọcha ma dị mma.” Mgbe ọ nụrụ nke ahụ ọ gbapụrụ ije chọgharịa ha. Na mbụ ọ chọtaghị ha, ma mgbe o ji ụkwụ laghachi n’ụlọ ya, ọ hụrụ ndị inyom abụọ yi uwe dị ọcha ka ha so otu onye na-ekwurịta okwu. Ọ gakwuuru ha ma jụọ ha ma hà bụ Ndịàmà Jehova. Mgbe ha sịrị na ha bụ, ọ rịọrọ, sị: “Biko, bịanụ n’ụlọ m. Achọrọ m ịgwa unu okwu.”
A malitere ọmụmụ Bible, n’agbanyeghịkwa mmegide na ịkwa emo sitere n’aka ndị òtù ezinụlọ ya, nwanyị a amalitewo ịbịa nzukọ nile na ịgbara ndị ikwu ya àmà.
N’ezie, Jisọs maara atụrụ ya, ọ na-achịkọtakwa ha n’ime nzukọ ya maka nlanarị baa n’ime ụwa ọhụrụ nke ezi omume.