Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
Ozi Ọma Site na Norway
IHE ahụ karịrị 9,500 ndị nkwusa alaeze nọ na Norway na-enweta ọtụtụ ahụmahụ dị mma. Ndị nwere obi eziokwu na-amata ozi Bible nke Ndịàmà Jehova na-akpọsa dị ka nke bụ eziokwu, nke bụkwa azịza nye ekpere ha, dị ka ọ pụtara ìhè n’ahụmahụ ndị na-eso.
◻ Otu ndị ka lụrụ di na nwunye ọhụrụ kpeere Chineke ekpere ka o nyere ha aka ịchọta ihe bụ nzube nke ndụ. Mgbe otu izu ga-sịrị, Ndịàmà Jehova bịara na nke ha, nke nwunye kpọbatakwara ha. A dọwo di ya aka ná ntị megide Ndịàmà, ya mere ọ pụrụ n’èzí ije saa moto ya. A mụrụ nwunye ya na Lebanon, o nwekwara ihe isi ike metụtara asụsụ, ya mere Ndịàmà ahụ gosiri ya aha Jehova n’ime Bible ya nke dị n’asụsụ Arabic. Mgbe izu abụọ gasịrị, Ndịàmà ahụ bịaghachiri, ọzọkwa, di nwanyị ahụ pụkwara n’èzí ije saa moto ya. Ndịàmà ahụ jụrụ nwunye ya ma ò chere na ọ ga-ekwe omume di ya ịnọ ya mgbe ha ga-abịa ọzọ ka o nwee ike ịsụgharịrị ya okwu, o wee kwe nkwa na ya ga-ajụ di ya.
N’ọbịbịa nke ugbo atọ, moto ahụ dị nnọọ ọcha nke na nwoke ahụ apụkwaghị iji ya mere ihe ngọpụ iji pụọ, ya mere ọ nọnyeere ha wee jụọ ọtụtụ ajụjụ iji chọpụta ọdịiche dị n’etiti Ndịàmà na chọọchị nke Obodo ya. Ha nọrọ hour atọ n’ọbịbịa ahụ, e tinyekwara otu akwụkwọ nta n’aka di na nwunye ahụ. Mgbe Ndịàmà ahụ lara, nwanyị ahụ labara ụra, ma di ya malitere ịgụ akwụkwọ nta ahụ, na-agụkwa akụkụ akwụkwọ nsọ nile a kpọtụrụ uche. N’etiti abalị, ọ kpọtere nwunye ya wee sị: “Ị ghaghị ịgụ nke a.” Nwanyị ahụ bilitere, ha gụkọkwara ya ọnụ ruo elekere ise nke isi ụtụtụ. N’ịghọta na ha achọtawo eziokwu ahụ, ha kwara ákwá n’ihi ọṅụ, jirikwa aha Jehova kpekuo ya ekpere. A maliteere ha ọmụmụ Bible a na-enwe mgbe nile, ha malitekwara ịbịa nzukọ dị iche iche. Nwoke ahụ kwụsịrị ọrụ ọ na-arụrụ ndị agha, ha hapụkwara chọọchị ha wee kwụsị ise sịga. Ha emewo baptism ugbu a, ha jikwa obi ụtọ soro ụmụnna ha ndị nwoke na ndị nwanyị nọ n’ụwa dum na-ejere Jehova ozi.
◻ Ụmụnna nwanyị abụọ ndị nọ n’ozi ụlọ n’ụlọ ha na-eje na Norway zutere otu nwanyị nke gosiri mmasị. Ọ kpọrọ ha òkù ka ha bịaghachi wee jụọ ma yà nwere ike ịkpọ ụmụ nwanyị ndị ọzọ ka ha bịa. N’ọbịbịa ọzọ ha bịara, ụmụ nwanyị anọ ndị ọzọ nọ n’ebe ahụ. Otu n’ime ha na-ekpesi nnọọ chọọchị ike. O kwuru na kemgbe ya bụ nwata, na ọ gụsiwo ya agụụ ike irube isi n’iwu ahụ Jisọs nyere nke bụ ime ndị na-eso ụzọ. Nke a edujewo ya Africa mgbe o sooro di ya gaa otu njem inyere ndị mba ọzọ aka. Ụmụ nwanyị nile ahụ nwere ọtụtụ ajụjụ, e mekwara ndokwa ka ụmụnna nwanyị ahụ na-eleta ha n’izu abụọ ọ bụla. A kpọrọ ndị agbata obi ndị ọhụrụ òkù ka ha bịa, ụfọdụ nọgidekwara na-abịa ebe ndị ọzọ kwụsịrị ịbịa, ma onye ahụ nke na-ekpesi chọọchị ike ghọtara na ya na-amụta eziokwu ahụ. Otu ụbọchị, mgbe onye ụkọchukwu chọọchị ya kwuru na ya ga-akwado agha, na ya kwerekwara n’ozizi Atọ n’lme Otu, nwanyị ahụ hapụrụ chọọchị ahụ. Ọ malitere ịbịa nzukọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova, malitekwa ikere òkè n’ọrụ nkwusa ahụ n’oge na-adịghị anya. N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, o mere baptism. Ugbu a, n’ikpeazụ, mgbe 30 afọ gasịworo, ọ pụrụ inwe obi ụtọ n’ezie n’irube isi n’ihe ahụ Jisọs nyere n’iwu nke bụ ime ndị na-eso ụzọ.—Matiu 28:19, 20.
Jehova na-agọzi ụmụnna nọ na Norway n’ije ozi dị nsọ ha, ọ na-agọzikwa ndị na-ege ozi ọma ahụ ntị!