Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwex isiokwu 2
  • Gwa Ha na Ị Hụrụ Ha n’Anya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gwa Ha na Ị Hụrụ Ha n’Anya
  • Ihe Ndịàmà Jehova Kọrọ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Chineke Abụghị Onye Na-ele Mmadụ Anya n’Ihu”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
Ihe Ndịàmà Jehova Kọrọ
ijwex isiokwu 2
Ebe Zlatka nọ na-ekpe ekpere di ya abata

Gwa Ha na Ị Hụrụ Ha n’Anya

Ong-li bụ Onyeàmà Jehova bi na Bọlgeria. Ọ na-amụrụ otu nwa agbọghọ aha ya bụ́ Zlatka ihe. Di Zlatka esoghị ya amụ ihe. Ong-li kwuru, sị: “Mgbe anyị na-ekwurịta ihe gbasara ezinụlọ, m na-ekwusi ya ike na ọ dị mkpa ịgwa di anyị na ụmụ anyị na anyị hụrụ ha n’anya. O wutere Zlatka mgbe m kwuru ihe a. O kwuru na ya agwatụbeghị di ya na nwa ya nwaanyị dị afọ itoolu na ya hụrụ ha n’anya.”

Zlatka kwuru, sị: “Adị m njikere imere ha ihe ọ bụla, mana agaghị m agwali ha na m hụrụ ha n’anya.” O kwukwara, sị: “O nweghị mgbe mama m gwatụrụ m na ya hụrụ m n’anya, o nweghịkwa mgbe mama nke ya gwara ya na ọ hụrụ ya n’anya.” Ong-li gosiri Zlatka na e nwere mgbe Jehova ji olu dara ụda kwuo na ya hụrụ Jizọs n’anya. (Matiu 3:​17) Ọ gwara Zlatka ka ọ rịọ Jehova n’ekpere gbasara ya ma kpebisie ike ịna-agwa di ya na nwa ya nwaanyị na ya hụrụ ha n’anya.

Ong-li kwuru, sị: “Mgbe ụbọchị abụọ gachara, Zlatka ji obi ụtọ gwa m na ya rịọrọ Jehova n’ekpere ka o nyere ya aka. Mgbe di ya lọtara, ọ gwara ya na ya amụtala na Baịbụl mkpa ọ dị ka nwunye na-akwanyere di ya ùgwù ma hụkwa ya n’anya. Ọ gwaziri ya na ya hụrụ ya n’anya nke ukwuu. Mgbe nwa ya nwaanyị lọtara, Zlatka makụrụ ya ma gwa ya na ya hụrụ ya n’anya. Zlatka gwara m na ahụ́ eruola ya ala ugbu a. Kemgbe ọtụtụ afọ, m bu ihe ndị a naanị n’obi ma ghara ịna-ekwupụta ya ekwupụta. Mana, Jehova enyerela m aka mụ enwee ike ịgwa ndị ezinụlọ m na m hụrụ ha n’anya.’

Ebe Ong-li na-agwa otu nwaanyị na ya ga-abịa na-amụrụ ya Baịbụl ma ọ chọọ

Ong-li ka na-aga amụrụ ndị agbata obi ya Baịbụl

Ong-li kwuru, sị: “Mgbe otu izu gachara, m hụrụ di Zlatka, ya asị m: ‘Ọtụtụ ndị agwala m ka m ghara ikwe ka gị na Zlatka na-amụ Baịbụl. Ma, o doro anya na Baịbụl ọ na-amụ na-abara ezinụlọ anyị uru. Anyị adịkwuola ná mma ugbu a, na-enwekwukwa obi ụtọ.’”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya