Mee Ememe Ncheta ahụ n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị
ỌBỤ n’uhuruchi nke Nisan 14, 33 O.A., ka Jisọs guzobere Ememe Ncheta ahụ.a Ọ ka sosịrị ndị ozi 12 mee Ememe Ngabiga, ya mere anyị pụrụ ijide ụbọchị ahụ n’aka. Mgbe ọ chụpụsịrị onye nraranye ahụ, bụ́ Judas, Jisọs “wee nara ogbe achịcha, gọzie ya, nyawaa ya, nye ha, sị, Naranụ: nke a bụ ahụ m. O wee nara iko, keleekwa, wee nye ha: ha nile wee ṅụọ n’ime ya. O wee sị ha, Nke a bụ ọbara m nke ọgbụgba ndụ, nke a na-awụsị n’ihi ọtụtụ mmadụ.”—Mak 14:22-24.
Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ime ememe ncheta ọnwụ ya n’ihi ịdị mkpa ya. (Luk 22:19; 1 Ndị Kọrint 11:23-26) Nke ya bụ nanị àjà nke pụrụ ịgbapụta ihe a kpọrọ mmadụ site n’ọbụbụọnụ nke mmehie na ọnwụ. (Ndị Rom 5:12; 6:23) Achịcha na mmanya ahụ nke o ji mee ihe bụ ihe nnọchianya nke ahụ ya zuru okè na ọbara ya. N’ịmara ụbọchị a malitere ya, anyị pụrụ ime ememe ahụ n’ụbọchị kwekọrọ na nke ahụ n’afọ ọ bụla, dị ka e mere banyere Ememe Ngabiga nke ndị Juu. Ma anyị aghaghị ime otú ahụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị. N’ihi gịnị?
Pọl onyeozi kwuru na ndị na-ekere òkè n’ihe nnọchianya nke achịcha na mmanya ahụ ga ‘na-ekwusa ọnwụ Onyenwe anyị ruo mgbe Ọ ga-abịa.’ (1 Ndị Kọrint 11:26) Ememe ahụ ga-elekwasịzi anya n’ọnwụ Jisọs na ihe ọ pụtaara ihe a kpọrọ mmadụ. Ihe omume ahụ agaghị abụ ihe e ji egwuri egwu, ọ ga-abụ oge ịtụgharị uche n’ịdị mma nke Chineke na ekele anyị kwesịrị inwe maka Jehova na Ọkpara ya. (Ndị Rom 5:8; Taịtọs 2:14; 1 Jọn 4:9, 10) Ya mere, Pọl dọrọ aka ná ntị, sị: “Ya mere onye ọ bụla nke ga-eri achịcha ahụ ma ọ bụ ṅụọ iko ahụ nke Onyenwe anyị mgbe ọ na-ekwesịghị, ikpe ahụ na ọbara nke Onyenwe anyị ga-ama ya.”—1 Ndị Kọrint 11:27.
N’ụzọ Kwesịrị Ekwesị —N’ụzọ Dị Aṅaa?
O doro anya na Chineke agaghị enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị emerụọ ihe omume ahụ site n’itinye aka n’omume ndị a na-enyo enyo ma ọ bụ site n’ịnakwere omenala ndị ọgọ mmụọ. (Jemes 1:27; 4:3, 4) Nke a ga-agụpụ ihe omume ndị a ma ama nke oge Ista. N’ịgbaso ntụziaka Jisọs ịdị ‘na-eme nke a iji na-echeta ya,’ anyị ga-achọ ime Ememe Ncheta ahụ dị nnọọ ka o guzobere ya. (Luk 22:19; 1 Ndị Kọrint 11:24, 25) Nke a ga-agụpụ ihe ịchọ mma ndị chọọchị nile nke Krisendọm tụkwasịworo n’ememe ahụ. Akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia na-ekweta na “Mas nke taa dị nnọọ iche site n’ememe dị nnọọ mfe nke Kraịst na Ndị Ozi Ya gbasoro.” Sitekwa n’ime Mas ahụ mgbe mgbe, ọbụna kwa ụbọchị, Krisendọm ehiewo ụzọ site n’ihe Jisọs zubere wee mee ya ka ọ bụrụ ihe omume nkịtị.
Pọl deere ndị Kraịst bụ́ ndị Kọrint akwụkwọ banyere iri na ịṅụ n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị n’ihi na nsogbu ebilitewo n’ọgbakọ banyere Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. Ụfọdụ akwanyeghịrị ịdị nsọ ya ùgwù. Ha bu nri abalị ha bịa wee rie ya tupu ma ọ bụ mgbe a na-enwe nzukọ ahụ. Mgbe mgbe ha na-eribiga nri ókè ma na-anụbiga mmanya ókè. Nke a na-eme ka ha na-ero ụra, bụrụ ndị na-amụghị anya n’echiche ha. Site n’ịbụ ndị na-amụghị anya n’echiche na n’ime mmụọ, ha apụghị ‘ịtụle ahụ ahụ,’ wee si otú a ghọọ ndị ‘ikpe ahụ na ọbara nke Onyenwe anyị mara.’ Ka ọ dị mgbe ahụ, agụụ na-agụ ndị na-enweghị nri abalị, ha ghọkwara ndị a dọpụrụ uche ha. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ọ dịghị otu onye n’ime ha nọ n’ọnọdụ ikere òkè n’ihe nnọchianya ndị ahụ n’obi ekele na nghọta zuru ezu nke otú ihe omume ahụ siruru n’ike—na ememe ahụ bụ iji cheta ọnwụ Onyenwe anyị. Nke a wetara ikpe ọmụma megide ha, n’ihi na ha na-egosi enweghị nkwanye ùgwù, ọbụna enweghị nsọpụrụ, maka ya.—1 Ndị Kọrint 11:27-34.
A Chọrọ Nghọta
Ụfọdụ ekerewo òkè n’ihe nnọchianya nke Ememe Ncheta ahụ ọ bụ ezie na mgbe e mesịrị, ha ghọtara na ha agaaraghị eme otú ahụ. Ndị ahụ keere òkè n’ihe nnọchianya Ememe Ncheta ahụ n’izi ezi bụ ndị Chineke họwooro, ha nwekwara akaebe nke mmụọ Chineke banyere nke ahụ. (Ndị Rom 8:15-17; 2 Ndị Kọrint 1:21, 22) Ọ bụghị mkpebi onwe ha ma ọ bụ mkpebisi ike ha mere ha ndị kwesịrị ekwesị. Chineke akpaworo ọnụ ọgụgụ nke ndị ga-eso Kraịst chịa n’eluigwe ókè ịbụ 144,000, ọnụ ọgụgụ dị nnọọ nta ma e jiri ya tụnyere ndị nile ga-erite uru site n’ihe mgbapụta Kraịst. (Mkpughe 14:1, 3) Ime nhọrọ ahụ malitere n’oge Jisọs, ọ bụ ya mere na taa e nwere nanị mmadụ ole na ole ndị na-eri ma na-aṅụ. Ka ụfọdụ ha na-anwụkwa, ọnụ ọgụgụ ahụ kwesịrị ịdalata.
N’ihi gịnị ka mmadụ pụrụ iji kere òkè n’ihe nnọchianya ndị ahụ n’ụzọ na-ezighị ezi? Ọ pụrụ ịbụ n’ihi echiche okpukpe ndị o nweburu—na ndị nile kwesịrị ntụkwasị obi ga-aga eluigwe. Ma ọ bụ ọ pụrụ ịbụ n’ihi oké ọchịchọ ma ọ bụ ịchọ ọdịmma onwe onye nanị—mmetụta nke na mmadụ kwesịrị ekwesị inweta ya karịa ndị ọzọ—na ọchịchọ maka ịbụ onye a ma ama. Ikekwe ọ bụ n’ihi mmetụta uche ndị siri ike na-esite ná nsogbu ndị dị ike ma ọ bụ ọdachi nke na-eme ka mmadụ ghara inwekwa mmasị ná ndụ n’elu ala. Ọ pụkwara ịbụ n’ihi ọbụbụenyi chiri anya nke mmadụ na onye nwere ọkpụkpọ eluigwe. Ọ dị anyị nile mkpa icheta na mkpebi ahụ bụ nanị nke Chineke, ọ bụghị nke anyị. (Ndị Rom 9:16) Ya mere ọ bụrụ na mmadụ, mgbe ọ ‘nwapụtasịrị’ onwe ya, achọpụta na n’ezie o kwesịghị ịdị na-ekere òkè n’ihe nnọchianya ndị ahụ, o kwesịrị ịkwụsị ya ugbu a.—1 Ndị Kọrint 11:28.
Olileanya nke Chineke cheworo n’ihu ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ihe a kpọrọ mmadụ bụ nke ndụ agwụghị agwụ na paradaịs elu ala. Nke ahụ bụ ngọzi dị ukwuu a ga-atụ anya ya, bụrụkwa nke ga-amasị anyị n’ụzọ dị mfe. (Jenesis 1:28; Abụ Ọma 37:9, 11) Ọ bụ n’elu ala ka a ga-ejikọ ndị kwesịrị ntụkwasị obi ha na ndị ha hụrụ n’anya a kpọlitere n’ọnwụ, ha ga-ezutekwa ndị ezi omume nke oge ochie, dị ka Abraham, Sera, Mosis, Rehab, Devid, na Jọn Onye Na-eme Baptism—bụ́ ndị nwụrụ tupu Jisọs emeghee ụzọ ndụ eluigwe.—Matiu 11:11; tụlee 1 Ndị Kọrint 15:20-23.
Ndị nwere olileanya elu ala na-eme ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị n’ụzọ kwesịrị ekwesị site n’ọbịbịa ha na-abịa na iji nkwanye ùgwù na-ege ntị, ọ bụ ezie na ha adịghị ekere òkè n’achịcha na mmanya ahụ. Ha onwe ha kwa na-erite uru site n’àjà Kraịst, nke na-eme ka ha nwee ike inweta nguzo ọma n’ihu Chineke. (Mkpughe 7:14, 15) Ka ha na-ege ntị n’okwu a na-ekwu, a na-ewusi ekele ha maka ihe ndị dị nsọ ike, ọchịchọ ha ịnọgide soro ndị Chineke ebe nile na-adị n’otu na-etokwa.
N’afọ a, mgbe anwụ dasịrị na Tuesday, April 2, a ga-eme Ememe Ncheta ahụ n’ihe karịrị 78,000 ọgbakọ nke Ndịàmà Jehova n’ụwa nile. Ị̀ ga-anọ n’ebe ahụ?
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Ụbọchị ndị Juu malitere n’uhuruchi. Dị ka kalenda anyị na-egosi, Nisan 14 ahụ sitere ná mmalite nke uhuruchi Thursday, March 31, ruo mgbe anwụ dasịrị n’uhuruchi Friday, April 1. E guzobere Ememe Ncheta ahụ n’uhuruchi Thursday, ọnwụ Jisọs werekwaara ọnọdụ n’ehihie Friday nke otu ụbọchị ndị Juu ahụkwa. E mere ka o bilite n’ọnwụ n’ụbọchị nke atọ, isi ụtụtụ Sunday.
[Foto dị na peeji nke 8]
Ndịàmà Jehova na-eme Ememe Ncheta otu ugbo kwa afọ