Iji Ọrụ n’Aka, Ọ̀ Bụ n’Ọrụ Ndị Nwụrụ Anwụ Ka Ọ̀ Bụ n’Ozi Jehova?
“IWE ewela gị, ma eji m ọrụ n’aka.” Nke a bụ otu n’ime okwu mgbochi nke Ndịàmà Jehova na-ezute ka ha na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ n’ihu ọha. (Matiu 24:14) Ọ bụkwa ezie na ikwu, sị, “Eji m ọrụ n’aka” mgbe ụfọdụ abụghị ihe ọzọ karịa ihe ngọpụ e chetara ozugbo, ihe bụ eziokwu bụ na ọtụtụ ndị mmadụ ji ọrụ n’aka. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na “nchegbu nke oge a” erikpuwo ha—nrụgide nke inweta ihe e ji ebi ndụ, ịkwụ ụgwọ, ịga na ịlaghachi n’ọrụ, ịzụlite ụmụaka, ilekọta ebe obibi, ụgbọ ala, na ihe onwunwe ndị ọzọ.—Matiu 13:22.
Otú ọ dị, ọ bụ ezie na ndị mmadụ pụrụ n’ezie iji ọrụ n’aka, ole na ole na-arụ ọrụ ndị na-amịpụta mkpụrụ ma ọ bụ baa uru n’ezie. Ọ dị nnọọ ka ihe nwoke ahụ maara ihe bụ́ Solomọn dere n’otu mgbe: “Gịnị ka mmadụ nwere ná ndọgbu nile ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ, na n’ime nchegbu nke obi ya, nke ya onwe ya na-adọgbu onwe ya n’ọrụ n’ime ya n’okpuru anyanwụ? N’ihi na ụbọchị ya nile bụ nanị ihe mgbu, mkpasu iwe ka mweda n’ala ya bụkwa; ọbụna n’abalị obi ya edinaghị ịrahụ ụra. Nke a bụkwa ihe efu.”—Eklisiastis 2:22, 23.
Bible na-akpọkwa ọrụ efu dị otú ahụ ‘ọrụ nwụrụ anwụ.’ (Ndị Hibru 9:14) Ọrụ ndị dị otú ahụ hà na-achịkwa ndụ gị? Nke a kwesịrị ịbụ oké ihe nchegbu nye gị dị ka onye Kraịst, ebe ọ bụ na Chineke ‘ga-akwụghachi mmadụ ọ bụla dị ka ọrụ ya si dị.’ (Abụ Ọma 62:12) Ebe ọ bụkwa na “e mewo ka oge a dị mkpụmkpụ,” anyị kwesịrị ilezi anya karịsịa ka anyị ghara ịtụfu oge n’ọrụ ndị nwụrụ anwụ. (1 Ndị Kọrint 7:29) Ma gịnị bụ nnọọ ọrụ ndị nwụrụ anwụ? Olee ụzọ anyị kwesịrị isi lee ha anya? Oleekwa ụzọ anyị pụrụ isi jide n’aka na anyị ji ọrụ ndị bara ezi uru n’aka?
Ịmata Ọrụ Ndị Nwụrụ Anwụ
Ná Ndị Hibru 6:1, 2, Pọl dere, sị: “N’ihi nke a ka anyị hapụ okwu nke mmalite nke Kraịst, ka a na-eburukwa anyị ruo n’itozu okè; ka anyị ghara ịtọ ntọala ọzọ nke bụ nchegharị e ji pụọ n’ọrụ nile nwụrụ anwụ, na okwukwe e kwere na Chineke, ozizi nke ime baptism, na nke ibikwasị aka n’isi, na nke mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, na nke ikpe ebighị ebi.” Rịba ama na “okwu mmalite” gụnyere “nchegharị e ji pụọ n’ọrụ nile nwụrụ anwụ.” Dị ka ndị Kraịst, ndị na-agụ ihe Pọl dere echegharịworị site n’ọrụ ndị dị otú ahụ nwụrụ anwụ. N’ụzọ dị aṅaa?
Tupu ha anabata Kraịst, ụfọdụ na narị afọ mbụ ekerewo òkè ‘n’ọrụ ndị nwụrụ anwụ nke anụ ahụ,’ ya bụ, “ịkwa iko, adịghị ọcha, agụụ ịkwa iko, ikpere arụsị, ịgwọ nsí [“ime mgbaasị,” NW],” na omume ọjọọ ndị ọzọ. (Ndị Galetia 5:19-21) Ọ bụrụ na e lezighị anya, ọrụ ndị dị otú ahụ gaara eduga n’ọnwụ ime mmụọ ha. Otú ọ dị, site n’obi ebere, ndị Kraịst ahụ echigharịwo site n’ụzọ mbibi ha, chegharịa, bụrụkwa ndị ‘a sachara.’ Ha si otú a nwee ọnọdụ dị ọcha n’ebe Jehova nọ.—1 Ndị Kọrint 6:9-11.
Otú ọ dị, ọ bụghị ndị Kraịst nile ka ọ dị mkpa ichegharị site n’ọrụ jọrọ njọ ma ọ bụ ndị rụrụ arụ. N’ụzọ bụ isi, ọ bụ ndị Juu kwere ekwe ka e zijeere akwụkwọ ozi Pọl, ndị ihe ịrụ ụka ọ bụla na-adịghị ya na ọtụtụ n’ime ha rapagidesiri ike n’Iwu Mosis tupu ha anabata Kraịst. Mgbe ahụ, ọ̀ bụ site n’ọrụ ndị nwụrụ anwụ dị aṅaa ka ha chegharịworo site na ha? N’ezie, ọ dịghị ihe ọjọọ ọ bụla dị na ha ịgbaso iwu ememe na ihe oriri nke Iwu ahụ chọrọ ha n’aka. Ọ̀ bụ na Iwu ahụ abụghị nke ‘dị nsọ, ziekwa ezi’? (Ndị Rom 7:12) Ee, ma ná Ndị Rom 10:2, 3, Pọl kwuru banyere ndị Juu, sị: “Ana m agbara ha àmà na ha na-anụ ọkụ n’obi n’ebe Chineke nọ, ma ọ bụghị dị ka mmazu si dị. N’ihi na, ebe ha na-amaghị ezi omume Chineke, na-achọkwa ụzọ ime ka ezi omume nke aka ha guzo, ha edoghị onwe ha n’okpuru ezi omume Chineke.”
Ee, ndị Juu kwetara n’ụzọ na-ezighị ezi na site n’iji nlezianya na-agbaso Iwu ahụ, ha pụrụ inweta nzọpụta ha. Otú ọ dị, Pọl kọwara na “a gụghị mmadụ n’onye ezi omume site n’ọrụ dị iche iche nke iwu, ma ọ bụ nanị okwukwe e kwere na Jisọs Kraịst ka e ji gụọ mmadụ n’onye ezi omume.” (Ndị Galetia 2:16) Mgbe e nyesịrị ihe mgbapụta nke Kraịst, ọrụ nile nke iwu—n’agbanyeghị otú o si dị nsọ ma ọ bụ zie ezi—bụ ọrụ ndị nwụrụ anwụ, ha abaghịkwa uru ọ bụla n’inweta nzọpụta. Ndị Juu obi ha ziri ezi si otú a chọọ amara Chineke site n’ichegharị n’ọrụ ndị dị otú ahụ nwụrụ anwụ na ịbụ ndị e mere baptism ná ngosipụta nke nraranye ha.—Ọrụ 2:38.
Gịnị ka anyị na-amụta na nke a? Na ọrụ ndị nwụrụ anwụ pụrụ ịgụnye ihe karịrị ajọ omume ma ọ bụ omume rụrụ arụ; ha metụtara ọrụ ọ bụla nke nwụrụ anwụ, nke bụ ihe efu, ma ọ bụ nke na-adịghị amipụta mkpụrụ n’ụzọ ime mmụọ. Ma ọ̀ bụ na ndị Kraịst adịghị echegharị n’ọrụ ndị dị otú ahụ nwụrụ anwụ tupu e mee ha baptism? Nke ahụ bụ eziokwu, ma ụfọdụ ndị Kraịst na narị afọ mbụ mesịrị daghachi n’omume rụrụ arụ. (1 Ndị Kọrint 5:1) N’etiti ndị Juu ahụ bụ́ ndị Kraịst, ọ dị mfe ịtụgharị na-arụ ọrụ ndị nwụrụ anwụ nke Iwu Mosis. Pọl chetaara ndị dị otú ahụ ka ha ghara ịlaghachi n’ọrụ ndị nwụrụ anwụ.—Ndị Galetia 4:21; 5:1.
Iche Nche Megide Ọrụ Ndị Nwụrụ Anwụ
Ya mere, ndị Jehova taa aghaghị ilezi anya ka ha ghara ịdaghachi n’ọnyà nke ọrụ ndị nwụrụ anwụ. A na-emekpa anyị ahụ n’akụkụ nile site ná nrụgide dị iche iche ịjụ omume ọma, ịbụ onye na-adịghị eme ihe n’eziokwu, na itinye aka n’omume mmekọahụ na-ezighị ezi. Ọ bụ ihe mwute ikwu na ọtụtụ puku ndị Kraịst kwa afọ na-adaba ná nrụgide ndị dị otú ahụ, ọ bụrụkwa na ha echegharịghị, a na-achụpụ ha n’ọgbakọ ndị Kraịst. Mgbe ahụ, karịa mgbe ọ bụla ọzọ, onye Kraịst aghaghị ịṅa ntị ná ndụmọdụ Pọl nyere ná Ndị Efesọs 4:22-24: “Ka unu tụpụ mmadụ ochie unu, nke na-emebi emebi n’ụzọ agụụ nke aghụghọ, dị ka ibi obi unu na mbụ si dị; ka . . . unu dị ọhụrụ na mmụọ nke uche unu, ka unu yikwasịkwa mmadụ ọhụrụ unu, nke e kere dị ka Chineke chọrọ n’ime ezi omume na ịdị ọcha nke eziokwu.”
N’ezie, ndị Efesọs ahụ Pọl degaara akwụkwọ ozi eyikwasịworị mmadụ ọhụrụ ahụ ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu. Ma Pọl nyeere ha aka ịghọta na ime otú ahụ bụ ihe na-aga n’ihu n’ihu! N’ịkwụsị ime mgbalị, a pụrụ iduru ndị Kraịst gaa n’ọrụ ndị nwụrụ anwụ site n’ọchịchọ aghụghọ ndị na-adịgide dị ka mmetụta rụrụ arụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa anyị onwe anyị taa. Anyị aghaghị ịnọgide na-eme mgbalị iyikwasị mmadụ ọhụrụ, n’ekweghị ka o nwee ntụpọ site n’àgwà ndị anyị mụtara n’ụzọ ndụ oge ochie anyị. Anyị aghaghị ịhapụ—ịkpọ asị—ụdị ọ bụla nke ọrụ ajọ omume nile nke anụ ahụ. “Unu ndị na-ahụ Jehova n’anya, kpọọnụ ihe ọjọọ asị,” ka onye ọbụ abụ ahụ gbara ume.—Abụ Ọma 97:10.
Ọ bụ ihe ịja mma na ihe ka ọtụtụ ná ndị Jehova taa aṅawo ntị na ndụmọdụ nke a ma nọgide na-adị ọcha n’omume. Otú ọ dị, a dọpụwo uche ụfọdụ site n’ọrụ ndị na-adịchaghị njọ n’onwe ha ma bụrụ ndị bụ ihe efu na ndị na-adịghị amịpụta mkpụrụ ọ bụla ma ọlị. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ emikpuwo onwe ha n’atụmatụ ndị e ji achụ ego ma ọ bụ n’ịkpakọta ihe onwunwe. Ma Bible na-adọ aka ná ntị, sị: “Ndị na-ezube ịbụ ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà na ọtụtụ agụụ ihe ọjọọ nke uche na-adịghị n’ime ha, nke na-emerụkwa ahụ, bụ́ ihe na-eme ka mmadụ mikpuo emikpuo n’ime mbibi na ịla n’iyi.” (1 Timoti 6:9) Nye ndị ọzọ, agụmakwụkwọ ụwa abụrụwo ọnyà. N’eziokwu, ókè ụfọdụ nke agụmakwụkwọ ụwa pụrụ ịdị mkpa iji nweta ọrụ. Ma ná nchụso na-ewe oge nke oké mmụta akwụkwọ ụwa, ụfọdụ emerụwo onwe ha ahụ n’ụzọ ime mmụọ.
Ee, ọ pụrụ ịbụ na ọtụtụ ọrụ adịghị njọ n’onwe ha n’ụzọ omume. Ma otú o sina dị, ha nwụrụ anwụ ma ọ bụrụ na ugbu a ha adịghị atụkwasị ihe ná ndụ anyị n’ezie ma ọ bụ wetara anyị ihu ọma Jehova Chineke. Ọrụ ndị dị otú ahụ na-ewe oge na ike ma ha adịghị eweta abamuru ime mmụọ, ha adịghị enye ume ọhụrụ na-adịgide adịgide.—Tụlee Eklisiastis 2:11.
Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị na-agbalịsi ike iji ọrụ n’aka n’ihe omume ime mmụọ ndị kwesịrị ekwesị. Otú ọ dị, ọ bụ ihe na-enye aka inyocha onwe gị mgbe mgbe. Site n’oge ruo n’oge, ị pụrụ ịjụ onwe gị ajụjụ ndị dị ka: ‘Òkè m na-ekere n’ozi ubi na ịga nzukọ hà na-ada ada n’ihi na anarawo m ọrụ ego nke na-adịghị mkpa?’ ‘Ènwere m oge maka ịtụrụ ndụ ma nwee ntakịrị oge maka ọmụmụ ihe onwe onye na nke ezinụlọ?’ ‘Àna m etinye oge na ike dị ukwuu n’ilekọta ihe onwunwe ma ghara ilekọta ndị nọ ná mkpa n’ọgbakọ, dị ka ndị ọrịa na ndị meworo agadi?’ Ịza ajụjụ ndị a pụrụ ikpughe mkpa ọ dị n’akụkụ nke gị inye ọrụ ime mmụọ ọnọdụ mbụ karị.
Nọgide Na-eji Ọrụ n’Aka n’Ozi Jehova
Dị ka 1 Ndị Kọrint 15:58 si kwuo, e nwere ‘ọtụtụ ihe a ga-eme n’ọrụ Onyenwe anyị.’ Nke mbụ bụ ọrụ ikwusa Alaeze na ime ndị na-eso ụzọ. Na 2 Timoti 4:5, Pọl gbara ume, sị: “Mee ka ikwusa Ozi Ọma ahụ bụrụ ọrụ ị ga-arụ ná ndụ gị nile, ozi e jezukwara ejezu.” (Jerusalem Bible) Ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi nwekwara ihe dị ukwuu ha ga-eme n’ilekọta mkpa nke ìgwè atụrụ ahụ. (1 Timoti 3:1, 5, 13; 1 Pita 5:2) Ndị isi ezinụlọ—nke ọtụtụ n’ime ha bụ nanị nne ma ọ bụ nna—nwekwara oké ibu ọrụ n’ilekọta ezinụlọ ha na inyere ụmụ ha aka ito eto ná mmekọrịta nke ha na Chineke. Ịrụ ọrụ dị otú ahụ pụrụ ịbụ nke na-agwụ ike, ọbụna nke buru oké ibu mgbe ụfọdụ. Ma kama ịbụ ọrụ ndị nwụrụ anwụ, ha na-eweta ezi afọ ojuju!
Ihe bụ nsogbu bụ: Olee ụzọ mmadụ ga-esi nweta oge iji rụzuo ọrụ ndị a nile kwesịrị ekwesị? Inye onwe onye ọzụzụ na nhazi onwe onye dị mkpa. Ná 1 Ndị Kọrint 9:26, 27, Pọl dere, sị: “Mụ onwe m na-agba ọsọ otú a, dị ka onye na-adịghị agba n’eleghị anya ihe; otú a ka m na-esu ọkpọ, dị ka onye na-adịghị apịa ifufe: ma ana m etipụta ahụ m ọnyá, meekwa ya ka ọ bụrụ ohu m: ka mụ onwe m ghara ịghọ onye a jụrụ ajụ n’ụzọ ọ bụla, mgbe m kwusasịrị okwu Chineke nye ndị ọzọ.” Otu ụzọ isi tinye ụkpụrụ nke akụkụ akwụkwọ nsọ nke a n’ọrụ ga-abụ inyocha ihe ị na-eme na ụzọ ndụ gị site n’oge ruo n’oge. I nwere nnọọ ike ịchọpụta na ị pụrụ iwepụ ọtụtụ ihe ndị na-adịghị mkpa na-ewe oge na ike gị.
Dị ka ihe atụ, ị̀ na-etinye ihe ka ukwuu n’ike na oge gị n’ikiri TV, ịtụrụ ndụ, ịgụ akwụkwọ ụwa, ma ọ bụ ime ihe ndị na-amasị gị? Dị ka otu isiokwu dị n’akwụkwọ akụkọ The New York Times si kwuo, onye ọ bụla toruworo ogo mmadụ na United States na-etinye “nnọọ ihe karịrị 30 hour kwa izu” n’ikiri TV. N’ezie, a pụrụ iji oge dị otú ahụ mee ihe ka mma! Nwunye nke otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị kọrọ, sị: “Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na m hapụrụ kpam kpam ihe ọ bụla na-egbu oge, dị ka ikiri telivishọn.” Gịnị si na ya pụta? O nwere ike ịgụsị mpịakọta abụọ nke akwụkwọ nkà ihe ọmụma Bible bụ́ Insight on the Scriptures n’ozuzu ya!
Ọ pụkwara ịdị mkpa ka ị tụlee ókè ị ga-enwe ike ime ka ụzọ ndụ gị dị mfe. Solomọn kwuru, sị: “Ihe ụtọ ka ụra nke onye na-arụ ọrụ ubi bụ, ma ọ̀ bụ ihe nta ma ọ̀ bụ ihe hiri nne ka ọ na-eri: ma afọ ojuju nke ọgaranya adịghị ekwe ya arahụ ụra.” (Eklisiastis 5:12) Ì tinyere ihe ka ukwuu nke oge na ike gị n’ilekọta ihe onwunwe ndị na-adịghị mkpa? N’ezie, ka ihe onwunwe anyị nwere na-adị ukwuu karị, otú ahụ ka ihe ndị anyị nwere ilekọta, ịkwụ ụgwọ ha, idozi, na ichebe na-adị ukwuu karị. Ọ̀ pụrụ ịbụ ihe baara gị uru ịnapụ nnọọ onwe gị ihe onwunwe ụfọdụ?
Inwe usoro ime ihe ziri ezi bụ ụzọ ọzọ ị pụrụ isi jiri oge gị mee ihe ka mma. Usoro ime ihe dị otú ahụ kwesịrị ịgụnye mkpa ọ dị mmadụ izuru ike ma ọ bụ ịtụrụ ndụ. Ma e kwesịrị inye ọdịmma ime mmụọ ọnọdụ mbụ. E kwesịrị isetịpụ oge maka ije nzukọ ọgbakọ nile n’ụzọ chiri anya. Ị pụkwara ibu ụzọ kpebie ụbọchị ma ọ bụ uhuruchi ndị a pụrụ itinye n’ọrụ izisa ozi ọma. Site n’iji nlezianya mee atụmatụ, ị pụrụ ọbụna ịmụba òkè ị na-ekere n’ozi ahụ, ma eleghị anya na-eje ozi dị ka onye ọsụ ụzọ inyeaka site n’oge ruo n’oge. Otú ọ dị, jide n’aka na i setịpụrụ oge maka ọmụmụ ihe onwe onye na nke ezinụlọ, tinyere ịkwadebe nke ọma maka nzukọ nile. Site n’ime nkwadebe, ọ bụghị nanị na gị onwe gị ga-erite uru karị ná nzukọ ndị ahụ kama ị ga-anọ n’ọnọdụ ka mma “ịkpasu ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche” site n’azịza ndị ị na-enye.—Ndị Hibru 10:24.
Iwepụta oge maka ịmụ ihe pụrụ ịchọ ịchụ àjà ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, ezinụlọ Betel nile gbaa ụwa gburugburu na-ebili n’isi ụtụtụ ọ bụla iji tụlee ihe mmụta dịịrị ụbọchị. Ọ̀ ga-ekwe gị omume ịzụchapụta ntakịrị oge kwa ụtụtụ ọ bụla maka ọmụmụ ihe onwe onye? Onye ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: “Eburu m chi ọbụbọ ụzọ, wee tikuo gị: okwu gị nile ka m chere.” (Abụ Ọma 119:147) N’ezie, ibili n’oge ga-achọ ịhazi oge zuru ezu maka ihi ụra ka i wee nwee ike ịmalite ụbọchị na-esonụ dị ka onye ahụ siri ike na onye zuru ike nke ọma.
Abamuru Ndị Dị n’Iji Ọrụ n’Aka n’Ozi Jehova
Inwe ‘ọtụtụ ihe a ga-eme n’ọrụ Onyenwe anyị’ chọrọ ime atụmatụ, ọzụzụ, na ịchụ onwe onye n’àjà. Ma ị ga-erite uru a na-apụghị ịgụta ọnụ n’ihi ime otú ahụ. Ya mere, nọgide na-eji ọrụ n’aka, ọ bụghị n’ọrụ ndị nwụrụ anwụ ma ọ bụ ndị bụ ihe efu, bụ́ ndị na-akpata enweghị afọ ojuju na iru újú, kama n’ozi Jehova. N’ihi na ọ bụ site n’ọrụ ndị dị otú ahụ ka ị na-egosipụta okwukwe gị, na-enweta nnwapụta Chineke, na, n’ikpeazụ, nkwụghachi ụgwọ nke ndụ ebighị ebi!
[Foto dị na peeji nke 28]
Inwe usoro ime ihe ziri ezi na-enyere onye Kraịst aka iji oge ya na-eme ihe n’ụzọ amamihe karị