Ihe A Hụrụ n’Ala Nkwa Ahụ
Gerasa—Ebe Ndị Juu na Ndị Grik Zutere
PỌL onyeozi dere na n’etiti ezi mkpụrụ Abraham, “onye Juu ma ọ bụ onye Grik apụghị ịdị.” (Ndị Galetia 3:26-29) Ee, mba a mụrụ mmadụ na ya ma ọ bụ ọdịnala adịghị mkpa n’ihe metụtara nnabata Chineke.
Okwu ndị ahụ pụrụ iyi ihe kwesịrị ekwesị nye ndị Kraịst gbasara n’obodo Rom, dị ka obodo Galetia, ebe e nwere ngwakọta nke ndị Juu, ndị Grik, ndị Rom, na ndị obodo. Ma gịnị banyere akụkụ dị iche iche nke Israel n’onwe ya, dị ka Gilead?
Ógbè ahụ bụ ebe ọwụwa anyanwụ nke Jọdan, n’agbata Osimiri Nnu (Nwụrụ Anwụ) na Osimiri Galili. N’ihe dị ka n’etiti ala nke a na-emepụta nri nke ọma, Osimiri Jabbok na-eruba na Jọdan. Foto ahụ dị n’elu na-egosi ụfọdụ n’ime mkpọmkpọ ebe na-akpali mmasị nke Gerasa, nke a na-akpọ ugbu a Jerash, nke dị nso n’ebe ugwu Jabbok.
Otu ụzọ azụmahịa si ebe ugwu gaa ebe ndida nke a kpọrọ “okporo ụzọ eze” gafere Gilead. Mgbe ọ hapụrụ Heran, o yiri ka Jekọb na ezinụlọ ya hà si n’okporo ụzọ nke a gaa Jabbok. Ọ gbasoro otu mmụọ ozi mgba, o zutekwara Ịsọ n’ebe dị nso ebe a ga-ewu Gerasa. (Jenesis 31:17-25, 45-47; 32:22-30; 33:1-17) N’oge ọzọ, ndị Israel pụrụ n’ebe ndịda gaa n’okporo ụzọ eze mgbe ha na-etinye isi n’Ala Nkwa ahụ. Agbụrụ abụọ na ọkara gara biri n’ebe ugwu na ebe ndịda nke Jabbok n’okporo ụzọ azụmahịa ahụ.—Ọnụ Ọgụgụ 20:17; Deuterọnọmi 2:26, 27.
Ndị Grik hà tinyere aka n’ógbè nke a, ya bụrụkwa otú ahụ, n’ụzọ dị aṅaa? Ee, ha mere otú ahụ mgbe Alexander Onye Ukwu meriri ógbè ahụ. Dị ka omenala si dị, o guzobere Gerasa maka ndị aka ochie so n’òtù agha ya. Nwayọọ nwayọọ, mmetụta Grik ghọrọ nke e guzobere nke ọma. Obodo iri n’ime obodo ndị ahụ a na-achị achị ndị dị n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Jọdan na Osimiri Galili ghọrọ mba jikọrọ aka a maara dị ka Dekapọlis. Ị pụrụ ịrịbawo aha ahụ ama na Bible, nke kọrọ na “ọtụtụ ìgwè mmadụ wee si na Galili na Dekapọlis na Jerusalem na Judia na n’ofe Jọdan so [Jisọs].” Gerasa bụ otu n’ime obodo ndị dị na Dekapọlis.—Matiu 4:25.
‘Ọ bụ akụkụ nke atụmatụ Alexander iwebata ndị Grik n’akụkụ nile nke alaeze ukwu ahụ. Ebe ndịda Siria [tinyere Dekapọlis], karịsịa, dị ka otu n’ime ebe ndị pụtara ìhè, dọtara ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị Grik. Ruo taa, ọ dịghị akụkụ ọ bụla nke ebe ọwụwa anyanwụ ụwa pụrụ igosi mkpọmkpọ ebe dị ọtụtụ ma na-akpali akpali otú a dị ka mba ahụ dị n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Jọdan. Obodo Grik dị iche iche gosipụtara, n’elu n’elu, nguzobe zuru ezu nke ihe owuwu na ọdịnala ndị Grik—ụlọ nsọ ndị buru ibu nye ọtụtụ chi na chi nwanyị ndị Grik, ebe egwuregwu, ebe ịsa ahụ ọha, ememe egwuregwu a na-eme kwa afọ, nakwa n’ọtụtụ ọnọdụ ụlọ akwụkwọ na agụmakwụkwọ nkà ihe ọmụma.’—Hellenism, nke Norman Bentwich dere.
Ọ bụrụ na ị gaa ná mkpọmkpọ ebe nke Gerasa, ị ga-achọta ihe àmà buru ibu banyere nke ahụ. N’ebe dị nso ụzọ mbata ebe ndịda, e nwere ọgbọ nnọkọ, ma ọ bụ ahịa ọha na eze, nke a na-ahụ na foto ahụ. Ma eleghị anya, ọ ga-eju gị anya ịhụ ebe ịsa ahụ, ụlọ nsọ, ebe ihe nkiri, na ihe owuwu ọha na eze, ndị e jikọrọ ọtụtụ n’ime ha ọnụ site n’okporo ụzọ ndị a wụrụ nkume na ha ndị jupụtara ná mgbidi. N’azụ obodo ahụ, ị pụrụ ịhụ nkume ntụziaka ma ọ bụ akara ndị dị n’okporo ụzọ oge ochie ahụ nke jikọtara Gerasa na obodo ndị ọzọ dị na Dekapọlis nakwa n’ọdụ ụgbọ mmiri Mediterranean.
Ọbụna mgbe Rom weghaara Gerasa n’afọ 63 T.O.A., mmetụta Grik dịgidere. Ị pụrụ iche echiche ụzọ mmetụta nke a pụrụ isi metụta ndị Juu bi na Gerasa nakwa n’ógbè ahụ. Akwụkwọ ahụ bụ́ Hellenism kwuru, sị: “N’ezie, ndị Juu ji nwayọọ nwayọọ malite ịnabata echiche okpukpe nke ndị ahụ nwere banyere ha, na ileba anya n’Akwụkwọ nsọ n’okpuru mmetụta nke echiche ndị ahụ.”
Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na Jisọs emeghị nkwusa n’obodo ahụ, ọ banyere n’obodo Gerasa, nke pụrụ iruworị Osimiri Galili. Ọ chụpụrụ mmụọ ọjọọ n’ahụ otu nwoke n’obodo ahụ, na-ekwere ka ha banye n’ime ézì. (Mak 5:1-17) Ma eleghị anya, ndị na-eso ụzọ ya n’oge gboo kwusaara ndị Juu bi n’obodo dị iche iche nke Dekapọlis ozi ọma, mgbe 36 O.A. gasịkwara, a pụrụ isoro ndị Grik bi na Gerasa kerịta ozi ọma ahụ. Ma onye na-anakwere Iso Ụzọ Kraịst ọ̀ bụwo onye ji okpukpe ndị Juu kpọrọ ihe, onye Juu nwere echiche ndị Grik, ma ọ bụ onye Grik, ọ pụrụ ịbụ onye ezi Chineke nabatara dị ka akụkụ nke mkpụrụ ime mmụọ nke Abraham.
[Map dị na peeji 24]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Dion
Gerasa (Jarash)
Philadelphia (Rabbah)
King’s Road
Salt Sea
Jerusalem
Jordan
Jabbok
Pella
Scythopolis (Beth-shean)
Gadara
Sea of Galilee
[Ebe E Si Nweta Foto]
Ọ dabeere n’otu map ike mbipụta ya dị n’aka Pictorial Archive (Near Eastern History) Est. na Survey of Israel.
[Foto dị na peeji nke 24]
Foto nke a dị n’ihe osise buru ibu na 1992 Calendar of Jehovah’s Witnesses.
[Ebe E Si Nweta Foto]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 25]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.