Ihe Ndị A Hụrụ n’Ala Nkwa Ahụ
Bịa Jegharịa n’Osimiri Galili!
EBE ole na ole na-abata n’uche nke ndị na-agụ Bible ngwa ngwa karịa Osimiri Galili. Ma ị̀ pụrụ imechi anya gị ma jiri echiche gị hụ osimiri mmiri dị mma nke a, na-achọpụta ebe ndị bụ isi, dị ka n’ebe Osimiri Jọdan si bata ma na-apụkwa ma ọ bụ ebe Kapanaum na Taịbirias dị?
Wepụta oge ịmụ foto ahụ dị n’okpuru nke a nọ n’elu see, na-atụle akara ndị e depụtara e ji aghọta ya. Ebe ole e nyere akara ka ị pụrụ ịmata? Ka ị na-amata ọtụtụ n’ime ha, otú ahụ ka Bible gị na-adịkwu ndụ ma nwee nzube. N’ihi nke ahụ, bịa mee njegharị dị mkpirikpi, nke na-ezi ihe.
Foto nke a a nọ n’elu see bụ nke ebe gawara n’ebe ọwụwa anyanwụ nke ebe ugwu. Ka anyị jiri #1 malite. Akụkụ dị aṅaa nke osimiri ahụ ka nke ahụ bụ? Ee, ebe ndịda, ebe Jọdan dị, na-agbada n’agbata Sameria na Gilead iji sọbanye n’Osimiri Nwụrụ Anwụ. N’akụkụ ebe aka ekpe ị ga-ahụ akụkụ nke a nke osimiri uhie nke ọma karị, nke e gosikwara na 1993 Calendar of Jehovah’s Witnesses.
Osimiri Galili dị n’ime ime Ndagwurugwu Rift ahụ, ihe dị ka 200 mita n’ebe dị ala karịa Osimiri Mediterranean. Ka ị na-enyocha foto ahụ a nọ n’elu see, rịba ama ugwu ndị dị n’ụsọ ya nke ebe ọwụwa anyanwụ (gburugburu #7). Ugwu nta na oké ugwu dị iche iche dịcha n’ụsọ dịtụ nso karị, ma ọ bụ n’ebe ọdịda anyanwụ na-emesi ya ike na osimiri nke a dị n’ime ebe ala dakpuru n’ime, ebe osimiri ahụ dị ihe dị ka 21 kilomita n’ogologo na ihe na-akarịghị 12 kilomita n’obosara. E nwere ohere dị n’ụsọ mmiri ya maka obodo nta dị iche iche na ọbụna obodo ukwu dị iche iche, dị ka Taịbirias (#2). Cheta na otu ìgwè mmadụ nọ n’ụgbọ mmiri sitere Taịbirias gabiga osimiri ahụ ruo ebe Jisọs nyeworo 5,000 mmadụ nri n’ụzọ ọrụ ebube.—Jọn 6:1, 10, 17, 23.
Ka ị na-aga n’ụsọ osimiri ahụ n’ebe ugwu site na Taịbirias, ị ga-agafe ógbè Genesaret na-eme ihe ubi nke ọma (#3).a Ọ bụ n’ógbè a ka Jisọs ziri Ozizi Elu Ugwu ahụ, ọ pụkwara ịbụ na n’ụsọ osimiri dị nso ka ọ kpọkuru Pita na mmadụ atọ ndị ọzọ ka ha bụrụ “ndị ọkụ̀ na-akụta mmadụ” dị ka e gosiri n’ebe a. (Matiu 4:18-22) N’imere njem gaa n’ihu, ị ga-abịarute Kapanaum (#4), bụ́ ebe bụ isi Jisọs rụrụ ọrụ, ọbụna bụrụ nke e zoro aka na ya dị ka ‘obodo nke aka ya.’ (Matiu 4:13-17; 9:1, 9-11; Luke 4:16, 23, 31, 38-41) N’ịgụrụ galaa ebe ọwụwa anyanwụ gburugburu osimiri ahụ, ị ga-ejekwuru (#5) ebe akụkụ mgbago mgbago Jọdan sọbanyere n’osimiri ahụ (dị n’okpuru). Mgbe ahụ ị ga-abịarute n’ógbè Betsaịda (#6).
Anyị pụrụ ọbụna iji ógbè ole na ole ndị a mee ihe atụ nke otú ihe ọmụma i nwere banyere Osimiri Galili pụrụ isi nyere gị aka ịgbaso, ma jiri anya nke uche gị hụ ihe ndekọ dị iche iche nke Bible. Mgbe Jisọs nyesịrị 5,000 mmadụ nri n’ógbè Betsaịda, ìgwè mmadụ wee chọọ ime ya eze, o zipụrụ ndị ozi n’ụgbọ mmiri gaa Kapanaum. N’oge ha nọ ná njem ha, ná mberede oké ifufe fedatara site n’oké ugwu ndị ahụ wee kpalie ebili mmiri, na-eme ka ndị ozi ahụ tụọ egwu. Ma Jisọs bịakwutere ha na-eje ije n’elu osimiri ahụ, mee ka oké ifufe ahụ dajụọ, ma nyere ha aka ịbịarute Genesaret n’enweghị mmerụ ahụ. (Matiu 14:13-34) Ndị ahụ si Taịbirias bịa gafekwara ọzọ na Kapanaum.—Jọn 6:15, 23, 24.
N’ịga n’ihu gburugburu akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ nke osimiri ahụ, ị ga-agafe ihe o yiri ka ọ bụ ya ka e zoro aka na ya dị ka ‘ala ndị Gadara [ma ọ bụ, ndị Gerasa].’ Cheta na ọ bụ n’ebe a ka Jisọs chụpụrụ ndị mmụọ ọjọọ site n’ahụ ndị ikom abụọ. N’ụzọ inweta ihe ụtọ n’arụrụala, ndị mmụọ ahụ banyere n’ime otu ìgwè ezì buru ibu, bụ́ ndị si n’ebe ahụ dị elu mabanye n’ime osimiri. Mgbe nke ahụ gasịrị otu n’ime ndị ikom ahụ gbara àmà n’obodo ukwu dị iche iche dị nso nke Dikapọlis ahụ, bụ́ ndị na-asụ asụsụ Grik. Jisọs gabigara Osimiri Galili n’ụgbọ iji rute ma hapụ ógbè nke a.—Matiu 8:28–9:1; Mak 5:1-21.
Ka ị na-emezu njegharị gị n’akụkụ ebe ndịda nke osimiri ahụ, ị ga-agafe ebe dị nso n’ebe otu osimiri buru ibu (a kpọrọ Yarmuk) na-eweta mmiri buru ibu n’akụkụ ebe ndịda nke Osimiri Jọdan.
Bible ekwughị kpọmkwem ebe ihe omume ụfọdụ weere ọnọdụ gburugburu Osimiri Galili nọ mee, dị ka mpụta Jisọs pụtara mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ mgbe Pita na ndị ozi ndị ọzọ na-akụ azụ (n’okpuru). Ì chere na ọ bụ n’ebe dị nso Kapanaum? Otú o sina dị, ihe ọmụma i nwere banyere osimiri nke a dị mkpa na-enyere gị aka iji anya nke uche gị hụ omume ọ pụrụ ikwe mee.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee isiokwu ahụ bụ́ “Genesaret—‘Ọ dị ebube, Maakwa Mma’” n’Ụlọ Nche nke January 1, 1992.
[Foto ndị dị na peeji nke 24]
1
2
3
4
5
6
7
N
S
E
W
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 24]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 24]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 25]
Garo Nalbandian
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 25]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.