Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 11/1 p. 26-30
  • Iji Echiche Nke Ịdị Ngwa Na-eje Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Iji Echiche Nke Ịdị Ngwa Na-eje Ozi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọzụzụ Oge Agha
  • Mmalite nke Otu Ọrụ
  • Onye Inyeaka Dị Oké Ọnụ Ahịa
  • Ije Ozi Ala Ọzọ n’Indonesia
  • N’etiti Ikpu Gọọmenti Ihu
  • E Merie Mmegide Ọzọ
  • Gaa ná Ndịda America
  • Jehova Nọnyeere M
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Jehova Kụziiri M Ime Uche Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Nhọrọ Ndị Ziri Ezi M Mere Ewetara m Ngọzi Na-adịgide Adịgide
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Egwú Ndị Na-eme Chineke Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 11/1 p. 26-30

Iji Echiche Nke Ịdị Ngwa Na-eje Ozi

DỊ KA HANS VAN VUUDRE SI KỌỌ

N’otu ụtụtụ na 1962, Paul Kushnir, onye nlekọta alaka Watch Tower Society na Netherlands, zutere m n’ógbè ọdụ ụgbọ mmiri Rotterdam. N’ile m anya site n’ebe ọ nọ na table n’ime otu ụlọ oriri nta ìhè ọkụ na-adịghị nke ọma, ọ sịrị: “Ị̀ maara, Hans, na ọ bụrụ na ị nara ọrụ a, gị na nwunye gị ga-anata tiketi ụgbọ maka ojije nanị?”

“EE, O dokwara m anya nke ọma na Susie ga-ekwetakwa nke ahụ.”

“Ọ dị mma, gị na Susie kparịtanụ ya. Ọ ga-aka mma ma ọ bụrụ na i mee ka m mara ihe unu kpebiri ngwa ngwa.”

N’ụtụtụ echi ya ọ natara azịza anyị: “Anyị ga-aga.” Ya mere na December 26, 1962, anyị makụrụ ndị ikwu na ndị enyi anyị n’Ọdụ Ụgbọ Elu Schiphol nke Amsterdam, bụ nke snow kpuchiri, anyị wee fepụ gaa n’ókèala ozi ala ọzọ a na-agatụbeghị—Netherlands New Guinea (ebe bụ West Irian, Indonesia ugbu a)—ala ndị Papua.

Ànyị nwere obi abụọ ịnara ọrụ nke a bụ ihe ịma aka? Ọ dịghị otú a n’ezie. Anyị ejiwo obi anyị nile rara ndụ anyị nye ime uche Chineke, anyị nwekwara ntụkwasị obi na ọ ga-akwado anyị. N’ịtụgharị uche ná ndụ anyị, anyị pụrụ ịhụ na obi ike anyị na Jehova abụbeghị nke e tinyere n’ebe na-ekwesịghị ekwesị. Ma tupu m kọọ ihe mere n’Indonesia, ka m kọọrọ gị banyere ndụ anyị mgbe anyị dị na nwata.

Ọzụzụ Oge Agha

Mgbe Onyeàmà ahụ nwere obi ike bụ́ Arthur Winkler letara ezinụlọ m nke mbụ ya na 1940, ihe m gbara bụ nanị afọ iri. O juru ndị mụrụ m anya mgbe ha chọpụtara ihe Bible kwuru banyere ozizi ụgha nile nke Krisendọm. Ebe ndị Nazi Germany nọchiri Netherlands mgbe ahụ, e wee na-akpagbu Ndịàmà Jehova, ndị mụrụ m aghaghị ikpebi ma hà ga-abụ ndị òtù nke nzukọ a machibidoro iwu. Ha kpebiri ime otú ahụ.

Mgbe nke ahụ gasịrị, obi ike nne m na ịdị njikere ya itinye nnwere onwe ya na ọbụna ndụ ya n’ihe ize ndụ masịrị m. N’otu mgbe ọ gbara ígwè 11 kilomita ma jiri akpa a fọjuru traktị Bible chere n’ọchịchịrị. Mgbe oge a kara aka ruru maka mkpọsa ahụ pụrụ iche ịmalite, o jiri ígwè ya gbaa ọsọ dị ka ọ pụrụ, na-amanye aka n’akpa ya mgbe nile, na-atụsasị traktị ndị ahụ n’okporo ámá. Otu nwoke ji ígwè na-achụ ya mesịrị gbafere ya ma tie mkpu n’ikusi ume ike, sị: “Nwa ada, nwa ada, ihe gị na-adafusị!” Anyị apụghị ịkwụsị ịchị ọchị mgbe Mama kọọrọ anyị akụkọ a.

Abụ m nnọọ ezi nwata, ma m maara ihe m chọrọ iji ndụ m mee. N’oge otu n’ime nzukọ anyị n’etiti afọ 1942, mgbe onye nduzi jụrụ sị, “Ònye ga-achọ ka e mee ya baptism n’oge ọzọ?” M weliri aka m elu. Ndị mụrụ m lerịtara onwe ha anya n’ahụ mgbakasị, na-enwe obi abụọ ma m ghọtakwara ịdị mkpa nke mkpebi dị otú ahụ. Ma ọbụna na ọ bụ ezie na m dị nanị afọ 12, m ghọtara ihe mmadụ ịrara onwe ya nye Chineke pụtara.

Ikwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ ka ndị Nazi na-achụgharị anyị chọrọ iji akọ mee ihe. Iji zere ịga n’ụlọ ndị pụrụ ịkọrọ ndị Nazi banyere anyị, n’ụbọchị mgbe ndị na-akwado ndị Nazi mapawara akwụkwọ na window ha, m jiri ígwè gbagharịa ma detuo adres ha. Otu mgbe otu nwoke hụrụ m ma tie mkpu, sị: “Jisie ike, nwa m nwoke. Detuo ha—ha nile!” M nwere ịnụ ọkụ n’obi ma o doro anya na ejighị m nghọta mee ihe n’ụzọ zuru ezu! Mgbe agha ahụ gwụsịrị na 1945, anyị nwere ọṅụ n’ihi olileanya nke inwe onwe ka ukwuu ime nkwusa.

Mmalite nke Otu Ọrụ

Na November 1, 1948, mgbe m gụsịrị akwụkwọ m, m natara ọrụ ime nkwusa oge nile m nke mbụ dị ka onye ọsụ ụzọ. Otu ọnwa mgbe nke a gasịrị, Nwanna Winkler letara ezinụlọ m nọ n’ebe ha. Ọ ghaghị ịbụ na ọ bịara iji kpebie ụdị onye m bụ n’ihi na n’oge na-adịghị anya mgbe e mesịrị a kpọrọ m òkù ịbịa rụọ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ Society na Amsterdam.

Mgbe e mesịrị a gwara m ka m jee na-eleta ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova dị ka onye nlekọta sekit. Mgbe ahụ, n’oge mgbụsị akwụkwọ osisi nke 1952, m natara ịkpọ òkù ije klasị nke 21 nke ụlọ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead na New York iji nata ọzụzụ onye ozi ala ọzọ. Ya mere, n’ọgwụgwụ nke afọ 1952, mmadụ asatọ n’ime anyị ndị sitere Netherlands banyere n’ụgbọ mmiri bụ́ Nieuw Amsterdam ma kwọrọ jee America.

N’ọgwụgwụ nke ọzụzụ ụlọ akwụkwọ ahụ, Maxwell Friend, otu n’ime ndị nkụzi ahụ kwuru, sị: “Unu ga-echefu ihe ka ọtụtụ n’ihe ndị unu mụtaworo ebe a, ma anyị nwere olileanya na ihe atọ ga-anọgide n’ime unu: okwukwe, olileanya, na ịhụnanya.” Ihe ọzọ e chekwara n’ime uche na obi m bụ ihe ncheta ndị dị oké ọnụ ahịa nke na nzukọ Jehova ji echiche nke ịdị ngwa na-arụ ọrụ.

Mgbe nke a gasịrị enwetara m ihe mmechuihu buru ibu. Ọkara nke ìgwè anyị bụ́ ndị Netherlands—tinyere mụ onwe m—bụ ndị e kenyere ọrụ ịgaghachi Netherlands. Ọ bụ ezie na nke a bụ ihe mmechuihu, ọ kpasughị m iwe. M nwere nnọọ olileanya na m gaghị echere, dị ka Mosis oge ochie mere, ruo 40 afọ tupu e kenye m ọrụ ná mba ọzọ.—Ọrụ 7:23-30.

Onye Inyeaka Dị Oké Ọnụ Ahịa

Mgbe Fritz Hartstang, enyi nke na-emeso m dị ka nna, mesịrị nụ banyere atụmatụ m ịlụ nwanyị, ọ gwara m ná ntụkwasị obi, sị: “Apụghị m nnọọ icheta nhọrọ ka nke a mma.” Nna Susie, Casey Stoové, anọwo na-abụ onye agha bụ isi ná Nguzogide e guzogidere ndị Nazi n’Agha Ụwa nke Abụọ. Ma mgbe Ndịàmà kpọtụụrụ ya na 1946, ọ nakweere eziokwu Bible ozugbo ahụ. N’oge na-adịghị anya e mere ya na atọ n’ime ụmụ ya isii—Susie, Marian, na Kenneth—baptism. Na May 1, 1947, ụmụaka ndị a nile malitere ije ozi oge nile dị ka ndị ọsụ ụzọ. Na 1948, Casey rere azụmahia ya, ọ malitekwara ọrụ ọsụ ụzọ. N’ikpeazụ o kwuru, sị: “Afọ ndị ahụ bụ ndị m kasị nwee obi ụtọ na ha ná ndụ m!”

Ọ bụ na 1949 ka m matara Susie, mgbe a kpọrọ ya òkù ịrụ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ dị na Amsterdam. Otú ọ dị, n’afọ na-esonụ, ya na nwanne ya nwanyị bụ́ Marian hapụrụ iji jee klasị nke 16 nke Gilead ma jiri ụgbọ mmiri jee ebe e kenyere ha ọrụ ozi ala ala ọzọ ha—Indonesia. Na February 1957, mgbe o jeworo ozi ala ọzọ ruo afọ ise n’ebe ahụ, Susie lọghachitere na Netherlands ịlụ m. N’oge ahụ, m na-eje ozi dị ka onye nlekọta sekit, n’ime afọ dum ahụ nke alụmdi na nwunye anyị, o gosiwo ịdị njikere ọtụtụ mgbe ịchụ àjà onwe onye maka ije ozi Alaeze.

Mgbe anyị gbasịrị akwụkwọ, anyị nọgidere na-eleta ọgbakọ dị iche iche n’akụkụ dị iche iche nke Netherlands. Afọ ndị ahụ Susie rụrụ ọrụ ozi ala ọzọ n’ebe ndị siri ike e kenyere ya ọrụ akwadebewo ya nke ọma maka njem anyị ji ígwè na-aga site n’otu ọgbakọ ruo n’ọzọ. Ọ bụ mgbe anyị nọ n’ọrụ sekit na 1962 ka Nwanna Kushnir letara m na Rotterdam ma kpọọ anyị òkù ịkwaga West Irian, Indonesia.

Ije Ozi Ala Ọzọ n’Indonesia

Anyị bịarutere n’obodo Manokwari—ụwa ọzọ kpam kpam! E nwere ụda na-atụ egwu nke abalị ebe okpomọkụ ụwa na okpomọkụ na uzuzu. E nwekwara ndị Papua si n’ime ime obodo bụ́ ndị na-ama nanị ákwà n’úkwù, buru mma ogè, ma nwee mmasị ije ije n’azụ anyị, na-achọkwa ibitụ akpụkpọ ahụ ọcha anyị aka—ọ dịrịghị anyị mfe ihe a nile iwere anyị ahụ.

N’ime izu ole na ole mgbe anyị bịarutere, ndị ụkọchukwu nọ n’elu pọlpit ha gụọ otu akwụkwọ ozi na-adọ ndị mmadụ aka ná ntị megide Ndịàmà Jehova, ha nyekwara ndị nile bịaranụ otu otu. Ọbụna ụlọ ọrụ redio dị n’ebe ahụ kpọsara akwụkwọ ozi ahụ. Mgbe ahụ ndị ụkọchukwu atọ letara anyị ma gwa anyị ka anyị kwagaa n’ime ime obodo iji rụọ ọrụ n’etiti ndị ha kpọrọ “ndị ọgọ mmụọ.” Onye ọrụ uwe ojii Papua nọ n’ọkwá dị elu gbakwara anyị ume ịhapụ, otu onye òtù ndị uwe ojii nzuzo gwakwara anyị na a na-eme atụmatụ igbu anyị.

Otú ọ dị, ọ bụghị mmadụ nile megidere anyị. Otu onye na-enye ndụmọdụ banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Papua, nwa amaala Netherlands bụ onye ọ fọrọ nke nta ka ọ hapụ ebe ahụ iji gaa Netherlands, mere ka ọtụtụ ndị isi Papua mara anyị. “Ndịàmà Jehova ga-eweta ụdị okpukpe ndị Kraịst dị mma karịa ka unu maara,” ka ọ gwara ha. “N’ihi ya, unu kwesịrị ịnabata ha.”

Mgbe e mesịrị, otu onye ọrụ gọọmenti bịakwutere Susie n’okporo ámá ma gwa ya n’olu dị ala, sị: “A kọworo anyị na unu amalitewo ọrụ ọhụrụ n’ebe a, n’ihi ya kwa, anyị apụghị ikwe ka unu nọrọ. Ma, eem, . . . a sị nnọọ na unu nwere ụlọ chọọchị.” Nke ahụ bụ aro dị mma! Ngwa ngwa anyị kụturu mgbidi dị n’ụlọ anyị, hazie oche ndị dị ogologo, rụnye otu ebe ikpo okwu, ma guzobe n’ihu ebe ahụ ihe e dekwasịrị “Ụlọ Nzukọ Alaeze.” Mgbe ahụ anyị kpọrọ onye ọrụ ahụ òkù ka ọ bịa nleta. O kwere n’isi, mụmụọ ọnụ ọchị, ma were mkpịsị aka ya nke na-esote nke ukwu pịa n’akụkụ isi ya, dị ka à ga-asị na ọ na-ekwu, ‘Akọ, akọ.’

Na June 26, 1964, otu afọ na ọkara ka anyị bịarutesịrị, e mewo 12 ndị Papua bụ́ ndị mmụta Bible anyị baptism. N’oge na-adịghị anya, 10 ndị ọzọ sochiri, nkezi nke ndị na-abịa nzukọ anyị rukwara 40. E zitere ndị ọsụ ụzọ abụọ si Indonesia ka ha bịa nyere anyị aka. Mgbe e guzobesịrị ọgbakọ ahụ nke ọma na Manokwari, alaka ụlọ ọrụ Society n’Indonesia nyere anyị ebe ọzọ anyị ga-arụ ọrụ ime nkwusa ọzọ, na December 1964.

Tupu anyị ahapụ, onye isi Ngalaba Mmekọrịta Ọha nke gọọmenti kpọọrọ anyị gaa n’akụkụ wee, sị: “Ọ na-ewute m na unu na-ahapụ. Kwa izu ndị ụkọchukwu rịọrọ m ka m zipụ unu n’ihi na ha sịrị na unu na-aghọrọ mkpụrụ ha. Ma m gwara ha, sị: ‘Ee e, kama nke ahụ, ha na-azụ osisi unu.’” O kwukwara, sị: “Ebe ọ bụla unu gara, nọgidenụ na-alụ ọgụ. Unu ga-emeri!”

N’etiti Ikpu Gọọmenti Ihu

N’otu abalị na September 1965, ka anyị na-eje ozi n’isi obodo, bụ́ Djakarta, ndị Kọmụnist bụ ndị nnupụisi gburu ọtụtụ ndị ndú ndị agha, mụnye Djakarta ọkụ, wee malite ọgba aghara zuru mba ọnụ nke mesịrị chụpụ onye isi ala mba ahụ, bụ́ Sukarno, n’ọkwá ọchịchị. Ihe dị ka 400,000 mmadụ tụfuru ndụ ha!

N’otu oge anyị na-eme nkwusa ebe a na-agba égbè ma na-esu ihe ọkụ n’okporo ámá na-esonụ. N’ụbọchị na-esonụ, anyị nụrụ na ndị agha gaje ibibi ihe owuwu ndị Kọmụnist dị n’ebe dị nso. Ndị nwe ụlọ yiri ndị egwu ji ka anyị na-abịaru ha nso, ma mgbe ha nụrụ ozi Bible anyị, ha kudara ume ma kpọbata anyị. Ha nwere mmetụta nke ịnọ ná nchebe inwe anyị n’etiti ha. Oge ahụ ziri anyị nile ịdabere n’ebe Jehova nọ na ịnọ n’ezi nguzo mgbe anyị nọ n’okpuru ihe isi ike.

E Merie Mmegide Ọzọ

Ná ngwụsị 1966 anyị kwafere n’obodo Ambon n’agwaetiti ahụ mara mma nke ndịda Molucca. N’ebe ahụ, n’etiti ndị ahụ nwere omume enyi, ndị na-anabata ndị ọzọ, anyị hụrụ mmasị ime mmụọ dị ukwuu. Obere ọgbakọ ahụ toro ngwa ngwa, ndị na-abịakwa nzukọ ruru otu narị. Ya mere ndị ọrụ chọọchị Krisendọm jere leta Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ihe Metụtara Okpukpe iji rụgide onye isi ya ịmanye anyị ịhapụ Ambon. Ma n’ebe ahụ na table onye isi ahụ, ha hụrụ akwụkwọ dị iche iche nke Watch Tower Society ka a gbasara ha n’ụzọ pụtara ìhè! N’ịda ịgbanwe uche onye isi ahụ, ha kpọtụụrụ ndị isi ọrụ nke Ministri Na-ahụ Maka Okpukpe na Djakarta, na-achọ ka a chụpụ anyị ọ bụghị nanị site n’Ambon kama site n’Indonesia nile kwa.

N’oge nke a o yiri ka hà nwere ihe ịga nke ọma, n’ihi na e setịpụrụ February 1, 1968, dị ka ụbọchị a ga-achụpụ anyị. Otú ọ dị, ụmụnna anyị ndị Kraịst nọ na Djakarta kpọtụụrụ otu onye isi ndị Alakụba nọ n’ọkwá dị elu n’ụlọ ọrụ Ministri Na-ahụ Maka Okpukpe, o nyekwara aka ịtụgharị mkpebi ahụ. Tụkwasị na nke ahụ, a gbanwere ụkpụrụ mbụ a tụrụ, e wee nyekwa ndị ozi ala ọzọ ndị ọzọ ohere ịbata.

Otú a, n’ime afọ iri sochirinụ, n’ebe jupụtara n’ugwu ndị mara oké mma, oké ọhịa, na ọdọ mmiri dị iche iche n’ebe ugwu Sumatra, anyị na ndị ozi ala ọzọ si Australia, Austria, Germany, Philippines, Sweden, na United States rụkọrọ ọrụ. Ọrụ nkwusa ahụ bara ụba, karịsịa n’etiti agbụrụ bụ isi e nwere n’ógbè ahụ, bụ́ ndị Batak.

Otú ọ dị, ndị okpukpe na-atụ atụmatụ ọjọọ nwere ihe ịga nke ọma n’ikpeazụ n’ime ka a machibido ọrụ nkwusa anyị iwu na December 1976, n’afọ na-esokwa ya, ihe ka ọtụtụ ná ndị ozi ala ọzọ ahụ hapụrụ ebe ahụ jee ná mba ndị ọzọ e kenyere ha ọrụ. N’ikpeazụ, na 1979, anyị lakwara.

Gaa ná Ndịda America

Ka ọ dị ugbu a anyị dị ihe dị ka 50 afọ, anyị ka na-atụlekwa n’uche anyị ma anyị ka pụrụ ime mgbanwe iji gaakwa ná mba ọzọ. “Ànyị ga-anara ebe ọhụrụ e kenyere anyị ọrụ ka ànyị ga-anọrọzi otu ebe?” ka Susie jụrụ.

“Ọ dị mma, Susie,” ka m zaghachiri, “ebe ọ bụla Jehova kpọrọ anyị òkù ije, o lekọtara anyị anya nke ọma. Ònye maara ngọzi ndị ọzọ ọdịnihu nwere maka anyị?” Otú a, anyị bịarutere n’ebe ọhụrụ e kenyere anyị ọrụ, mba Ndịda America bụ́ Suriname. Mgbe ọ na-erule ọnwa abụọ anyị amalitewo ọrụ njegharị ọzọ, n’oge na-adịghị anya ahụ doro anyị.

Ịtụleghachi ihe karịrị 45 afọ anyị nọ n’ozi oge nile, mụ na Susie aghọtawo ụzọ nkwado nke ndị mụrụ anyị si bụrụ ihe dị mkpa iji nyere anyị aka ịga n’ihu n’ọrụ ozi ala ọzọ ahụ. Na 1969, mgbe m hụrụ ndị mụrụ m ọzọ mgbe afọ isii gasịrị, nna m kpọọrọ m gaa n’akụkụ wee, sị: “Ọ bụrụ na Mama gị eburu m ụzọ nwụọ, ọ dịghị mkpa ka ị lọta ụlọ. Nọrọ n’ebe e kenyere gị ọrụ. M ga-eme ihe m nwere ike ime. Ma ọ bụrụ na ọ bụ m bu ụzọ, ị ga-ajụ Mama gị banyere ya.” Mama kwuru otu ihe ahụ.

Ndị mụrụ Susie nwekwara otu àgwà ahụ nke achọghị ọdịmma onwe onye nanị. N’otu oge Susie ahapụwo ha ruo 17 afọ, ma n’agbanyeghị nke ahụ ọ dịbeghị mgbe ha deere ya okwu ọ bụla na-akụda mmụọ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ọ dịghị enyemaka ọ bụla ọzọ dịịrị ndị mụrụ anyị, anyị gaara alọta ụlọ. Isi ihe a na-ekwu bụ, ndị mụrụ anyị gụrụ ọrụ ozi ala ọzọ n’ihe dị oké ọnụ ahịa, ruokwa mgbe ha nwụrụ, ha ejiriwo otu echiche ahụ nke ịdị ngwa bụ́ nke ha kụnyeworo n’ime obi anyị jeere Jehova ozi.—Tụlee 1 Samuel 1:26-28.

Anyị enwetawokwa agbamume site n’aka ndị kwesịrị ntụkwasị obi na-edetere anyị akwụkwọ ozi mgbe nile. E nwere ole na ole ndị na-ahapụbeghị idere anyị akwụkwọ ozi kwa ọnwa n’ime ihe karịrị 30 afọ anyị jere ozi ala ọzọ! Ma karịsịa ihe nile, anyị na-eburu ezi Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova n’obi, bụ́ onye maara ka e si akwado ndị ohu ya n’elu ụwa. N’ihi ya, ka anyị na-abịaru ọgwụgwụ nke ihe omume nile anyị nọworo na-elepụ anya maka ya ugbu a, mụ na Susie nwere ọchịchọ ‘ile anya ọbịbịa nke ụbọchị ahụ nke Chineke’ site n’ịnọgide na-ejere Jehova ozi site n’inwe echiche nke ịdị ngwa.—2 Pita 3:12.

[Foto dị na peeji nke 26]

Ha lụrụ di na nwunye na 1957

[Foto dị na peeji nke 29]

Lee ihe obi ụtọ ọ bụ—ndị na-eto eto isii dị ka ndị ọsụ ụzọ!

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya