Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 1/1 p. 24-25
  • Genesaret—‘Ọ Dị Ebube, Maakwa Mma’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Genesaret—‘Ọ Dị Ebube, Maakwa Mma’
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Bịa Jegharịa n’Osimiri Galili!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Ihe Ndị Mere n’Oge Baịbụl—Onye Na-akụ Azụ̀
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Ije Ozi Dị Ka Ndị Ọkụ Na-akụta Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Jizọs Akpọọ Mmadụ Anọ Ka Ha Bụrụ Ndị Na-akụta Mmadụ
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 1/1 p. 24-25

Ihe A Hụrụ n’ala Nkwa Ahụ

Genesaret—‘Ọ Dị Ebube, Maakwa Mma’

“N’akụkụ Ọdọ Mmiri Genesaret e nwere otu ókèala dị ogologo nke nwere otu aha ahụ, nke dị ebube n’ihe ndị e ji mara ya na n’ịma mma ya. N’ihi ájá ya na-eme nri nke ukwuu e nweghị ihe ọkụkụ ọ bụla na-adịghị eme nke ọma n’ebe ahụ, ndị bikwa na ya na-akụ ihe ubi nile: ikuku ya na-adị nnọọ mma maka ụdị dị iche iche nke ihe ọkụkụ. . . . Ọ bụghị nanị na ọ na-emepụta ụdị mkpụrụ osisi dị iche iche n’ụzọ na-atụ n’anya; ọ na-emepụta ha n’akwụsịghị akwụsị. . . . Otu mmiri iyi nke nwere ikike dị ukwuu nke ime ka ala na-eme nri na-ede ya.”

Otú a ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ Josephus si kọwaa ala dị larịị nwere akụkụ atọ n’ebe ngwụsị nke ebe ugwu ọwụwa anyanwụ nke ihe a mazuuru dị ka Osimiri Galili. Foto ndị dị n’elu pụrụ ime ka ị ghọtatụ otú ala nke a dị larịị si bụrụ ebe na-emepụta nri, bụ́ otu n’ime ndị kasị na-emepụta nri na Galili.a Ebe nke a pụtara ìhè nke ukwuu n’oge ochie nke na onye so dee Oziọma ndị ahụ bụ Luk kpọrọ mmiri oké osimiri dị mma ọṅụṅụ nke dị ya n’akụkụ “ọdọ mmiri Genesaret.”—Luk 5:1.

O jiri okwu ahụ mee ihe mgbe ọ na-akọ na Jisọs bịara n’ebe nke a wee hụ ndị ikom anọ ghọrọ ndị ozi. Hà bụbu ndị ọrụ ugbo na-ekpori ndụ n’ala ahụ na-eme nri, na-akọpụta grape, mkpụrụ osisi walnut, olive, ma ọ bụ fig? Ee e. Ihe ọkụkụ ndị ahụ jupụtara n’Ala Dị Larịị nke Genesaret, ma ndị ikom ndị a bụ ndị ọkụ azụ, ọ dịkwa mfe ịghọta ihe mere ha ji dị otú ahụ.

O yiri ka mmiri iyi ndị dị n’ala ahụ dị larịị na-eburu ahịhịa ndị pụrụ ịghọrọ azụ ihe oriri gaa n’osimiri ahụ. Ya mere mmiri ahụ jupụtara n’ụdị dị iche iche nke azụ, na-eme ka e nwee ọrụ butụrụ ibu nke ịkụ azụ. Pita na Andru bụ ndị ji ịkụ azụ mere ọrụ n’ebe ahụ, dị ka ọ dịkwa Jemes na Jọn, bụ́ ụmụ onye ọkụ azụ bụ Zebedi.—Matiu 4:18-22; Luk 5:2-11.

Mgbe mgbe a na-akụ azụ site n’isi n’ụgbọ mmiri wụpụ ụgbụ. Ọ bụ ihe Pita na Andru na-eme mgbe Jisọs bịarutere. A gbasara otu ogologo ụgbụ n’ụzọ fọrọ nke nta ka ọ dị okirikiri. Ihe ndị na-ese n’elu mmiri e ji osisi mee na-eme ka ebe elu ya ghara imikpu ná mmiri, ebe ihe ndị dị arọ n’akụkụ ala ya na-eme ka ụgbụ ahụ gbatịrị ruo n’ala mmiri. A pụrụ ijide ọnụ ọgụgụ azụ dị ukwuu n’ụgbụ dị otú ahụ. Mgbe ahụ a na-akpụrụ ya banye n’ime ụgbọ mmiri ma ọ bụ dọrọ ya gaa n’ebe mmiri na-emighị emi, ka e wee wụpụta ihe dị n’ime ya n’ala akọrọ dị n’ụsọ mmiri. A ga-ahọpụta azụ ndị dị mma oriri site ná ndị na-adịghị mma. Rịba ama ezi nkọwa zuru ezu e nyere na Luk 5:4-7 na Jọn 21:6-11. Ị̀ na-echeta na Jisọs kpọtụrụ ụzọ nke a nke ịkụ azụ uche n’ihe atụ ya nke oké ụgbụ? (Matiu 13:47, 48) Ọzọkwa, Matiu 4:21 na-eme ka ọ pụta ìhè na ọtụtụ mgbe ọ na-adị mkpa ka ndị ọkụ azụ tinye oge dị ukwuu n’idozi ụgbụ ha ndị oké nkume ma ọ bụ azụ dọkara.

Ọ bụrụ na i mee njem gabiga ụsọ mmiri nke a nke Genesaret, ị pụrụ ịhụ ebe ole na ole ebe ndị a sịrị na ihe ndị mere n’oge ije ozi Jisọs weere ọnọdụ. Otu bụ ugwu nke ahịhịa ndị na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ jupụtara nke ọ bụ n’elu ya, dị ka omenala si na-ekwu, ka Jisọs nọ nye Ozizi Elu Ugwu ya. Ebe nke a adịghị emegide ihe ndekọ nile nke Oziọma ahụ, n’ihi na Jisọs nọ nso Ala Dị Larịị nke Genesaret mgbe ọ na-ezi ozizi ahụ.—Matiu 5:1–7:29; Luk 6:17–7:1.

Ebe ọzọ nke a sịrị na otu ihe mere na ya ekwekọghị n’eziokwu ndị Bible dekọrọ. Ị ga-ahụ otu ụlọ chọọchị nke a sịrị na e wuru n’ebe Jisọs ji ogbe achịcha asaa na azụ ole na ole zụọ 4,000 mmadụ. (Matiu 15:32-38; Mak 8:1-9) Kama ikwu na nke a mere n’Ala Dị Larịị nke Genesaret, ihe ndekọ Mak na-ehota “ókèala Dekapọlis,” bụ́ nke dị anya ihe karịrị kilomita 11 n’ofe nke ọzọ nke osimiri ahụ.—Mak 7:31.

Matiu na Mak kwuru na mgbe ọ rụsịrị ọrụ ebube nke a, Jisọs ji ụgbọ mmiri gaa Magadan ma ọ bụ Dalmanuta. (Matiu 15:39; Mak 8:10) Ndị ọkà mmụta na-ejikọ ókèala nke a na Magdala (Migdal), nke dị nnọọ n’ebe ndịda nke Ala Dị Larịị nke Genesaret ná ncherịta ihu Taịbirịas. Dị ka akwụkwọ The Macmillan Bible Atlas si kwuo, Magadan bụ nke “a ma ama n’ihi oké ụlọ ọrụ ya nke na-emezi azụ.” Azụ a na-egbute n’ụba n’akụkụ nke a nke ọdọ mmiri ahụ n’ezie pụrụ ime ka o kwe omume inwe ụlọ ọrụ dị otú ahụ nke na-enye uru.

Ọ dị mma ịmara na ụkọ mmiri ozuzo e nwere na 1985 na 1986 mere ka ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị elu nke mmiri e nwere n’Osimiri Galili talata, na-ekpughepụ ogologo ala mmiri nke ọdọ mmiri ahụ. Ná nso Ala Dị Larịị nke Genesaret, ndị ikom abụọ hụrụ iberibe otu ụgbọ mmiri oge ochie. Ndị ọkà banyere ihe ndị mgbe ochie gbalịrị nwetaghachi ụgbọ mmiri nke a e ji osisi mee bụ́ nke e ji akụ azụ nke e wuru ihe dị ka n’oge mgbe Jisọs letara Ọdọ Mmiri na Ala Dị Larịị nke Genesaret.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Lee foto nke ka ibu tụrụ àgwà na 1992 Calendar of Jehovah’s Witnesses.

[Ebe E Si Nweta Foto Ndi Dị na peeji 24]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est

[Ebe E Si Nweta Foto Ndi Dị na peeji 24]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est

[Ebe E Si Nweta Foto Ndi Dị na peeji 25]

Garo Nalbandian

[Ebe E Si Nweta Foto Ndi Dị na peeji 25]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya