Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 6/15 p. 12-17
  • Ije Ozi Dị Ka Ndị Ọkụ Na-akụta Mmadụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ije Ozi Dị Ka Ndị Ọkụ Na-akụta Mmadụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ‘Ịnwụta Ndị Mmadụ ná Ndụ’
  • Ndị Na-akụta Mmadụ
  • Ịkụ Azụ n’Osimiri nke Ihe A Kpọrọ Mmadụ
  • Ịkụta Ndị Mmadụ “n’Ụbọchị Onyenwe Anyị”
  • Jizọs Akpọọ Mmadụ Anọ Ka Ha Bụrụ Ndị Na-akụta Mmadụ
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • A Kpọrọ Ndị Na-eso Ụzọ Anọ
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Ịkụta Mmadụ ná Mmiri Ụwa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Ịkụ Azụ̀ n’Oké Osimiri Galili
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 6/15 p. 12-17

Ije Ozi Dị Ka Ndị Ọkụ Na-akụta Mmadụ

“Jisọs wee sị Saịmọn, Atụla egwu; site n’ugbu a ị ga na-anwụta mmadụ ná ndụ.”—LUK 5:10.

1, 2. (a) Òkè dị aṅaa ka ịkụ azụ kereworo n’akụkọ ihe mere eme nke ihe a kpọrọ mmadụ? (b) Ụdị ịkụ azụ ọhụrụ dị aṅaa ka a malitere n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 2,000 afọ gara aga?

RUO ọtụtụ puku afọ, ụmụ mmadụ akụwo azụ maka nri n’oké osimiri, ọdọ mmiri, na osimiri nta dị iche iche nke ụwa. Azụ sitere na Naịl bụ akụkụ dị mkpa nke ihe oriri n’Ijipt oge ochie. Mgbe e mere ka mmiri Naịl ghọọ ọbara n’oge Mosis, ndị Ijipt tara ahụhụ ọ bụghị nanị n’ihi na ọ kpatara ụkọ mmiri kamakwa n’ihi na azụ dị na ya nwụsịrị, na-emetụta ebe ha si enweta nri. E mesịa, na Saịnaị, mgbe Jehova nyere Israel Iwu, ọ gwara ha na a pụrụ iri ụdị azụ ụfọdụ ma na ndị ọzọ adịghị ọcha, a gaghị eri ha eri. Nke a gosipụtara na ndị Israel ga-eri azụ mgbe ha batara n’Ala Nkwa ahụ, ya mere ụfọdụ n’ime ha ga-abụ ndị ọkụ azụ.—Ọpụpụ 7:20, 21, Levitikọs 11:9-12.

2 Otú ọ dị, n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 2,000 afọ gara aga, a kụziiri ihe a kpọrọ mmadụ ụdị ọzọ nke ịkụ azụ. Nke a bụ ụdị ịkụ azụ ime mmụọ nke ga-ewetara ọ bụghị nanị ndị ọkụ azụ abamuru kamakwa azụ ndị ahụ! Ụdị ịkụ azụ nke a ka na-agakwa n’ihu taa, na-ewetara ọtụtụ nde ụmụ mmadụ gburugburu ụwa uru dị ukwuu.

‘Ịnwụta Ndị Mmadụ ná Ndụ’

3, 4. Olee ndị ọkụ azụ abụọ gosipụtara oké mmasị n’ebe Jisọs Kraịst nọ?

3 N’afọ 29 O.A., e mere Jisọs, bụ́ Onye gaje ịmalite ụdị ọhụrụ nke a nke ịkụ azụ baptism site n’aka Jọn Onye Na-eme Baptism. Mgbe izu ole na ole gasịrị, Jọn gosiri mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya Jisọs wee kwuo, sị: “Lee, Nwa Atụrụ Chineke!” Otu n’ime ndị a na-eso ụzọ, nke aha ya bụ Andru, mere ngwa ngwa gwa nwanne ya nwoke bụ́ Saịmọn Pita, sị: “Anyị ahụwo Mesaịa anyị”! Ọ bụ ihe na-akpali mmasị ịmara na ma Andru ma Saịmọn bụ ndị ji ịkụ azụ mere ọrụ.—Jọn 1:35, 36, 40, 41; Matiu 4:18.

4 Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, Jisọs na-ekwusara ìgwè mmadụ zukọrọ n’akụkụ Osimiri Galili ozi ọma, bụ́ ebe na-adịghị anya site n’ebe Pita na Andru bi. Ọ na-agwa ndị ahụ, sị: “Chegharịanụ; n’ihi na alaeze eluigwe dị nso.” (Matiu 4:13, 17) Anyị pụrụ ikwu na Pita na Andru nwere ịnụ ọkụ n’obi ịnụ ozi ya. Otú ọ dị, o yiri ka ọ bụ na ha amataghị na Jisọs gaje ịgwa ha ihe ga-agbanwe ndụ ha ruo mgbe ebighị ebi. Ọzọkwa, ihe Jisọs gaje ikwu ma mee n’ihu ha nwere ihe ọ pụtara nke dị mkpa nye anyị nile taa.

5. Olee ụzọ onye ọkụ azụ ahụ bụ́ Pita si nwee ike ijere Jisọs ozi?

5 Anyị na-agụ, sị: “O ruo, mgbe ìgwè mmadụ na-adagide ya na-anụkwa okwu Chineke, na ya onwe ya na-eguzo n’ụsọ ọdọ mmiri Genesaret; o wee hụ ụgbọ abụọ ka ha guzoro n’ụsọ ọdọ mmiri ahụ: ma ndị ọkụ esiworị n’ime ha pụọ, ha na-asakwa ihe ha ji egbu azụ.” (Luk 5:1, 2) Laa azụ n’oge ahụ, ndị ji ịkụ azụ mere ọrụ na-arụ ọrụ n’abalị, ndị ikom ndị a na-asachakwa ụgbụ ha ji kụọ azụ n’abalị. Jisọs kpebiri iji otu n’ime ụgbọ ha mee nkwusa dị irè karị nye ìgwè mmadụ ahụ. “O wee baa n’otu n’ime ụgbọ abụọ ahụ, nke bụ nke Saịmọn, wee kpeere ya ka o si n’ala nupụ nke nta. O wee nọdụ, si n’ụgbọ na-ezi ìgwè mmadụ nile ihe.”—Luk 5:3.

6, 7. Ọrụ ebube dị aṅaa metụtara ịkụ azụ ka Jisọs rụrụ, na-eduga n’ikwu ihe dị aṅaa banyere ịkụ azụ?

6 Rịba ama na Jisọs bu ihe karịrị izi ìgwè mmadụ ahụ ihe n’uche: “Mgbe o kwubiri okwu, ọ sị Saịmọn, Nupụ n’ogbu mmiri, wụnyenụ ihe unu ji egbu azụ ka unu gbuo azụ.” Cheta, ndị ọkụ azụ ndi a anọwo na-arụ ọrụ n’anyasị dum. Ọ bụghị ihe ijuanya na Pita zaghachiri, sị: “Nna anyị, anyị dọgburu onwe anyị n’ọrụ ogologo abalị a dum, ma anyị egbuteghị ihe ọ bụla: ma n’okwu gị m ga-awụnye ihe e ji egbu azụ.” Gịnị mere mgbe ha mere nke a? “Ha wee nwụta oké ìgwè azụ; ihe ha e ji egbu azụ wee na-adọka; ha wee feere ndị nketa ibe ha aka, bụ́ ndị nọ n’ụgbọ ha ọzọ, ka ha bịa nyere ha aka. Ha wee bịa, gbujuo ụgbọ abụọ ahụ, ya mere ha malitere imikpu.”—Luk 5:4-7.

7 Jisọs arụwo ọrụ ebube. Ogologo osimiri ahụ abụrụwo nke azụ na-adịghị na ya n’abalị dum; ugbu a o jupụtara n’azụ. Ọrụ ebube nke a nwere mmetụta dị ike n’ahụ Pita. “Saịmọn Pita . . . wee daa n’ala n’ikpere Jisọs, sị, Si n’ebe m nọ pụọ; n’ihi na abụ m onye mmehie, Onyenwe anyị. N’ihi na ibubo ogbugbu azụ ha gburu nwụrụ ya na ndị nile ya na ha nọ n’ahụ; otú ahụ ka ibubo nwụkwara Jemes na Jọn, ụmụ Zebedi, n’ahụ, ndị ha na Saịmọn bụ ndị nnwekọ.” Jisọs mere ka obi dajụọ Pita wee kwuo okwu ndị ahụ nke gaje ịgbanwe ndụ Pita. “Atụla egwu; site n’ugbu a ị ga na-anwụta mmadụ ná ndụ.”—Luk 5:8-10.

Ndị Na-akụta Mmadụ

8. Olee ụzọ mmadụ anọ ji ịkụ azụ mere aka ọrụ si zaghachi n’ọkpụkpọ òkù ahụ nke ‘ịnwụta ndị mmadụ ná ndụ’?

8 Jisọs si otú a jiri ụmụ mmadụ tụnyere azụ, ọ kpọkwara onye ọkụ azụ nke a dị umeala n’obi òkù ịhapụ ọrụ ego ya maka ụdị ka nnọọ elu nke ịkụ azụ—ịkụta ụmụ mmadụ ná ndụ. Pita, na nwanne ya nwoke bụ́ Andru, nakweere ọkpụkpọ òkù ahụ. “Ngwa ngwa ha wee hapụ ihe nile ha ji egbu azụ, so ya.” (Matiu 4:18-20) Jisọs gara n’ihu ịkpọku Jemes na Jọn, bụ́ ndị nọ n’ụgbọ ha, na-edozi ụgbụ ha. Ọ kpọkwara ndị a òkù ịghọ ndị ọkụ na-akụta mmadụ. Olee otú ha si zaghachi? “Ngwa ngwa ha wee hapụ ụgbọ ahụ na nna ha, so ya.” (Matiu 4:21, 22) Jisọs gosipụtara nkà dị ka onye ọkụ na-akụta mkpụrụ obi. N’oge nke a ọ nwụtara ndị ikom anọ ná ndụ.

9, 10. Okwukwe dị aṅaa ka Pita na ndị enyi ya gosipụtara, oleekwa ụzọ e si nye ha ọzụzụ n’ịkụ azụ ime mmụọ?

9 Onye ji ịkụ azụ mere ọrụ na-enweta ihe o ji ebi ndụ site n’ire azụ o gbutere, ma onye ọkụ azụ ime mmụọ apụghị ime nke ahụ. Ya mere, ndị a na-eso ụzọ gosipụtara okwukwe dị ukwuu mgbe ha hapụrụ ihe nile iji wee soo Jisọs. Otú ọ dị, ha enweghị obi abụọ ọ bụla na ịkụ azụ ime mmụọ ha ga-enwe ihe ịga nke ọma. Jisọs enwewo ike ime ka mmiri azụ ọ bụla na-adịghị na ya jupụta n’azụ nkịtị. N’otu ụzọ ahụ, mgbe ha tụdara ụgbụ ha ná mmiri nile nke mba Israel, obi pụrụ isi ndị ahụ na-eso ụzọ ike na, site n’enyemaka Chineke, ha ga-anwụta ndị mmadụ ná ndụ. Ọrụ nke ịkụ azụ ime mmụọ nke malitere mgbe ahụ na-agakwa n’ihu, Jehova ka na-enyekwa owuwe ihe ubi bara ụba.

10 Ruo ihe karịrị afọ abụọ, ndị ahụ na-eso ụzọ natara ọzụzụ site n’aka Jisọs n’ụzọ e si akụta mmadụ. N’otu oge, o ji nlezianya nye ha ntụziaka dị iche iche wee zipụ ha n’ihu ya onwe ya ime nkwusa. (Matiu 10:1-7; Luk 10:1-11) Mgbe a raara Jisọs nye ma gbuo ya, ndị na-eso ụzọ ya nwere mgbagwoju anya. Ma ọnwụ Jisọs ọ̀ pụtara na a gaghị akụtakwa ndị mmadụ dị ka azụ? Ihe ndị merenụ nyere azịza ya n’oge na-adịghị anya.

Ịkụ Azụ n’Osimiri nke Ihe A Kpọrọ Mmadụ

11, 12. Mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ, ọrụ ebube dị aṅaa ka Jisọs rụrụ nke metụtara ịkụ azụ?

11 N’oge dị mkpirikpi mgbe ọnwụ Jisọs ná mpụga Jerusalem na mbilite n’ọnwụ ya gasịrị, ndị ahụ na-eso ụzọ laghachiri Galili. N’otu oge, asaa n’ime ha nọkọrọ ọnụ ná nso Osimiri Galili. Pita sịrị na ya na-aga igbu azụ, ndị ọzọ sonyekwaara ya. Dị ka ha na-emekarị, ha kụrụ azụ n’anyasị. N’ezie, ha wụnyere ụgbụ ha n’ime osimiri n’abalị dum n’egbuteghị ihe ọ bụla. E mesịa, mgbe chi bọrọ, otu onyinyo dị ka mmadụ nke a hụrụ ka ọ na-eguzo n’ụsọ osimiri ahụ kpọkuru ha n’ofe mmiri ahụ, sị: “Ụmụntakịrị, ùnu ji ihe oriri ọ bụla?” Ndị ahụ na-eso ụzọ zaghachiri, sị: “Ee e!” Ya mere onye ahụ nke na-eguzo n’ụsọ osimiri gwara ha, sị: “Wụnyenụ ihe unu ji egbu azụ n’akụkụ aka nri nke ụgbọ, unu ga-ahụkwa. Ya mere ha wụnyere ya, ma ugbu a ha enweghị ike ịdọ ya n’ihi ọtụtụ azụ dị ya.”—Jọn 21:5, 6.

12 Lee ahụmahụ na-eju anya nke a bụ! Ma eleghị anya ndị ahụ na-eso ụzọ chetara ọrụ ebube mbụ ahụ nke metụtara ịkụ azụ, ma ọ dịkarịa ala otu n’ime ha matara onye onyinyo ahụ dị ka mmadụ nke dị n’ụsọ osimiri ahụ bụ. “Onye ahụ nke na-eso ụzọ ya onye Jisọs hụrụ n’anya sịrị Pita, Ọ bụ Onyenwe anyị. Ya mere mgbe Saịmọn Pita nụrụ na ọ bụ Onyenwe anyị, o gbokwasị uwe ukwu ya, (n’ihi na ọ gbara ọtọ), wee tụba onwe ya n’ime oké osimiri. Ma ndị ọzọ ndị na-eso ụzọ bịara n’ụgbọ nta ha (n’ihi na ha anọghị nebe dị anya n’ala, kama ihe hà ka [narị cubit abụọ]).”—Jọn 21:7, 8.

13. Mgbe Jisọs rịgosịrị n’eluigwe, usoro ihe omume ịkụ azụ dị aṅaa nke zuru ụwa ọnụ ka a malitere?

13 Olee ihe ọrụ ebube nke a na-egosi? Na ọrụ nke ịkụta ndị mmadụ agwụsịbeghị. E mesiri eziokwu nke a ike mgbe Jisọs gara n’ihu ugbo atọ ịgwa Pita—sitekwa na ya gwa ndị ahụ dum na-eso ụzọ—inye atụrụ Jisọs nri. (Jọn 21:15-17) Ee, usoro ihe omume nke inye nri ime mmụọ dị n’ihu. Tupu ọnwụ ya, o buwo amụma, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile.” (Matiu 24:14) Ugbu a oge eruwo ka mmezu narị afọ mbụ nke amụma ahụ malite. Ndị na-eso ụzọ ya na-achọ ịtụda ụgbụ ha n’ime osimiri nke ihe a kpọrọ mmadụ, ụgbụ ndị ahụ agaghịkwa agba aka mgbe a ga-eselite ha.—Matiu 28:19, 20.

14. N’ụzọ dị aṅaa ka e si gọzie ịkụ azụ nke ndị na-eso ụzọ Jisọs n’afọ ndị ahụ tupu mbibi nke Jerusalem?

14 Tupu ọ rịgoro n’ocheeze Nna ya n’eluigwe, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu ga-anata ike, mgbe mmụọ nsọ ga-abịakwasịworị unu: unu ga-abụkwa ndị àmà m n’ime Jerusalem, na n’ime Judia na Sameria nile, ruokwa ebe ụwa sọtụrụ.” (Ọrụ 1:8) Mgbe a wụpụrụ mmụọ nsọ n’isi ndị ahụ na-eso ụzọ na Pentikọst 33 O.A., oké ọrụ ahụ nke ịkụ azụ ime mmụọ malitere n’ụzọ zuru ụwa ọnụ. N’ụbọchị Pentikọst nanị, a nwụtara puku mkpụrụ obi atọ ná ndụ, ngwa ngwa mgbe nke ahụ gasịkwara, “ọnụ ọgụgụ ndị ikom ahụ wee ruo ihe hà ka [puku ise].” (Ọrụ 2:41; 4:4) Mmụba ahụ nọgidere na-aga n’ihu. Ihe ndekọ ahụ na-agwa anyị, sị: “E wee tụkwasị karị nye Onyenwe anyị ndị kwere na ya, ìgwè mmadụ ma ndị ikom ma ndị inyom.” (Ọrụ 5:14) Ngwa ngwa, ndị Sameria nakweere ozi ọma ahụ, n’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịkwara, ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù mere otú ahụ. (Ọrụ 8:4-8; 10:24, 44-48) Ihe dị ka 27 afọ mgbe Pentikọst gasịrị, Pọl onyeozi degaara ndị Kraịst bụ́ ndị Kọlọsi akwụkwọ na ozi ọma ahụ abụrụwo nke “e kwusara n’etiti ihe nile e kere eke nke dị n’okpuru eluigwe.” (Ndị Kọlọsi 1:23) N’ụzọ doro anya, ndị na-eso ụzọ Jisọs akụwo azụ n’ebe dị anya site ná mmiri nile nke Galili. Ha atụdawo ụgbụ ha n’etiti ndị Juu gbasasịrị gburugburu Alaeze Ukwu Rom, nakwa n’osimiri nile yiri ka ọ bụ na ọ dịghị ihe dị na ha nke ndị na-abụghị ndị Juu. Ụgbụ ha nile jukwara eju mgbe e selitere ha. Maka mkpa nile nke ndị Kraịst narị afọ mbụ ahụ, e mezuru amụma Jisọs buru na Matiu 24:14 tupu e bibie Jerusalem n’afọ 70 O.A.

Ịkụta Ndị Mmadụ “n’Ụbọchị Onyenwe Anyị”

15. N’akwụkwọ Mkpughe, ọrụ ịkụ azụ ọzọ dị aṅaa ka e buru amụma ya, oleekwa mgbe a ga-arụ ya?

15 Otú ọ dị, ọtụtụ ka dị n’ihu. Ná nso ọgwụgwụ nke narị afọ mbụ, Jehova nyere onyeozi ikpeazụ nke ka dị ndụ, bụ́ Jọn, mkpughe nke ihe ndị gaje ime “n’ụbọchị Onyenwe anyị.” (Mkpughe 1:1, 10) Otu ihe pụtara ìhè gaje ịbụ ịkọ banyere ozi ọma n’ụwa nile. Anyị na-agụ, sị: “M wee hụ mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-efe n’etiti eluigwe, na-enwe ozi ọma ebighị ebi izisara ndị na-anọdụ n’elu ụwa, bụ́ mba nile ọ bụla na ebo nile ọ bụla na asụsụ nile ọ bụla na ndị nile ọ bụla.” (Mkpughe 14:6) N’okpuru nduzi nke ndị mmụọ ozi, ndị na-ejere Chineke ozi ga-ekwusa ozi ọma ahụ n’ụzọ a na-ahụ anya n’elu ụwa dum mmadụ bi, ọ bụghị nanị na gburugburu Alaeze Ukwu Rom. A gaje ịmalite ọrụ zuru ụwa ọnụ nke ịkụta mkpụrụ obi dị ka azụ, oge anyị a ahụwokwa mmezu nke ọhụụ ahụ.

16, 17. Olee mgbe ọrụ ịkụ azụ ime mmụọ nke oge ikpeazụ a malitere, oleekwa ụzọ Jehova siworo gọzie ya?

16 Olee otú ịkụ azụ ahụ siworo na-aga na narị afọ nke 20 nke a? Ná mmalite, ndị ọkụ azụ ahụ dị ole na ole n’ọnụ ọgụgụ. Mgbe Agha Ụwa Mbụ bisịrị, e nwere nanị ihe dị ka puku ndị nkwusa ozi ọma anọ na-arụsi ọrụ ike, bụ́ ndị ikom na ndị inyom na-anụ ọkụ n’obi nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha bụ ndị e tere mmanụ. Ha wụnyere ụgbụ ha n’ebe ọ bụla Jehova meghere ụzọ, a nwụtakwara ọtụtụ mkpụrụ obi ná ndụ. Mgbe agha ụwa nke abụọ bisịkwara, Jehova meghere mmiri ndị ọhụrụ maka ịkụ azụ. Ndị ozi ala ọzọ jeworo Watchtower Bible School of Gilead malitere ọrụ ahụ n’ọtụtụ ala. Mba ndị dị ka Japan, Itali, na Spain, bụ́ ndị ọ pụrụ ịbụ na ha yiri nnọọ ebe ihe na-adịghị na mbụ, mesịrị nye owuwe ihe ubi bara ụba nke mkpụrụ obi. N’isi nso a, anyị ahụwo otú ịkụ azụ ahụ si enwe ihe ịga nke ọma n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe.

17 Taa, n’ọtụtụ mba ụgbụ ndị ahụ na-achọ ịdọkasị. Oké owuwe ihe ubi nke mkpụrụ obi emewo ka ọ dị mkpa ịhazi ọgbakọ na sekit ndị ọhụrụ. Iji mee ka ihe ndị a kwe omume, a na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze na Ụlọ Mgbakọ ndị ọhụrụ n’oge nile. A chọkwuru ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi ilekọta mmụba ahụ. A malitewo oké ọrụ site n’aka ndị ahụ kwesịrị ntụkwasị obi laa azụ na 1919. N’ụzọ nkịtị, e mezuwo Aịsaịa 60:22. ‘Onye nta aghọwo ọtụtụ puku,’ ebe puku ndị ọkụ azụ anọ ahụ ghọworo ihe karịrị nde mmadụ anọ taa. Ọgwụgwụ ahụ akabịabeghị.

18. Olee ụzọ anyị pụrụ isi ṅomie ezi ihe nlereanya nke ndị ọkụ azụ ime mmụọ nke narị afọ mbụ?

18 Olee ihe ihe ndị a dum pụtara nye anyị n’otu n’otu? Akụkụ akwụkwọ nsọ na-asị na mgbe a kpọrọ Pita, Andru, Jemes, na Jọn òkù ịghọ ndị na-akụta mmadụ, “Ha wee hapụ ihe nile, so [Jisọs].” (Luk 5:11) Lee aha ezi ihe nlereanya nke okwukwe na nraranye ha setịpụrụ! Ànyị pụrụ ịzụlite otu ụdị mmụọ ahụ nke ịchụ onwe onye n’àjà, otu ịdị njikere ahụ ijere Jehova ozi n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu? Ọtụtụ nde ndị mmadụ azawo na ha pụrụ. Na narị afọ mbụ, ndị ahụ na-eso ụzọ kụtara ndị mmadụ n’ebe ọ bụla Jehova mere ka o kwe omume. Ma ọ̀ bụ n’etiti ndị Juu ma ọ bụ ndị Jentaịl, ha jiri obi ha nile kụọ azụ. Ka anyị kwusaara onye ọ bụla ozi ọma n’enweghị ihe mgbochi ma ọ bụ ịkpọasị ọ bụla.

19. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na mmiri ebe anyị na-akụ azụ eyighị nke na-amịpụta mkpụrụ?

19 Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na ókèala gị eyie nke na-adịghị amịpụta mkpụrụ n’oge a? Enwela nkụda mmụọ. Cheta, Jisọs mere ka ụgbụ ndị ahụ na-eso ụzọ jupụta mgbe ha kụworo azụ n’abalị dum n’enwetaghị ihe ọ bụla. Otu ihe ahụ pụrụ ime n’ụzọ ime mmụọ. Dị ka ihe atụ, n’Ireland, Ndịàmà kwesịrị ntụkwasị obi rụsiri ọrụ ike ruo ọtụtụ afọ na-enwe nanị ihe ịga nke ọma dị nta. Ma n’oge na-adịghị anya nke ahụ gbanwere. Akwụkwọ 1991 Yearbook of Jehovah’s Witnesses na-akọ na ka ọ na-erule n’ọgwụgwụ afọ ije ozi 1990, Ireland enwewo 29 ọnụ ọgụgụ kasị elu na nsochi nsochi! Ma eleghị anya ókèala gị ga-amị mkpụrụ n’otu aka ahụ otu ụbọchị. Ruo ogologo oge Jehova nyere ohere ya, nọgide na-akụ azụ!

20. Olee mgbe anyị kwesịrị ikere òkè n’ịkụta ndị mmadụ?

20 N’Israel, ndị ọkụ azụ na-aga ịkụ azụ n’abalị, mgbe onye ọ bụla ọzọ na-enwe ahụ ikpo ọkụ na ntụsara ahụ n’elu àkwà ndina ha. Ha na-apụ, ọ bụghị mgbe ọ dịịrị ha mma, kama mgbe ha pụrụ igbute ọnụ ọgụgụ azụ kasị ukwuu. Anyị onwe anyị kwesịkwara ịmụ otú ókèala anyi dị, ka anyị wee nwee ike ịga gbuo azụ, dị ka a pụrụ ikwu ya, mgbe ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ nọ n’ụlọ ma na-egekwa ntị. Nke a pụrụ ịbụ n’oge mgbede, ná ngwụcha izu, ma ọ bụ n’oge ọzọ. Mgbe ọ bụla ọ bụ, ka anyị mee ihe nile anyị pụrụ ime iji chọta ndị obi ha ziri ezi.

21. Gịnị ka anyị kwesịrị icheta ma ọ bụrụ na a na-arụ ọrụ n’ókèala anyị mgbe nile?

21 Gịnị ma ọ bụrụ na a na-arụzu ókèala anyị mgbe nile? Ndị ji ọrụ ịkụ azụ mere ọrụ n’ụwa na-emekarị mkpesa na e gbuwo azụ gabiga ókè n’ebe ndị ha na-akụ azụ. Ma à pụrụ igbubiga azụ ókè n’ebe ndị anyị na-akụ azụ n’ụzọ ime mmụọ? Ee e ma ọlị! Ọtụtụ ókèala na-enwe mmụba ọbụna mgbe a na-arụzu ya mgbe nile. Ụfọdụ na-amịpụta mkpụrụ nke ọma karị n’ihi na a na-arụ ọrụ na ya nke ọma. Ka o sina dị, mgbe a na-aga n’ebe obibi dị iche iche ọtụtụ ugbo, jide n’aka na a rịbara ebe nile ndị mmadụ na-anọghị n’ụlọ ama ma jee na ha ma e mesịa. Mụọ ụdị isiokwu dị iche iche maka nkwurịta okwu. Buru n’uche na onye ọzọ ga-abịakwa n’oge na-adịghị anya, ya mere anọtela aka n’ọbịbịa gị ma ọ bụ na-ekwugide onye nwe ụlọ n’amaghị ama. Zụlitekwa nkà gị n’ọrụ okporo ụzọ na ịgba àmà mberede. Tụda ụgbụ ime mmụọ gị nile n’oge ọ bụla n’ụzọ ọ bụla o kwere mee.

22. Oké ihe ùgwù dị aṅaa ka anyị nwere n’oge a?

22 Cheta, n’ịkụ azụ nke a ma ndị ọkụ azụ ma azụ ahụ na-erite uru. Ọ bụrụkwa na ndị anyị kụtara anọgide, ha pụrụ ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Pọl gbara Timoti ume, sị: “Na-anọgide n’ihe ndị a; n’ihi na n’ime nke a ị ga-azọpụta onwe gị zọpụtakwa ndị na-anụ olu gị.” (1 Timoti 4:16) Ọ bụ Jisọs malitere inye ndị na-eso ụzọ ya ọzụzụ n’ịkụ azụ ime mmụọ, a ka na-arụkwa ọrụ nke a n’okpuru nduzi ya. (Tụlee Mkpughe 14:14-16.) Lee oké ihe ùgwù anyị nwere ịrụ ọrụ n’okpuru ya n’imezu ya! Ka anyị nọgide na-atụda ụgbụ anyị ruo ogologo oge Jehova nyere ohere ya. Olee ọrụ ka ukwuu a pụrụ ịrụ nke karịrị ịkụta mkpụrụ obi ná ndụ?

Ị̀ Pụrụ Icheta?

◻ Ọrụ dị aṅaa ka Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ọzụzụ ịrụ?

◻ Olee ụzọ Jisọs si gosi na ọrụ ịkụ azụ ime mmụọ agaghị akwụsị mgbe ọ nwụrụ?

◻ N’ụzọ dị aṅaa ka Jehova si gọzie ọrụ ịkụ azụ ime mmụọ na narị afọ mbụ?

◻ Owuwe ihe ubi dị aṅaa bara ụba nke azụ ka e gbuteworo “n’ụbọchị Onyenwe anyị”?

◻ Dị ka ndị mmadụ n’otu n’otu, olee ụzọ anyị pụrụ isi bụrụ ndị na-akụta mmadụ na-enwe ihe ịga nke ọma ọbụna karị?

[Foto dị na peeji nke 15]

Mgbe Jisọs bilitesịrị n’ọnwụ, ndị ozi ya mere ka ọrụ Chineke ahụ nke ịkụta ndị mmadụ saa mbara

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya