Isi 22
A Kpọrọ Ndị Na-eso Ụzọ Anọ
MGBE mgbalị e mere igbu Jisọs n’obodo ya bụ Nazaret gasịrị, ọ gara n’obodo Kapanaum nke dị nso n’Osimiri Galili. Nke a mezuru amụma ọzọ nke Aịsaịa. Ọ bụ nke buru amụma na ndị Galili ndị bi n’ụsọ oké osimiri ga-ahụ oké ìhè.
Ka Jisọs na-aga n’ihu n’ọrụ ya na-enye ìhè nke ikwusa Alaeze ahụ n’ebe a, ọ chọtara anọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya. Ndị a adịlarị mbụ soro ya jegharịa, ma laghachi n’ọrụ ịkụ azụ ha mgbe ha sooro Jisọs si Judia lọta. Ọ ga-abụworị na ọ bụ Jisọs chọọrọ ha jee na nke ugbu a, ebe ọ bụ na oge eruwo maka ịchọta ndị inye aka ga-anọgide anọgide, bụ́ ndị ọ ga-azụ ka ha gaa n’ihu n’ozi ahụ mgbe ya onwe ya lasịrị.
Ya mere, mgbe Jisọs na-agafe n’ụsọ oké osimiri ahụ, wee hụ Saịmọn Pita na ndị enyi ya ka ha na-asacha ụ̀gbụ́ ha, o jekwuuru ha. Ọ banyere n’ụgbọ Pita wee gwa ya ka o nupụ baa na mmiri. Mgbe ha gamitụrụ nke nta, Jisọs nọdụrụ ala n’ụgbọ ahụ wee malite izi ìgwè mmadụ ahụ ihe n’ụsọ oké osimiri.
Mgbe nke ahụ gasịrị, Jisọs wee sị Pita: “Nupụ [baa] n’ogbu mmiri, wụnyenụ ihe unu ji egbu azụ ka unu gbuo azụ.”
Pita zaghachiri sị, “Nna anyị, anyị dọgburu onwe anyị n’ọrụ ogologo abalị a dum, ma anyị egbuteghị ihe ọ bụla: ma n’okwu gị m ga-awụnye ihe e ji egbu azụ.”
Mgbe a wụnyere ụ̀gbụ́ ahụ, e jidere azụ dị ukwuu nke na ụ̀gbụ́ ahụ malitere ịdọkasị. Ngwa ngwa, ha wee feere ndị ọ́kụ̀ azụ ibe ha nọ n’otu ụgbọ dị nso aka ka ha bịa nyere ha aka. N’atụfughị oge, azụ jupụtara n’ụgbọ abụọ ahụ nke na ha malitere imikpu n’ime mmiri. Mgbe Pita hụrụ nke a, ọ daa n’ihu Jisọs wee sị: “Si n’ebe m nọ pụọ, n’ihi na abụ m onye mmehie, Onyenwe anyị.”
Jisọs zaghachiri sị, “Atụla egwu; site n’ugbu a ị ga na-anwụta mmadụ ná ndụ.”
Jisọs kpọkwara nwanne Pita bụ́ Andru. Ọ gwara ha sị, “Bịanụ soo m n’azụ, m ga-eme unu ndị ọ́kụ̀ na-akụta mmadụ.” A kpọkwara ndị ọ́kụ̀ azụ ibe ha bụ́ Jemes na Jọn ụmụ Zebedi otu òkù ahụ, ha zaghachikwara n’atụfughị oge. Ya mere, mmadụ anọ ndị a hapụrụ ọrụ ịkụ azụ ha wee ghọọ mmadụ anọ mbụ ndị na-esochi Jisọs anya mgbe nile. Luk 5:1-11; Matiu 4:13-22; Mak 1:16-20; Aịsaịa 9:1, 2.
▪ N’ihi gịnị ka Jisọs ji kpọọ ndị na-eso ụzọ ya ka ha soo ya n’azụ, ọ bụkwa ole ndị?
▪ Ọrụ ebube dị aṅaa tụrụ Pita egwu?
▪ Ọrụ ọ́kụ̀ dị aṅaa ka Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya ịrụ?