Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jy isi 22 p. 58-p. 59 para. 6
  • Jizọs Akpọọ Mmadụ Anọ Ka Ha Bụrụ Ndị Na-akụta Mmadụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jizọs Akpọọ Mmadụ Anọ Ka Ha Bụrụ Ndị Na-akụta Mmadụ
  • Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • A Kpọrọ Ndị Na-eso Ụzọ Anọ
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Ije Ozi Dị Ka Ndị Ọkụ Na-akụta Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Ọ Gbalịrị Ịkwụsị Ịtụ Ụjọ na Inwe Obi Abụọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • O Kweghị Ka Ụjọ na Obi Abụọ Mee Ka Ọ Kwụsị Iso Kraịst
    Ṅomie Okwukwe Ha
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
jy isi 22 p. 58-p. 59 para. 6
Ebe Jizọs na-agwa Pita, Andru, Jems, na Jọn okwu n’ụsọ Oké Osimiri Galili

ISI NKE 22

Jizọs Akpọọ Mmadụ Anọ Ka Ha Bụrụ Ndị Na-akụta Mmadụ

MATIU 4:13-22 MAK 1:16-20 LUK 5:1-11

  • JIZỌS AKPỌỌ NDỊ GA NA-ESO YA OGE NIILE

  • NDỊ ỌKỤ AZỤ̀ AGHỌỌ NDỊ NA-AKỤTA MMADỤ

Mgbe ndị Nazaret gbalịchara igbu Jizọs, ọ gawara obodo Kapaniọm nke dị nso n’Oké Osimiri Galili. A na-akpọkwa ebe ahụ “ọdọ mmiri Genesaret.” (Luk 5:1) Ihe a mezuru amụma e buru n’akwụkwọ Aịzaya na ndị Galili bi n’akụkụ oké osimiri ga-ahụ oké ìhè.—Aịzaya 9:1, 2.

Na Galili ebe a, Jizọs gara n’ihu na-ekwusa na “alaeze eluigwe eruwo nso.” (Matiu 4:17) Jizọs hụrụ mmadụ anọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya. Ha sobu Jizọs gaa ebe ụfọdụ ọ gara. Ma mgbe ha na ya sichara Judia lọta, ha bidoghachiri ọrụ ịkụ azụ̀ ha. (Jọn 1:35-42) Ma, oge eruola ugbu a ka ha sowe Jizọs mgbe niile ka o nwee ike inye ha ọzụzụ ga-enyere ha aka ịnọgide na-ezisa ozi ọma ma Jizọs laghachi eluigwe.

Ka Jizọs nọ na-aga n’ụsọ oké osimiri, ọ hụrụ Saịmọn Pita na nwanne ya nwoke bụ́ Andru, nakwa ụfọdụ ndị ya na ha na-arụ ọrụ ka ha na-asacha ụgbụ ha. Ọ gakwuuru ha, banye n’ụgbọ Pita, ma gwa ya ka ọ kwọrọ ụgbọ ahụ banye na mmiri. Mgbe ha gatụrụ obere, Jizọs nọdụrụ ala n’ụgbọ ahụ malite ịkụziri ìgwè mmadụ gbakọrọ n’ụsọ oké osimiri ahụ eziokwu banyere Alaeze Chineke.

Mgbe e mechara, Jizọs gwara Pita, sị: “Kwọrọ ụgbọ a banye n’ebe dị omimi, wụnyekwanụ ụgbụ unu ka unu wee gbute azụ̀.” Pita sịrị ya: “Onye ozizi, anyị dọgburu onwe anyị n’ọrụ abalị dum n’egbuteghị ihe ọ bụla, ma ebe i kwuru ya, aga m awụnye ụgbụ.”—Luk 5:4, 5.

Ebe Andru, Jems, na Jọn na-agbalị ka ha dọbata ụgbụ ha n’ime ụgbọ mmiri ha; Pita adaa n’ụkwụ Jizọs

Ha wụnyere ụgbụ ha ma gbute azụ̀ hiri nne nke na ụgbụ ha malitere ịdọka. Ozugbo ahụ, ha feere ndị ọkụ azụ̀ ibe ha nọ n’ụgbọ dị nso ebe ahụ aka ka ha bịa nyere ha aka. O teghị aka azụ̀ eju ụgbọ abụọ ahụ nke na ụgbọ ndị ahụ malitere imikpu ná mmiri. Mgbe Pita hụrụ ihe a, ọ dara n’ihu Jizọs ma sị ya: “Onyenwe anyị, si n’ebe m nọ pụọ, n’ihi na abụ m onye mmehie.” Jizọs sịrị ya: “Kwụsị ịtụ egwu. Site ugbu a gaa n’ihu, ị ga na-akụta ndị mmadụ ná ndụ.”—Luk 5:8, 10.

Jizọs gwara Pita na Andru sị: “Soronụ m, m ga-eme unu ndị na-akụta mmadụ.” (Matiu 4:19) Ọ kpọkwara ndị ọkụ azụ̀ abụọ ọzọ ka ha sowe ya. Ha bụ Jems na Jọn, ụmụ Zebedi. Ha abụọ sowekwara ya n’egbughị oge. Mmadụ anọ a hapụrụ ọrụ ịkụ azụ̀ ha na-arụ ma ghọọ ndị mbụ malitere iso Jizọs mgbe niile.

  • Olee ihe ndị ahụ Jizọs kpọrọ ka ha sowe ya mgbe niile na-arụ, oleekwa ndị ha bụ?

  • Olee ọrụ ebube menyere Pita ụjọ?

  • Olee ụdị ọrụ ịkụ azụ̀ mmadụ anọ ahụ na-eso ụzọ Jizọs ga na-arụzi?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya