Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 7/1 p. 21-23
  • Azara M Òkù n’Oge Owuwe Ihe Ubi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Azara M Òkù n’Oge Owuwe Ihe Ubi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịlụ Di na Ime Mkpapụ
  • Ịnakwere Eziokwu
  • Iwe Ihe Ubi na Cape Palmas
  • Na Lower Buchanan
  • Ihe Ùgwù na Nkwụghachi Ụgwọ Ndị Ọzọ
  • Ịzụlite Ụmụ Asatọ n’Ụzọ Jehova Na-eweta Ma Ihe Ịma Aka ma Ọṅụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • E Jikọọ Ezinụlọ Anyị Ọnụ n’Ikpeazụ!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Jehova Bụụrụ M Chineke nke Ezi Ịhụnanya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ihe Gafere Afọ 50 nke ‘Ịgabita’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 7/1 p. 21-23

Azara M Òkù n’Oge Owuwe Ihe Ubi

DỊ KA WINIFRED REMMIE SI KỌỌ

“OWUWE ihe ubi hiri nne n’ezie, ma ndị ọrụ dị ole na ole.” Inwe mmetụta dị omimi maka ndị a na-achụsa ma na-esogbu dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha kpaliri okwu ndị a nke Onyenwe anyị Jisọs. Enwewo m otu ụdị mmetụta nke a, eri 40 afọ gara aga, anọwo m na-agbalị ịza òkù nke Onyenwe anyị na-akpọ ịrụ ọrụ n’owuwe ihe ubi ya.—Matiu 9:36, 37.

A mụrụ m n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa n’ezinụlọ nke nwere ụmụ asaa, ha nile bụcha ụmụ nwanyị. Ndị mụrụ anyị dị nro, ma na-anọgidesi ike n’ihe ha kwuru; ha bụkwa ndị ji okpukpe kpọrọ ihe. Ije chọọchị na Sunday school kwa izu bụ nke a na-apụghị iji ihe ọzọ gbanwere. Nye m, nke a abụghị nsogbu n’ihi na ahụrụ m ihe ime mmụọ n’anya. N’ezie, n’oge m dị afọ 12, a họpụtara m iduzi klasị Sunday school.

Ịlụ Di na Ime Mkpapụ

Na 1941, n’oge m dị 23 afọ, alụrụ m Lichfield Remmie, bụ́ onye na-edekọ ọrụ a na-arụ n’ụlọ ọrụ gọọmentị dị n’aka ndị ọcha. N’ụzọ ihe onwunwe, anyị bara ọgaranya, ma ịhụnanya nke ime mkpapụ na ọchịchọ nke ịkpakọba akụ na ụba kpọgara anyị Liberia na 1944. Oge ime oké mgbanwe ná ndụ nke di m, na mgbe e mesịrị ná ndụ nke m, bịara na 1950 mgbe o zutere Hoyle Ervin, bụ́ onye ozi ala ọzọ nke Ndịàmà Jehova. Mgbe nanị izu atọ nke ọmụmụ ihe gasịrị, di m malitere ikere òkè n’ọrụ nkwusa.

Iwe were m mgbe di m kwụsịrị ije chọọchị. E kwuwerị, ọ bụ ezigbo onye Protestant na-ebu ọnụ ọbụna n’oge Lent. Mgbe mbụ m hụrụ ya ka o bu akpa n’aka na-apụ ije kwusaa ozi ọma, oké iwe were m. “Gịnị na-eme gị?” ka m jụrụ. “Onye a ma ama dị ka gị ịkpagharị na-ekwusa ozi ọma, gị na ndị nzuzu a!” Ọ nọdụrụ jụụ, gbakwa nkịtị n’oge nkatọ a nile.

N’echi ya, Nwanna Ervin bịara n’ụlọ anyị isoro Lichfield mụọ ihe. Dị ka ọ na-adịkarị, anọpụrụ m iche n’oge ọmụmụ ihe ahụ. Ma eleghị anya ọ bụ n’ihi nke a mere Nwanna Ervin ji jụọ m ma ọ̀ bụ na m amaghị ka e si agụ na ka e si ede. Maka gịnị? Ọ̀ bụ m ka ọ sịrị na ọ maghị ka e si agụ na ka e si ede? Lee aha mkparị nke ahụ bụ! M ga-egosi ya na m gụrụ akwụkwọ! M ga-ekpughe okpukpe ụgha nke a!

Ịnakwere Eziokwu

N’oge na-adịghị anya mgbe nke a gasịrị, ahụrụ m akwụkwọ ahụ bụ́ “Kwe Ka Chineke Buru Onye-Ezi-Okwu” n’elu table dị na palọ anyị. ‘Aha akwụkwọ nke na-atọ ọchị,’ ka m chere. ‘Chineke bụ onye eziokwu mgbe nile, ọ bụghị otú ahụ?’ Ka m na-asape ime akwụkwọ ahụ, ngwa ngwa ahụrụ m ihe mkpesa ọzọ. Ọ sịrị na mmadụ enweghị mkpụrụ obi, ọ bụ mkpụrụ obi! Ọbụna nkịta na nwamba bụ mkpụrụ obi! Nke a kpasuru m iwe n’ezie. ‘Lee aha nkụzi nzuzu nke a bụ!’ ka m chere.

Mgbe di m latara, eji m iwe gakwuru ya. “Ndị nduhie a sịrị na mmadụ enweghị mkpụrụ obi. Ha bụ ndị amụma ụgha!” Di m arụghị ụka ọ bụla; kama nke ahụ, o ji nwayọọ zaghachi, sị: “Winnie, ihe nile dị na Bible.” E mesịa, mgbe Nwanna Ervin jiri ndidi gosi m site na Bible nke m na anyị bụ mkpụrụ obi, na mkpụrụ obi na-anwụkwa anwụ, o juru m anya nke ukwu. (Ezikiel 18:4) Ihe kasị kpalie mmasị m bụ akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ dị na Jenesis 2:7, nke sịrị: “Mmadụ ahụ [Adam] wee ghọọ mkpụrụ obi dị ndụ.”

Lee ka ihe m chere siworo bụrụ nke na-ezighị ezi! Enwere m mmetụta nke onye ndị ụkọchukwu ghọgburu, ọ dịghịkwa mgbe m jere chọọchị ọzọ. Kama nke ahụ, amalitere m ije nzukọ ndị Kraịst nile nke Ndịàmà Jehova. Lee ihe na-akpali mmasị ọ bụ ịhụ ịhụnanya dị n’etiti ha! Nke a aghaghị ịbụ ezi okpukpe ahụ.

Iwe Ihe Ubi na Cape Palmas

Mgbe ihe dị ka ọnwa atọ gasịrị, di m nwere ohere nke izuru ego buru ibu n’ụlọ ọrụ ebe ọ na-arụ ọrụ—ma o meghị otú ahụ. Ndị ọrụ ibe ya kwara ya emo, sị: “Remmie, ị ga-anwụ n’ogbenye.”

Otú ọ dị, n’ihi ime ihe n’eziokwu ya, e buliri ya n’ọkwá ma ziga ya na Cape Palmas imepe ọfịs ọhụrụ n’ebe ahụ. Anyị ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma, mgbe nanị ọnwa abụọ gasịrị, anyị nwere obere ìgwè ndị nwere mmasị dị omimi n’ozi Bible. Mgbe e mesịrị, mgbe Lichfield gara n’isi obodo, bụ́ Monrovia, ibute ihe ọrụ ụfọdụ maka ọfịs ọhụrụ ahụ, e mere ya baptism. Ọ rịọkwara Society maka enyemaka iji lekọta ndị ahụ nọ na Cape Palmas, bụ́ ndị nwere mmasị n’eziokwu ahụ.

Society zaghachiri site n’izite Nwanna Nwoke na Nwanna Nwanyị Faust na Cape Palmas. Nwanna Nwanyị Faust nyeere m aka n’ụzọ bara uru, na December 1951, egosipụtakwara m nrara m raara onwe m nye Jehova site n’ime baptism. Ugbu a, dị ka m na-emetụbeghị na mbụ, ekpebisiri m ike ‘ịchịkọta mkpụrụ maka ndụ ebighị ebi.’ (Jọn 4:35, 36) N’April 1952, amalitere m ozi oge nile dị ka onye ọsụ ụzọ.

Jehova gọziri mgbalị m nile ozugbo; n’ime otu afọ, enyeere m mmadụ ise aka ime nraranye na baptism. Otu n’ime ha, bụ́ Louissa Macintosh, bụ nwa nwanne onye isi ala mba Liberia n’oge ahụ, bụ́ W. V. S. Tubman. E mere ya baptism, ọ banyekwara n’ozi oge nile ma nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke ruo n’oge ọ nwụrụ na 1984. N’ọtụtụ oge, ọ gbaara onye isi ala ahụ àmà.

Na Lower Buchanan

Na 1957, n’oge nleta nke onye nlekọta distriktị, a kpọrọ mụ na di m òkù ịghọ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. Mgbe anyị jisịrị ekpere tụlee ya, anyị nakweere ọrụ ahụ. Lichfield chọrọ ọnwa ole na ole iji kwụsị ọrụ ego ya nke ọma na Cape Palmas, ya mere ebu m ya ụzọ gawa Lower Buchanan, bụ́ ókèala a na-akpabeghị aka, ịmalite ọrụ ahụ n’ebe ahụ.

Mgbe m bịarutere, ebinyeere m ezinụlọ Maclean. N’echi ya, dị ka omenala ha si dị, a kpọgara m na nke onye osote chiifu nke agbụrụ Pele. Chiifu ahụ na ezinụlọ ya nabatara m n’ụzọ na-ekpo ọkụ, agbakwara m àmà nye obere ìgwè nke ndị nọ n’ụlọ ya. Ya dịkarịa ala mmadụ isii ná ndị m gwara okwu n’ụbọchị ahụ, tinyere onye osote chiifu ahụ na nwunye ya, mesịrị ghọọ Ndịàmà.

N’oge na-adịghị anya, amalitere m na-eduzi ọmụmụ ihe Ụlọ Nche, na-enwe ihe karịrị 20 ndị mmadụ bịaranụ. Aghaghị m ịdaberesi ike n’ebe Jehova nọ, o nyekwara m ume na ike dị mkpa iji lekọta atụrụ ya. Mgbe m nwere mmetụta nke ike ọgwụgwụ ma ọ bụ erughị eru, m ga-echeta ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie, karịsịa ndị inyom dị ka Debora na Hulda, bụ́ ndị na-atụghị egwu n’ịrụzu ọrụ nile nke Jehova.—Ndị Ikpe 4:4-7, 14-16; 2 Ndị Eze 22:14-20.

Na March 1958, mgbe nanị ọnwa atọ m nọrọ na Lower Buchanan gasịrị, anatara m akwụkwọ ozi na-akọrọ m banyere nleta nke onye nlekọta sekit, bụ́ John Charuk. Akwụrụ m ụgwọ maka ụlọ ala nke otu ụlọ ga-abata ìgwè mmadụ buru ibu. Mgbe ahụ, m gara na Upper Buchanan izute Nwanna Charuk, ma ọ bịaghị. Mgbe m cheere ruo oge uhuruchi, eji m ike ọgwụgwụ laghachi Lower Buchanan.

N’ihe dị ka etiti abalị, anụrụ m aka a kụrụ n’ọnụ ụzọ. Mgbe m mepere ya, ahụrụ m, ọ bụghị nanị onye nlekọta sekit, kamakwa di m, bụ́ onye ọbịbịa mberede ya dabakọrọ ná nke Nwanna Charuk n’ụzọ mara mma. Olee ụzọ ha si chọta m? Ha zutere otu onye dinta wee jụọ ya ma ọ̀ maara otu nwanyị na-ekwusara ndị mmadụ banyere Jehova. “Ee,” ka ọ zaghachiri, mgbe ahụkwa o gosiri ha ụzọ ebe m bi. Lee ka m si nwee obi ụtọ na nanị n’ime ọnwa atọ m nọrọ na Lower Buchanan, ìhè m na-enwu nnọọ nke ọma!—Matiu 5:14-16.

Anyị nwere ọnụ ọgụgụ kasị elu nke 40 ndị bịara n’oge nleta Nwanna Charuk. Mgbe oge na-aga, e guzobere otu ọgbakọ na-enwe ọganihu, anyị nwekwara ike iwu otu Ụlọ Nzukọ Alaeze mara mma. Otú ọ dị, ndụ abụchaghị nke na-enweghị nsogbu. Dị ka ihe atụ, na 1963, mkpagbu okpukpe tiwapụrụ na Kolahun, e jidekwara di m ma tụọ ya mkpọrọ. E tiri ya ihe nke ukwuu nke na e nyere ya àkwà n’ụlọ ọgwụ.

N’oge na-adịghị anya mgbe a sịrị ya laa, n’otu afọ ahụ, anyị nwere mgbakọ ukwu na Gbarnga. N’ụbọchị ikpeazụ, ndị agha gbara ndị nile bịaranụ gburugburu ma nye anyị iwu ikele ọkọlọtọ. Mgbe anyị jụrụ, ndị agha ahụ manyere anyị ịchịli aka anyị elu na ilegide anya kpọmkwem n’ihu anyanwụ. Ha jikwa úkwù égbè ha tie ụfọdụ n’ime anyị. Dị ka ihe inyeaka iji nọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe nye Chineke, abụụrụ m onwe m abụ Alaeze bụ́ ‘Atụla Egwu Ha!’ Mgbe nke ahụ gasịrị ndị ahụ tụbara anyị n’ime ụlọ mkpọrọ ruru unyi. Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, a tọhapụrụ ndị na-abụghị ndị mba ahụ, a chụlakwara mụ na Lichfield na Sierra Leone. A tọhapụrụ Ndịàmà bụ́ ndị mba ahụ n’ụbọchị na-esonụ.

Ihe Ùgwù na Nkwụghachi Ụgwọ Ndị Ọzọ

E kenyere anyị isoro Ọgbakọ Bo, nke dị n’ebe ndida Sierra Leone, rụkọọ ọrụ. Anyị jere ozi n’ebe ahụ ruo afọ asatọ tupu a kpọfee anyị na Njala. N’oge anyị nọ na Njala, a họpụtara di m ije ozi dị ka onye nlekọta sekit na-enye aka, enwekwara m ihe ùgwù nke isonyere ya ka ọ na-eje ozi nke a. Mgbe ahụ, n’etiti afọ ndị 1970, e kenyeghachiri anyị n’Ọgbakọ East Freetown.

Enwetawo m nkwụghachi ụgwọ nke ịhụ ọtụtụ n’ime ndị m mụụrụ Bible ka ha nakweere ofufe dị ọcha. Enwere m ihe karịrị 60 ụmụ na ụmụ ụmụ ime mmụọ dị ka “akwụkwọ ozi ime ka mmadụ mara anyị.” (2 Ndị Kọrint 3:1) Ọ dịwo mkpa ka ụfọdụ mee oké mgbanwe, dị ka Victoria Dyke, bụ́ onye amụma nwanyị nke òtù Aladura, mere. Mgbe anyị tụlesịrị 1 Jọn 5:21, o mesịrị chịfuo ọtụtụ ihe ikpere arụsị na ihe ndị ọ na-enye ofufe. O gosipụtara nraranye ya site na baptism ma mesịa ghọọ onye ọsụ ụzọ pụrụ iche, na-enyere ọtụtụ ndị ikwu ya aka ịnakwere eziokwu ahụ.

N’April 1985, di m nwụnahụrụ m, nanị ọnwa ole na ole tupu o mee 44 afọ anyị lụrụ di na nwunye. Ma nanị m anọghị. Anọgidewo m na-ejere Onye Inyeaka m, bụ́ Jehova, ozi dị ka onye ozi oge nile. Ana m enwekwa ihe nkekọ pụrụ iche n’ebe ndị ahụ m nyewooro aka ịbịa mara ya. Ha bụ ezinụlọ n’ụzọ pụrụ iche. Ahụrụ m ha n’anya, ha hụkwara m n’anya. Mgbe m na-arịa ọrịa, ha na-agbata ọsọ ilekọta m anya, n’ezie, m na-enyekwara ha aka.

Ihe ịrụ ụka adịghị ya, ọ bụrụ na m amalite n’isi ọzọ, m ga-eji obi ụtọ were mma iwe ihe ubi m ma sonye n’owuwe ihe ubi dị ka onye ya na Jehova na-arụkọ ọrụ.

[Foto dị na peeji nke 23]

Winifred Remmie taa

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya