Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
Ozi Ọma Sitere n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe
ỌTỤTỤ ihe na-akpali akpali na-eme n’ubi ọchịchị Chineke n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe. Otu ihe pụrụ iche bụ mgbakọ nke mba nile e mere na Zagreb, August 16-18, 1991, mgbe 7,300 Ndịàmà ji obi ha nile nabata ụmụnna ha sitere ná mba 15. Na ha nile, 14,684 bịara. Ọ bụ ngosipụta dị ịtụnanya nke ịhụnanya na ịdị n’otu ná mba nke ọgba aghara na-etisasị!
Ndịàmà nọ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe nọ n’ọrụ nke ịkọrọ ndị ọzọ ozi ọma banyere Alaeze Jehova, bụ́ nke ha matara na ọ bụ nanị olileanya e nwere maka ezi udo. N’akụkụ ụfọdụ, ọ bụ ihe ịma aka nye ha ịnọgide n’ọnọdụ nnọpụiche ha. Otú o sina dị, ndị mmadụ na-egekarị ntị, Ndịàmà ahụ na-akọkwa ọtụtụ ahụmahụ ndị mara mma.
N’otu obodo, otu nwa agbọghọ dị afọ 16 nụrụ ozi ọma ahụ site n’ọnụ nke otu Onyeàmà Jehova nanị ya nọ n’obodo ahụ. A malitere ọmụmụ Bible chiri anya, mmasị ya maka eziokwu ahụ mụbakwara. N’inwe oké ọchịchọ nke ịkọrọ ndị ọzọ ihe ndị dị ebube ọ mụtaworo, ọ nwara isoro ụmụ akwụkwọ ibe ya nwee nkwurịta okwu, ma o zutere mmegide na ịkwa emo. Otu nwa akwụkwọ ibe ya megidere ya karịsịa, ma inwe ndidi nke nwa agbọghọ ahụ juru ya anya ma kpalie mmasị ya, n’ihi na onye mmụta Bible ahụ na-eto eto eweghị iwe n’agbanyeghị mkparị ahụ nile. Mgbe e mesịrị, a gbaara nwa agbọghọ nke a àmà nke ọma karị, o wee ghọta na àgwà ya ezighị ezi. A maliteere ya ọmụmụ Bible, mgbe ahụkwa onye mmụta Bible nke mbụ na enyi ọhụrụ ya nwara isoro ndị ọzọ kerịta obi ụtọ ha, n’agbanyeghị mmegide sitere n’aka ndị mụrụ ha, ndị nkụzi ha, na ụmụ akwụkwọ ibe ha.
Dị ka ihe si na ịgba àmà ha pụta, nwata akwụkwọ ibe ha ọzọ nakweere eziokwu. Ugbu a e nwere ha atọ na klasị ha, ha atọ nile bụkwa ezi ihe nlereanya nke ịdị njikere inyere ndị ọzọ aka na nke igosi ịhụnanya n’etiti onwe ha. E mesịa nwa agbọghọ ọzọ sonyere ha.
Ugbu a ha dị anọ na-anọdụ n’ogologo oche dị ná mbara ụlọ akwụkwọ ha bụ́ ebe ha na-enwekọ nkwurịta okwu na Bible. N’ịbụrụ ọtụtụ ndị ihe ijuanya, ọnụ ọgụgụ ha mụbara. Nwa agbọghọ ọzọ nọ na klasị ha, n’ịbụ onye ezi àgwà ha kpaliri, kpebiri isonye n’ọmụmụ Bible ahụ. Ha ise nọgidere na-akpọ ndị ọzọ òkù, ụmụ akwụkwọ na ndị nkụzi, imekwa otú ahụ. Otú o sina dị, ụmụ agbọghọ ahụ nọgidere na-enweta oké nrụgide site n’aka ndị mụrụ ha. Ndị mụrụ ha gbalịsiri ike ịmanye ụmụ agbọghọ ahụ ịkwụsị ọmụmụ Bible ha site n’ibibi akwụkwọ ha na imeso ha omume na-adịghị mma.
Gịnị si n’ịgba àmà nke a e ji otu onye na-eto eto nwere mmasị malite pụta? E mere otu n’ime ụmụ agbọghọ ahụ baptism ná mgbakọ distriktị e nwere na 1990, nakwa anọ ndị ọzọ n’otu mgbakọ sekit e mere n’oge opupu ihe ubi nke afọ 1991. Nke a kpatara oké ọṅụ! Taa, ụmụ agbọghọ ise ahụ nile na-eje ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ oge nile! N’obodo ahụ ebe nke a mere, e nwere ndị nkwusa 11 ugbu a, 8 n’ime ha nọ n’ozi ọsụ ụzọ.
Jehova na-akwagide ma na-agọzi Ndịàmà ya nọ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe. N’ụzọ doro anya, e nwere oké ohere nke mmụba n’etiti ndị obi ha ziri ezi n’akụkụ nke a nke ụwa.