Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 8/15 p. 15-18
  • Ịnọgidesi Ike n’Isoro Jehova Na-arụkọ Ọrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịnọgidesi Ike n’Isoro Jehova Na-arụkọ Ọrụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ònye Ka Anyị Na-arụrụ Ọrụ?
  • Ndị Mmegide Nọ n’Ọrụ
  • Ọrụ Ndị Na-adịghị Akwụghachi Ụgwọ Ọrụ
  • Ịrụ “Ezi Ọrụ” n’Oge A
  • Ọrụ Nke Kasị Baa Uru
  • Iso Ọgbakọ Na-arụkọ Ọrụ
  • Anyị na Chineke Ịrụkọ Ọrụ Na-eme Anyị Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Na-ahụ Ihe Ọma n’Ihi Ịrụsi Ọrụ Ike Gị
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
  • Iji Ọrụ n’Aka, Ọ̀ Bụ n’Ọrụ Ndị Nwụrụ Anwụ Ka Ọ̀ Bụ n’Ozi Jehova?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 8/15 p. 15-18

Ịnọgidesi Ike n’Isoro Jehova Na-arụkọ Ọrụ

“Chineke, i ziwo m ihe site na nwata; ọ bụkwa ruo ugbu a ka m na-egosi oké ọrụ gị nile.”—ABỤ ỌMA 71:17.

1. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwụo na ọrụ bụ onyinye sitere n’aka Jehova?

ỌRỤ bụ otu n’ime onyinye ndị Chineke nyere mmadụ. Jehova gwara nne na nna anyị mbụ bụ Adam na Iv, sị: “[Mụjupụtanụ] ụwa, buda ya n’okpuru onwe unu.” Nke ahụ bụ ọrụ bụ nnọọ ihe ịma aka, ma bụrụ nke ha nwere ike ịrụ. Mgbalị anụ ahụ na nke uche a chọrọ ha n’aka ga-amụbawanye ọṅụ ha na-enwe n’ịdị ndụ, karịa ihe ọ bụla ụmụ anụmanụ ahụ na-enwe, bụ́ ndị so ha biri n’ebe obibi ha bụ elu ala.—Jenesis 1:28.

2, 3. (a) Gịnị ka ọrụ ghọworo nye ọtụtụ ndị taa, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị? (b) Ohere nke ịrụ ọrụ dị aṅaa pụrụ iche ka ọ dị mkpa ka anyị tụlee?

2 Ọbụna n’ọnọdụ ezughị okè anyị, ‘ịdọgbu onwe onye n’ọrụ’ nke na-arụpụta “ezi ihe” bụ “onyinye Chineke,” dị ka onye amamihe ahụ bụ Solomọn dere. (Eklisiastis 3:13) Ọ ka dị mmadụ mkpa itinye ikike uche na anụ ahụ ya n’ọrụ. Ịnọ n’enweghị ọrụ bụ ihe na-akpata obi ịda mbà. Ma, ọ bụghị ọrụ nile bụ ihe kwesịrị ekwesị, ma ọ bụ nke kwesịrị oge e tinyere na ya. Nye ọtụtụ ndị, ọrụ bụ ndọgbu na-adịghị enye ọṅụ, bụ́ nke ha na-arụ n’ihi na ọ dị mkpa iji chọta ihe a ga-eri.

3 Otu ọ dị, e nwere ọrụ nke na-enyeghachi ụgwọ ọrụ n’ezie, bụ́ nke a na-akpọ mmadụ nile okù ikere òkè na ya. Ma ndị ahụ na-ekere òkè na ya nwere ọtụtụ ndị mmegide na ihe isi ike ndị ha na-aghaghị imeri. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị ruo eru maka ọrụ nke a? Olee ụzọ anyị ga-esi mee nke ahụ? Tupu anyị azaa ajụjụ ndị a, ka anyị burugodi ụzọ tụlee:

Ònye Ka Anyị Na-arụrụ Ọrụ?

4. Ụdị ọrụ dị aṅaa wetaara Jisọs ọṅụ na afọ ojụjụ?

4 Jisọs Kraịst sịrị: “Ihe oriri m bụ ka m na-eme ihe onye zitere m na-achọ, ka m rụzuokwa ọrụ ya.” (Jọn 4:34) Ịnọgidesi ike n’ịrụrụ Jehova ọrụ wetaara Jisọs ọṅụ na afọ ojuju dị ukwuu. 0 nyere ya nzube ná ndụ, n’ọgwụgwụ nke afọ atọ na ọkara nke ije ozi ya, o nwekwara ike ikwu n’eziokwu gwa Nna ya nke eluigwe, sị: “Mụ onwe m nyere gị otuto n’elu ụwa, ebe m rụzuru ọrụ i nyeworo m ka m rụọ.” (Jọn 17:4) Dị nnọọ ka nri nkịtị bụ ihe e ji akwado ndụ, otú ahụ ka ọrụ nke nwere akụkụ ime mmụọ dịkwa. Jisọs mere ka nke a pụta ìhè n’otu oge ọzọ mgbe o nyere ndụmọdụ, sị: “Unu arụla ọrụ ịnata ihe oriri nke na-ala n’iyi, kama ịnata ihe oriri nke na-anọgide ruo ndụ ebighị ebi.” (Jọn 6:27) N’ụzọ megidere nke a, ọrụ nke na-adịghị arụpụta ihe ọ bụla n’ụzọ ime mmụọ na-eduje n’ahụ mgbakasị na ọnwụ.

5. Olee ndị megidere ezi ọrụ ahụ Jisọs rụrụ, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

5 “Nna m na-arụ ọrụ ruo ugbu a, mụ onwe m na-arụkwa ọrụ.” Jisọs kwuru okwu nke a gwa ndị Juu ahụ na-akatọ ya n’ihi na ọ gwọrọ otu nwoke nke rịaworo ọrịa ruo 38 afọ n’Ubọchị Izu Ike. (Jọn 5:5-17) Ọ bụ ezie na Jisọs na-arụ ọrụ Jehova, ndị okpukpe na-emegide ya jụrụ ịhụta eziokwu ahụ, meekwa ihe nile ha nwere ike ime iji gbochie ya. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ha sitere n’ebe nna ha, Setan bụ́ Ekwensu, nọ, bụ́ onye ahụ nke nọworo mgbe nile na-emegide ọrụ Jehova. (Jọn 8:44) Ebe ọ bụ na Setan pụrụ ‘ime onwe ya ka o yie mmụọ ozi nke ìhè,’ na-eji ‘aghụghọ nile nke ajọ omume’ na-eme ihe, ọ dị anyị mkpa inwe nghọta ime mmụọ na echiche ziri ezi iji mata ọrụ ya nile dị ka ihe ha bụ n’ezie. Ma ọ bụghị otú ahụ, anyị pụrụ ịchọta onwe anyị ka anyị na-arụ ọrụ megidere Jehova.—2 Ndị Kọrint 11:14; 2 Ndị Tesalọnaịka 2:9, 10.

Ndị Mmegide Nọ n’Ọrụ

6. N’ihi gịnị ka ndị si n’ezi ofufe dapụ ji bụrụ “ndị ọrụ na-atụ ntụ”? Nye ihe atụ.

6 Ufọdụ ndị, dị ka ụfọdụ ndị dapụrụ n’ezi ofufe taa, ji eguzosighị ike na-arụ ọrụ dị ka ndị nnọchianya Setan iji mebie okwukwe nke ndị na-esonyere ọgbakọ ndị Kraịst ọhụrụ. (2 Ndị Kọrint 11:13) Kama nanị iji Bible mee ihe dị ka ihe ndabere nke ezi ozizi, ha na-atụkwasị uche ha n’ịnwa ịkatọ nsụgharị New World Translation of the Holy Scriptures, dị ka à ga-asị na ọ bụ nanị na ya ka Ndịàmà Jehova dabeere maka nkwado ha. Ma nke a adịghị otu ahụ. Ruo akụkụ ka ukwuu nke otu narị afọ, Ndịàmà ahụ jiri nsụgharị King James Version mee ihe n’ụzọ bụ isi, nsụgharị Douay Version nke ndị Roman Katọlik, ma ọ bụ nsụgharị ọ bụla nke e nwere n’asụsụ ha, iji mụta eziokwu ahụ banyere Jehova na nzube ya nile. Ha jikwara nsụgharị ndị a meworo ochie karị mee ihe n’ịkpọsa eziokwu banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ, mmekọrịta dị n’etiti Chineke na Ọkpara ya, nakwa ihe mere o ji bụrụ nanị ìgwè atụrụ nta ga-eje eluigwe. Ndị maara ihe a na-akọ matakwara na Ndịàmà Jehova nọgidere jiri nsụgharị Bible dị iche iche na-eme ihe n’ọrụ mgbasa ozi ọma ha zuru ụwa ọnụ. Otú ọ dị, kemgbe 1961, ha enwekwuwo ọṅụ n’iji nsụgharị New World Translation, bụ́ nke nwere nsụgharị e mere ka ọ dị ọhụrụ, ziekwa ezie, dịkwa mfe ọgụgụ.

7. (a) N’ihi gịnị ka Jisọs ji gọnarị ọtụtụ ndị na-ekwu na ha nwere okwukwe na ya? (b) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa iṅa ntị na ndụmọdụ ahụ dị na 1 Jọn 4:1?

7 Jisọs kwuru na ya ga-agọnarị ọtụtụ ndị na-azọrọ na ha nwere okwukwe n’ebe ọ nọ. O kwetara na ha pụrụ ibu amụma, chụpụ ndị mmụọ ọjọọ, ‘rụọkwa ọtụtụ ọrụ dị ike’ n’aha ya. Ma n’agbanyeghị nke ahụ ọ kọwara ndị a dị ka ọrụ “na-emebi iwu.” (Matiu 7:21-23) Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? N’ihi na ha adịghị eme uche nke Nna ya nke eluigwe, ha abaghịkwa n’ihe dị ka Jehova Chineke si ele ihe anya. Ọrụ ndị pụrụ iche, ọbụna ndị yiri ọrụ ebube, ka pụkwara isite n’aka onyeisi nduhie ahụ, bụ́ Setan. Jọn onyeozi, mgbe ọ na-ede akwụkwọ ozi mbụ o degaara ndị Kraịst nile ihe karịrị 60 afọ mgbe ọnwụ na mbilite n’ọnwụ Jisọs gasịrị, nyere ndụmọdụ na ndị Kraịst ekwesịghị ‘ikwere okwu mmụọ nile, kama ka ha nwapụta ma hà bụ ndị sitere na Chineke pụta.’ Ọ dịkwa mkpa ka anyị mee otu ihe ahụ.—1 Jọn 4:1.

Ọrụ Ndị Na-adịghị Akwụghachi Ụgwọ Ọrụ

8. Mmetụta dị aṅaa ka anyị kwesịrị inwe banyere ọrụ nile nke anụ ahụ?

8 Ọbụna ma a sị na anyị adịghị ekere òkè n’ọrụ ndị na-adịghị arụpụta ihe ọ bụla n’ụzọ ime mmụọ, ndọgbu anyị na-adọgbu onwe anyị n’ọrụ bụ n’efu ma ọ bụrụ na ha nọgidere na-achụso ihe na-atọ anụ ahụ anyị nke daworo ada ụtọ. Pita onyeozi kwuru na anyị etinyewo ogologo oge zuru ezu n’ịrụpụta “ihe ndị mba ọzọ na-ezube . . . ijegharị n’ime agụụ ịkwa iko, agụụ ihe ọjọọ nile, mmanya ogbugbu nile, [oriri oké mkpọtụ, NW] nile, ịṅụbiga mmanya okè nile, na ikpere arụsị nile jọgburu onwe ha.” (1 Pita 4:3, 4) Otú ọ dị, nke a apụtaghị na ndị nile bụ ndị Kraịst raara onwe ha nye ugbu a na-ekerebu òkè n’ihe omume ndị dị otú ahụ, kama ọ pụtara na àgwà nke ndị meworo otú ahụ kwesịrị ịgbanweworịị ngwa ngwa ka ọhụhụ ụzọ ime mmụọ ha na-abawanye ụba. Ụwa ga-ekwutọ ha n’ihi nchegharị ha; nke ahụ bụ ihe a ga-atụ anya ya. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, ha aghaghị ime mgbanwe ka ha wee ghọọ ndị nọgidesiri ike n’ijere Jehova ozi.—1 Ndị Kọrint 6:9-11.

9. Gịnị ka anyị na-amụta site n’ahụmahụ nke Onyeàmà ahụ a zụrụ dị ka onye na-abụ abụ opera?

9 Jehova enyewo anyị ọtụtụ onyinye ndị ga-enye anyị ọṅụ, egwú otiti so n’ime ha. Otú ọ dị, ebe ọ bụ na “ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ,” Setan bụ Ekwensu, ọ̀ bụ na nke a agụnyeghị ọgbọ egwú otiti? (1 Jọn 5:19) Ee, egwú otiti pụrụ ịbụ ọnyà nzuzo, dị ka Sylvana chọpụtara. O nwere ohere nke ịbụ onye a zụrụ na France dị ka onye na-abụ abụ opera. Ọ kọwara, sị, “Aka m nwekwara ọchịchọ siri ike ijere Jehova ozi. Anọ m na-eje ozi dị ka onye ọsụ ụzọ inyeaka, na-enwekwa olileanya ịhazi ihe abụọ ndị a dị ná ndụ m. Ma nsogbu mbụ m chere ihu n’ịchụso ọrụ ahụ bụ omume na-adịghị ọcha. Ná mmalite, ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ lere m anya dị ka onye na-amabeghị ihe a na-akọ mgbe m na-adịghị esonyere ha n’okwu rụrụ arụ na ihe nlereanya rụrụ arụ ha na-egosi. Mgbe e mesịrị, gburugburu ebe ahụ e merụrụ emerụ malitere ime ka ihe ghara ịdị na-emetụtakwa m, na-eme ka m na-anabatazi ihe ndị Jehova kpọrọ asị. Otu n’ime ndị nkuzi m nọgidere na-agba m ume ka m jiri ọrụ ịbụ abụ m mere okpukpe, a kuzikwaara m ịdị na-eme ihe ike ike mgbe m na-abụ abụ, ka m na-echekwa na adị m elu karịa onye ọ bụla ọzọ. Ihe a nile mere ka ahụ ghara iru m ala. N’ikpeazụ, akwadebere m maka otu ule ịbụ abụ pụrụ iche. Ekpekuru m Jehova ekpere ka o mee ka o doo m anya ihe m kwesịrị ime. Ọ bụ ezie na abụrụ m abụ nke ọma, nweekwa obi ike na a ga-ahọpụta m, ma esoghị m ná ndị a họpụtara. Emesịrị m mata ihe merenụ—e kpebiworị ndị a ga-ahọpụta na nzuzo ogologo oge tupu ịsọ mpì ahụ. Ma nke a bụụrụ m azịza doro anya nye ekpere m, m wee kpebie ịhapụ ọgbọ ibu abụ opera wee malite ikuzi otú e si abụ abụ n’ụlọ.” Nwanna nwanyị a mesịrị lụta di bụ okenye n’ọgbakọ ndị Kraịst, ebe ha abụọ nọgidesiri ike ugbu a na-eje ozi n’ime ka ọdịmma Alaeze gaa n’ihu.

10. Gịnị ka ị na-ekwubi site n’okwu Jisọs dị na Jọn 3:19-21?

10 Jisọs sịrị: “Onye ọ bụla nke na-eme ihe na-adịghị mma na-akpọ ìhè ahụ asị, ọ dịghị abịakwutekwa ìhè ahụ, ka a ghara ịtụ ya ọrụ ya nile n’anya.” N’aka nke ọzọ, “onye na-eme ihe bụ eziokwu na-abịakwute ìhè ahụ, ka e wee mee ka ọrụ ya pụta ìhè, na a rụworo ha na Chineke.” (Jọn 3:19-21) Lee nnọọ ngọzi ọ bụ ịrụ ọrụ n’ụzọ kwekọrọ n’uche na nzube Jehova! Ma, iji nwee ihe ịga nke ọma n’ime ya, anyị aghaghị ikwere mgbe nile ka e jiri Okwu Chineke nyochaa ọrụ anyị nile. Ọ dịghị mgbe a ga-asị na anyị emewo agadi gabiga ókè ma ọ̀ bụkwanụ na oge agabigawo ókè ịgbanwe ụzọ ndụ anyị ma nakwere ọkpụkpọ òkù ahụ ịmalite ijere Jehova ozi nke bara uru.

Ịrụ “Ezi Ọrụ” n’Oge A

11. Gịnị ka ọtụtụ ndị na-achụso dị ka “ezi ọrụ,” n’ihi gịnị ka ihe ndị dị otú ahụ pụkwara iji dụga n’ahụ mgbakasị?

11 Ọrụ nke bara uru taa aghaghị igosipụta ịdị ngwa nke oge anyị bi n’ime ya. Ọtụtụ ndị nwere obi eziokwu kwere na nke a, na-etinyekwa onwe ha n’ọrụ ndị a na-akọwakarị dị ka “ezi ọrụ,” bụ́ ndị a na-arụ maka abamuru nke ihe a kpọrọ mmadụ n’ozuzu ha ma ọ bụ maka otu ihe kpọmkwem. Ma lee nnọọ ka ụdị ọrụ ahụ pụrụ isi bụrụ ihe na-eweta ahụ mgbakasị! Na Britain, òtù CAFOD (Catholic Fund for Overseas Development [ụtụ ndị Katọlik na-atụ maka imepe mba ndị ọzọ]), mgbe ọ na-enye akụkọ banyere òkù ọ kpọrọ maka inyere ndị nọ n’ụnwụ nri aka, sịrị: “N’afọ atọ gara aga . . . e nwetara ọtụtụ nde pound dị ka ego enyemaka. A zọpụtara ndụ ọtụtụ puku mmadụ. Ugbu a, ndụ ndị ahụ abanyeghachiwokwa n’ihe ize ndụ ọzọ . . . Ma ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Gịnị gahiere?” N’ịga n’ihu n’akụkọ ya, akwụkwọ bụ CAFOD Journal kọwara na ọ dịghị mgbe e mere ihe iji merie nsogbu ndị na-adịte anya, na “e jikwa ego na ihe onwunwe ndị ahụ dị oké mkpa iji kwalite ndụ ndị mmadụ mee ihe iji kwalite esemokwu [agha obodo] ahụ.” Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị nụwo echiche ndị dị otú ahụ site n’ọnụ òtù ọrụ ebere dị iche iche ndị na-arụ otu ụdị ọrụ ahụ.

12. Gịnị bụ nanị azịza e nwere nye nsogbu nile na-eche ụwa ihụ taa?

12 Ụnwụ nri bụ nsogbu chọrọ ogbugbo ngwa ngwa. Ma, òle ndị na-eme ka a mata ọdachi nke ụnwụ nri na agha a na-enwe n’oge a dị ka ihe na-emezu amụma Jisọs Kraịst, nke na-ezo aka n’ọgwụgwụ nke usoro ihe dị ugbu a? (Matiu 24: 3, 7) Òle ndị bipụtaworo ihe àmà nke na-ejikọta ihe omume ndị a na ọgbụgba nke ndị ịnyịnya anọ e gosipụtara n’ụzọ pụtara ìhè n’akwụkwọ Bible bụ Mkpughe, isi 6? Ndịàmà Jehova anọgidesiwo ike na-eme otú ahụ n’ime magazin nke a. N’ihi gịnị? Ọ bụ iji gosi na ọ bụ ihe karịrị aka mmadụ imepụta ihe ngwọta ọ bụla na-adịgide adịgide. Nke a apụtaghị na ndị Kraịst adịghị egosi mmetụta ọ bụla n’ihi nsogbu nile nke ụwa. Ọ dịghị otú ahụ ma ọlị. Ha bụ ndị nwere obi ọmịiko, ha ga-emekwa ihe nile ha nwere ike ime iji belata ịta ahụhụ. Ma, ha na-echekwa ihe mere eme ihu n’ezie nke bụ na ọ dịghị mgbe ọ bụla a pụrụ idozi nsogbu nile nke ụwa, ọ gwụlakwa ma Chineke o tinyere aka n’ihe na-emenụ. Dị ka ndị ogbenye, nsogbu ndị a ga-adịgide ruo ogologo oge e kwere ka Setan nọgide dị ka onye na-achị ụwa nke a.—Mak 14:7; Jọn 12:31.

Ọrụ Nke Kasị Baa Uru

13. Gịnị bụ ọrụ kasị dịrị ngwa ngwa taa, ọ̀ bụkwa òle ndị na-arụ ya?

13 Mkpa kasị dịrị ngwa taa bụ ikwusa ozi ọma nke bụ na Alaeze Jehova Chineke ga-abịa n’isi nso ịnọchi anya ọchịchị nile nke ụwa nakwa iweta ntọhapụ nke ndị nile na-atụ egwu Chineke na-achọ. (Daniel 2:44; Matiu 24:14) Jisọs Kraịst mere ka ikwusa Alaeze eluigwe ahụ bụrụ nzube bụ isi o nwere ná ndụ, ọ bụ eziokwu na ọrụ nkwusa ya metụtara nanị ala Palestine. Taa, a na-ekwusa ozi ọma ahụ n’ụwa nile dị ka Jisọs kwuru na a ga-eme ya. (Jọn 14:12; Ọrụ 1:8) Ikere òkè, ọbụna ókè dị nta, n’ọrụ Chineke, bụ ihe ùgwù na-enweghị atụ. Ndị ikom na ndị inyom, ma ndị okenye ma ụmụntakịrị, ndị ọ na-adịghị mgbe ọ bụla ha rọrọ nrọ ịbụ ndị nkwusa ozi ọma ahụ na-ebute ụzọ n’ọrụ mgbasa ozi ọma ahụ nke Ndịàmà Jehova na-arụzu taa. Dị ka Noa na ezinụlọ ya, ha na-anọgidesi ike n’ịrụ ọrụ Chineke n’okpuru ikike O nyeworo ha, n’ihi nke a, ọ bụkwa n’ike Ya, dị ka ihe na-ebute ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a ụzọ.—Ndị Filipaị 4:13; Ndị Hibru 11:7.

14. Olee otú nkwusa ozi ọma si bụrụ ihe na-azọpụta ndụ, bụrụkwa ihe nchebe n’otụ mgbe ahụ?

14 Ọrụ ịgba àmà Ndịàmà Jehova na-arụ n’ime mgbe ikpeazụ ndị a bụ ihe na-azọpụta ndụ nye ndị ahụ na-ege ntị, ndị na-emekwa ihe kwekọrọ n’ozi ọma ahụ ha nụrụ. (Ndị Rom 10:11-15) Ọ bụkwa ihe nchebe nye ndị ahụ na-ekwusa ya. Site n’iji obi eziokwu nwee mmasị n’inyere ndị ahụ nwere nsogbu ndị dị ukwuu karị nke anyị aka, o yiri ka anyị agaghị emikpubiga onwe anyị ókè ná nsogbu ndị anyị pụrụ inwe. Anyị na-achọpụta na ụwa nke a nke nwere ụkpụrụ omume ndị na-adakpọ adakpọ ga-achọ ka anyị kwekọọ n’ụzọ ya nile. Ya mere, iji echiche Chineke na-emejupụta [Text missing] ekwusa [Text missing] kwe anyị ike; ọ bụ maka ọdịmma anyị kasị mma. Dị ka otu Onyeàmà si kwuo ya: “Ọ bụrụ na agbalịghị m ịgbanwe ndị ahụ m na-ezute, ha pụrụ ịgbanwe m!”—Tụlee 2 Pita 2:7-9.

Iso Ọgbakọ Na-arụkọ Ọrụ

15. Ibu ọrụ dị aṅaa na-adịkwasị ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’okpuru taa, mmetụta dịkwa aṅaa ka ndị ikom nọ n’ọgbakọ kwesịrị inwe n’iburu 1 Timoti 3:1 n’uche?

15 Mgbe ndị nwere mmasị ọhụrụ bịara n’ọgbakọ, ha na-abata n’okpuru nlekọta nke Onye Ọzụzụ Atụrụ Ukwu ahụ, bụ́ Jehova Chineke, na Onye Ozụzụ Atụrụ Ọma ya, bụ́ Jisọs Kraịst. (Abụ Ọma 23:1; Jọn 10:11) Ndị na-anọgidesi ike dị ka ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’okpuru, bụ́ ndị ikom a họpụtara n’ime ọgbakọ dị iche iche, na-anọchite anya Ndị Ọzụzụ Atụrụ ndị a nọ n’eluigwe n’elu ala ebe a. (1 Pita 5:2, 3) Ịnọ n’ọkwá dị otú ahụ bụ ihe ùgwù ọnụ ahịa ọ bụla na-apụghị ịzụta n’ime mgbe ikpeazụ ndị a. Ọrụ onye ọzụzụ atụrụ bụ ọrụ dị arọ, nke gụnyere, ọ bụghị nanị ibute ụzọ n’izi ihe n’ime ọgbakọ na ná mgbasa ozi ọma ahụ, kamakwa n’ichebe ìgwè atụrụ pụọ n’aka anụ ndọgbu ime mmụọ dị iche iche nakwa mbugharị nke ikuku nke ụwa nke a anyị bi n’ime ya nke yiri oké ebili mmiri. Ọ dịghị ọrụ bara n’ihe karị, nke ndị ikom nọ n’ọgbakọ pụrụ ịdị na-agbalị iru eru maka ya nke karịrị inye aka n’ilekọta ọdịmma ime mmụọ nke ndị nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst ahụ nke na-agbasa agbasa.—1 Timoti 3:1; tụlee Aịsaịa 32:1, 2.

16. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka ndị Kraịst bụ ndị ọzụzụ atụrụ na-esi emezurịta ihe ibe ha nwere?

16 Otú ọ dị, anyị ekwesịghị ichefu na ndị ọzụzụ atụrụ dị otú ahụ bụkwa ndị mmadụ, ndị nwere ọdịdị mmadụ na adịghị ike dị iche iche dị ka ndị nile ọzọ so n’ìgwè atụrụ ahụ. Mmadụ pụrụ ime nke ọma n’otu akụkụ nke ọrụ ọzụzụ atụrụ, onyinye onye ọzọ nwere ga-abara ọgbakọ ahụ uru site n’akụkụ ọzọ. Ọrụ ha dị ka ndị okenye bụ ndị Kraịst na-emerịta ka nke ibe ha zuo ezu iji na-ewusi ọgbakọ ike. (1 Ndị Kọrint 12:4, 5) Mmụọ nke ịma aka ekwesịghị ịbata n’etiti ha ma ọlị. Ha na-arụkọ ọrụ n’otu iji chebe ma na-emekwa ka ọdịmma Alaeze na-aga n’ihu, “na-achịli aka dị ọcha elu” n’ekpere nye [Text missing] 1 Timoti 2:8.

17. (a) Ibu ọrụ dị aṅaa ka anyị nwere? (b) Olee ihe ndị anyị na-aghaghị izere ka anyị wee rụzuo ibu ọrụ anyị nke ọma?

17 Ọrụ nkwusa ahụ na-adịwanye ngwa ngwa ka ọgwụgwụ nke alaeze Setan na-abịaru nso. Dị ka Ndịàmà ya, ebe anyị nwere eziokwu nke Okwu Jehova Chineke, anyị nwere ibu ọrụ nke ịgbasa ozi ọma ahụ n’ohere ọ bụla dapụtaranụ. Ọrụ e ji n’aka zuru nnọọ ezu ime ka anyị nọgide n’ọrụ, kpọmkwem ruo ọgwụgwụ. Anyị ekwesịghị ịgbachi onwe anyị nkịtị ka a dọpụ uche anyị site n’iji echiche nke bụ na ihe ụtọ bụ isi ihe dị ná ndụ wee chụsoo ihe ụtọ rụrụ arụ, ma ọ̀ bụkwanụ ka ịhụ ihe onwunwe n’anya bogbuo anyị. Anyị ekwesịghị itinye onwe anyị n’echiche nke ịkọ nkọ, ịrụrịta ụka banyere okwu dị iche iche, n’ihi na nke a pụrụ ịbụ ihe na-abaghị uru na ihe na-egbu oge. (2 Timoti 2:14; Taịtọs 1:10; 3:9) Mgbe ndị na-eso ụzọ jụrụ Jisọs, sị, “Onyenwe anyị, ọ̀ bụ n’oge a ka ị na-enyeghachi Israel alaeze?” Jisọs duziri uche ha gaa n’ọrụ dị mkpa e ji n’aka, na-asị: “Unu ga-abụkwa ndịàmà m n’ime Jerusalem, na n’ime Judia na Sameria nile, ruokwa ebe ụwa sọtụrụ.” Ọrụ ahụ gbatịrị ruo n’oge anyị a.—Ọrụ 1:6-8.

18. N’ihi gịnị ka iso Jehova na-arụkọ ọrụ ji bụrụ ihe na-enyeghachi ụgwọ ọrụ otú a?

18 Iso Jehova na-arụkọ ọrụ, iso ọgbakọ ya zuru ụwa ọnụ na-ekwusa ozi ọma ahụ taa, na-eweta obi ụtọ, afọ ojuju, na ezi nzube ná ndụ anyị. Ọ bụ ohere onye ọ bụla hụrụ Jehova n’anya nwere iji gosipụta nrara ọ raara onwe ya nye na nnọgidesi ike ya n’ebe ọ nọ. Ọrụ nke a, n’ọtụtụ akụkụ ya, bụ nke a na-agaghị arụ ọzọ. N’inwe olileanya nke ndụ ebighị ebi n’ihu anyị, ka anyị nọgide ‘jiri egwu na ụjọ na-ejere Chineke ozi dị nsọ,’ iji nye ya otuto nakwa maka nzọpụta nke anyị onwe anyị.—Ndị Hibru 12:28.

Gịnị Bu Azịza Gị?

◻ Ọrụ dị aṅaa nyere Jisọs ọṅụ na afọ ojuju?

◻ Olee ndị na-emegide ọrụ Jehova, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

◻ Olee otú “ezi ọrụ” ndị ụwa dị ma e jiri ya tụnyere ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke?

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Jìsọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ọrụ ka ha jee kwusaa ozi ọma

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya