Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 8/15 p. 24-28
  • Ịrụ Ọrụ Chineke n’Ụzọ Nke Chineke na Nigeria

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịrụ Ọrụ Chineke n’Ụzọ Nke Chineke na Nigeria
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Mgbasapụ Dị Ngwa
  • Ihe Ndị E Chetara Banyere Ọrụ Owuwu Ihe
  • Nkwado nke Ndị Ọchichị
  • Ụbọchị Nraranye
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 8/15 p. 24-28

Ịrụ Ọrụ Chineke n’Ụzọ Nke Chineke na Nigeria

Ọ BỤ ihe dị nnọọ ebube ikiri. Nnukwute ikpó ihe nkwado ndị e ji ígwè mee—ihe karịrị 500 tọn [ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara nde kilogram]—kposa n’ọdụ ụgbọ mmiri ahụ dị na Houston, Texas, gbatịịrị site n’otu nsọtụ ruo ná nsọtụ nke ọzọ. Otu onye na-arụ ọrụ n’ọdụ ụgbọ mmiri nwere ọrụ nke ịgụkọta ihe ndị a nile ka e wee buba ha n’ụgbọ mmiri. Ka ọ na-arụ ọrụ, ọ bụụrụ ya ihe ijuanya ịhụ ka a kara ha nile akara “Watchtower” (Ụlọ Nche) n’ahụ. N’ikpeazụ, ọ bịakwutere nwoke na-elekọta ngwongwo ahụ wee jụọ ya, sị: “Gịnị kpọmkwem bu ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị elu nke ụlọ nche nke a?”

A kọwaara onye ọrụ ụgbọ mmiri ahụ na a gajeghị iji ígwè ahụ wuo ụlọ nche nkịtị. Kama nke ahụ, a gaje ibuje ha n’Igieduma, Nigeria, bụ́ ebe a ga-eji ha mee ihe n’iwu alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ nke Watch Tower Society—nke bụ nnọọ obodo nta nke dị n’ime oké ọhịa Africa.

N’afọ isii gara aga, ala ahụ dị n’Igieduma bụ nnọọ oké ọhịa na ọdọ osisi rubber. Ugbu a, ala ahụ bụ ebe a na-elekọta nke ọma, maakwa mma; e nwere okooko osisi dị iche iche, ubi, na ọbụna ogige ọhịa tojuru ebe ele na mgbada dị! Ma, n’ala ahụ, e nwere otu ebe obibi akwụkwọ nke buru ibu karịa ala nile ebe e nweburu alaka ụlọ ọrụ dị na Lagos. N’ime ebe obibi akwụkwọ ahụ, e nwere ígwè obibi akwụkwọ atọ ndị na-arụ ọrụ, nke otu n’ime ha nwere ike ibipụta 17,000 magazin n’otu hour ọ bụla. Ụlọ obibi nwere ohere nke ga-aba 400 mmadụ. Ụlọ services ahụ nwere ebe iri nri buru ibu na kichin, tinyekwara ebe a na-elekọta ndị ahụ na-esighị ike na ebe a na-agwọ ọrịa ézé. E nwere usoro inweta mmiri nke na-esighị ebe ọzọ na-abịa nakwa usoro mkpofu nsị. Otu usoro injin ndị e ji ígwè kọmputa na-eduzi na-enye ike eletrik. E nwere Ụlọ Nzukọ Alaeze, ụlọ ọfis, na ngalaba na-ahụ maka ọkụ ọgbụgba. Ị ga-ahụkwa okporo ụzọ dị iche iche na ọkụ ndị na-enwu n’okporo ụzọ. Ka a sịkwa ihe mere na ndị mmnadụ na-akpọ Betel ahụ dị n’Igieduma obodo nta. Ọ bụkwa ndị ọrụ afọ ofufo a na-adịghị akwụ ụgwọ wuru ihe nile ahụ, e jikwa onyinye afọ ofufo a na-arịọghị arịọ nweta ego e ji wuo ya.

Mgbasapụ Dị Ngwa

Ọ bụ ezie na Betel nke a bụ nke kasị ibu e nwetụrụla na Nigeria, ọ bụghị nke mbụ. Nwanna William R. Brown guzobere nke mbụ, bụ́ onye kpọ nwunye ya na nwa ya nwanyị bịa na Lagos na 1930. E jiri ọnụ ụlọ ole na ole ahụ ha bi n’ime ya mere isi ụlọ ọrụ nke alaka ụlọ ọrụ Society dị n’Ọdịda Anyanwụ Africa, bụ́ nke na-elekọta ọrụ Alaeze ahụ na Nigeria, Ghana, na Sierra Leone. N’oge ahụ, e nwere nanị ndị nkwusa ozi ọma asaa ndị na-arụsi ọrụ ike na Nigeria.

Bible Brown, dị ka a maara ya n’ebe nile, bụ onye dị ike nke na-ejikwa anya ike na-ekwusa ozi ọma ahụ. N’ịbụ onye afọ na-adịghị eju ịnọ ogologo oge n’oche dị n’ọfịs, o jiri moto na ụgbọ okporo ígwè gazuo mba ahụ dum, na-ekwu okwu ihu ọha, na-ekesakwa ọtụtụ akwụkwọ e ji amụ ịhe.

Ka ozi Alaeze ahụ dị ike na-agbanye mkpọrọgwụ n’uche na n’obi ndị zaghachiri nke ọma, ọtụtụ ndị ọzọ karị ghọrọ ndị nkwusa Alaeze na-anụ ọkụ n’obi. Afọ iri nke sochirinụ yiri oge ahụ, n’ime narị afọ mbụ na Jerusalem, mgbe ‘okwu Chineke gara n’ihu; ọnụ ọgụgụ nke ndị na-eso ụzọ Jisọs na-abakwa ụba hie nne.’ (Ọrụ 6:7) Na 1940, ọnụ ọgụgụ ndị na-arụsi ọrụ ike n’ito Jehova na Nigeria arịwo elu nke ukwuu site na 7 ruo 1,051!

‘Onye nta ahụ aghọwo otu puku,’ ma nke a bụ nanị mmalite. (Aịsaịa 60:22) Na 1947, Society zijere ndị ozi ala ọzọ atọ e nyere ọzụzụ na Gilead na Lagos. Otu n’ime ndị a, bụ́ Anthony Attwood, ka na-arụsi ọrụ ya ike. Ọ na-echeta Betel nke e nwere n’oge ahụ, sị: “Ọ bụ otu ụlọ nke dị n’elu ụlọ ebe a na-arụzi akpụkpọ ụkwụ. E nwere ọnụ ụlọ ihi ụra atọ, otu palọ nke bụkwa ọfịs, na otu ụlọ iri nri. Nwanna Nwoke na Nwanna Nwanyị Brown na ezinụlọ ha bi n’ọnụ ụlọ ihi ụra abụọ, anyị ndị ozi ala ọzọ atọ bikọtakwara ọnụ n’ime ọnụ ụlọ nke atọ ahụ. E nwere nanị ohere ga-aba àkwà atọ na ebe nkobe ákwà nke e wunyere n’ahụ ụlọ ahụ.”

Mkpa e nwere inwetakwu ohere mere ka a kwapụ jee n’otu ụlọ nwere okpukpu atọ na 1948. Mgbe ahụ, ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa dị na Nigeria eruwo 6,825. Mgbe afọ asatọ gasịrị, ọnụ ọgụgụ ahụ amụbawo okpukpu atọ, ya mere e bupụkwara Betel ọzọ gaa na Shomolu, Lagos. N’ebe ahụ, na nke mbụ ya na Nigeria, Society wuru Ụlọ Betel nke ya, bụ́ otu ụlọ nwere ọnụ ụlọ ihi ụra asatọ nke e wuru n’ala dị otu eka na ọkara [0.6 hekta]. Gọọmenti ime obodo dị n’ebe ahụ kpọrọ okporo ụzọ ahụ Watch Tower Street. A kụrụ ọtụtụ osisi n’ime ogige ahụ, gụnyere akị bekee nakwa oroma, ụkwa, ube bekee, mango. Ma, n’ime 33 afọ sochirinụ, a gbakwụnyere ụlọ dị iche iche, wusaakwa ha. Ma ka ọ na-erule etiti afọ ndị 1970, ụlọ dị iche iche kpuchitere ala ahụ dum. Ọ dịkwara mkpa ọzọ ịkwapụ.

Ihe Ndị E Chetara Banyere Ọrụ Owuwu Ihe

Na mbụ, a chọtara otu ibé ala dị 76 eka [31 hekta] n’Otta, nke dị n’ebe ugwu Lagos. Ma nsogbu dị iche iche nọgidere na-egbochi inwe ọganihu. O mesịrị doo anya na ọ bụghị uche Jehova ka anyị kwaje n’ebe ahụ. Ihe ọzọ e mere bụ ịchọrọ ala gazuo akụkụ ndịda dum nke mba ahụ, na 1983, Society nwetara otu ibé ala

dị 140 eka [57 hekta] n’Igieduma, nke dị na Bendel State.

N’ime afọ isii sochirinụ, éké na agwọ ùbí ndị dị n’ebe ahụ kwapụrụ ka ụmụnna na nnukwute ígwè ọrụ dị iche iche na-akwabata. Otu ihe ịma aka bụ isi nye ọrụ a bụ na ọ bụ ihe siri ike, ma ọ bụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe na-agaghị ekwe omume ịzụta ihe ka ukwuu ná ngwa ọrụ na ihe ọrụ dị iche iche e ji ewu ihe n’ime obodo a. Ọ dị mkpa inweta enyemaka sitere n’ebe ọzọ. Ya mere, a kpọkuru otu ìgwè Ndịàmà nọ na United States ka ha chọta, zụta, butekwa ngwa ọrụ dị iche iche. Terry Dean, bụ́ onye lekọtara oké ọrụ nke a, kọrọ, sị: “Ịhe mere ka ọrụ a bụrụ nke dị ịrịba ama bụ na a ghaghị ibubata ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe nile ebubata. Ụmụnna ndị nọ na Nigeria gwara anyị na nanị ngwá ọrụ ha nwere bụ ájá, simenti, na mmiri!”

Ọ bụ ihe dị mma na ngwa ọrụ ndị ahụ bụ isi dị adị, ebe ọ bụ na ọrụ owuwu ihe ahụ riri 7,500 tọn simenti, 55,000 tọn ájá, na 35,000 tọn kọnkịrị. E nwekwara osisi dị ukwuu. Otú o sina dị, n’ime afọ ise sochirinụ, e bubatara 5,000 tọn [4.5 nde kilogram] nke ngwá ọrụ dị iche iche site na United States, bụ́ nke ga-ezu ibujupụta 347 nnukwute igbe e ji ebu ngwongwo n’ụgbọ mmiri, nke ọ ga-abụ, ọ bụrụ na e sokọta ha isi, ọ ga-agbatị ruo 2.2 maịlụ [3.5 kilomita]!

Alaka ụlọ ọrụ ndị ọzọ mesapụkwara aka n’ịtụta ụtụ ngwá ọrụ. England wetara ihe nile metụtara usoro ike eletrik, gụnyere nnukwute ígwè ọkụ eletrik isii. Sweden nyere otu ígwè crane dị oké elu, tractor dị iche iche, otu ígwè e ji egwu ala, ụgbọ obu ngwongwo, ngwá ọrụ ihe ndị e ji eme ihe na kichin, na otu ígwè ọrụ telifonu. Mgbe a chọrọ ire otu ụlọ ahịa na-ere ihe ndị e ji arụ ọrụ ihe owuwu, ụmụnna ndị Sweden zụtara ya wee zite ihe nile dị na ya na Nigeria. Ọ fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ na nanị ihe si n’ụlọ ahịa ahụ nke ha na-eziteghị bụ shọvel ndị e ji eku snow—bụ́ ndị e kpebiri na ha ga-aba nnọọ uru na Sweden karịa n’Africa!

N’eziokwu, Ndịàmà bụ ndị obodo a tụnyekwara ụtụ dị ka ike ha hà. Ihe karịrị 125,000 mmadụ gosiri nkwado ha maka ọrụ ahụ site n’ịbịa n’ihu ọrụ ahụ n’oge owuwu ihe ahụ. Ọtụtụ ndị nyere aka n’ụzọ ego. Otu onyinye nke ego dị Nl.50 sitere n’aka otu nwa okoro nta dị afọ asaa. Olee otú o si nweta ego ahụ? Nna ya nyere ya otu ibe ji ka o sie wee rie; kama ime nke ahụ, nwa okoro ahụ debere ya, wee kọọ ya n’oge kwesịrị ekwesị. Mgbe e mesịrị, o gwutere ji ahụ, ree ya, wee nye ego o retara na ya maka ọrụ Igieduma.

Ndịàmà Jehova ndị ọzọ ji nkà ha nye onyinye, ọbụna na-azụ ndị ọzọ ịmụta nkà dị iche iche nke ọrụ owuwu ihe. Ọtụtụ ndị, ihe ruru 500 n’otu oge, rụsiri ọrụ ike, na-adọgbu onwe ha n’ọrụ n’okpuru oké anwụ na oké mmiri ozuzo iji rụzuo ọrụ ahụ. Dị ka ihe atụ, tụlee ọrụ o were iji wuo mgbidi nke gbara ebe ahụ gburugburu. N’ime ọnwa asaa nke o were iji wuzuo mgbidi nke a nke dị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ maịlụ abụọ [3 kilomita] n’ogologo, ụmụnna ahụ kpụrụ, dookwa n’otu n’otu, ihe karịrị 57,000 blọkụ! Otu nwanna kwuru okwu na-atọ ọchị, sị: “Ihe mere ka m nọgide n’ọrụ ahụ bụ ịhụ ka udele ndị ahu na-efegharị n’elu na-eche mgbe m ga-ada wee nwụọ!” N’eziokwu, dị ka ọtụtụ puku ndị ọzọ ndị nyere aka ịhụ na e nwere ihe ịga nke ọma n’Igieduma, mmụọ Jehova kpaliri, kwadookwa ya.

Nkwado nke Ndị Ọchichị

Ndị ọrụ gọọmenti nyere aka n’ịkwado ọrụ ahụ. Ọfis nke Onyeisi ala kwere ka a ghara ịna ụgwọ ndị customs maka ngwá ọrụ nile e ji ewu ụlọ ndị e si mba ọzọ bubata. Ndị ọrụ obodo kwere ka anyị ghara ịkwụ ụgwọ e ji enye ike iwu ụlọ na ndị e ji abịanye aka n’akwụkwọ atụmatụ ụlọ. Ọ bụ nanị ego nta a na-akwụ maka ụlọ a na-ewu ka a kwụrụ. N’otu oge, mgbe e nwere esemokwu banyere ala, Omo N’oba, ma ọ bụ eze, nke ebe ahụ nile tinyere ọnụ n’okwu ahụ wee nye iwu, sị: “Onye anwakwala anwa ịkwụsị ọrụ ahụ n’ihi na ọ bụ ọrụ Chineke.”

Ndị ọzọ na-abụghị Ndịàmà Jehova hụtakwara na ọrụ nke a nwere nkwado Chineke. Mgbe otu ụlọ ọrụ dị n’America resịrị anyị ígwè ndị e ji wuo ebe nrụzi ụgbọ ala ahụ, ha zitere otu n’ime ndị ọrụ ha, bụ́ onye Katọlik, ka o nye aka n’iguzobe ya. N’ime izu abụọ ọ nọrọ n’Igieduma, o weghị ya oge ịtụsara nnọọ ahụ, ọbụna na-akpọ ndị ọrụ ibe ya nwanna nwoke na nwanna nwanyị. Mgbe ọ laghachiri, o degaara alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Nigeria akwụkwọ, sị: “Ọ dịbeghị mgbe ọ bụla ọzọ m nwere ọṅụ n’ọrụ otú ahụ m nwere mgbe m nọ ebe ahụ na-arụ ọrụ Chineke n’ụzọ nke Chineke.”

Ụbọchị Nraranye

Na January 20, 1990, a raara ọmarịcha ụlọ Betel nke a nye Jehova Chineke, onye ọ bụ mmụọ ya nyere aka iji rụzuo ya. E nwere ndị ọbịa site n’akụkụ nile nke Nigeria, ọ bụ ezie na a kpaara ọkpụkpọ òkù ahụ ókè ka ọ dịrị nanị ndị meworo baptism ya dịkarịa ala ruo 35 afọ ma ọ bụ ndị tinyeworo, ya dịkarịa ala, 20 afọ n’ije ozi oge nile. Ụinụnna nwanyị yicha uwe ọma ndị tụrụ àgwà dị iche iche tinyere ịchafụ isi ndị kwekọrọ n’uwe ha yi, ọtụtụ n’ime ụmụnna nwoke yikwa ọmarịcha uwe mwụda ndị Africa. Ná nchịkọta, 4,209 mmadụ ndị si 29 mba dị iche iche bịara maka nraranye ahụ. Ọ dịkarịa ala 80 ndị ozi ala ọzọ so n’ime ha, nke ihe ka ọtụtụ n’ime ha sitere ná mba ndị ọzọ nke Ọdịda Anyanwụ Africa. Otu n’ime ihe ndị dị n’usoro ihe omume ahụ bụ akụkọ a nụrụ site n’ọnụ ndị nnọchianya nke alaka ụlọ ọrụ ise dị iche iche, ndị mere ka ọ pụta ìhè, ịdị n’otu nke nzube na mmetụta ụmụnna nke dị n’etiti ndị Jehova. A natara ozi ekele na waya ndị a kụtara site n’aka ụmụnna nọ na 21 mba dị iche iche, gụnyere ozi na-akpali obi nke si n’aka “400 ụmụnna nwoke na ndị nwanyị nọ na Moscow, Soviet Union.”

Mmadụ abụọ so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova nke dị na Brooklyn, New York, bịakwara. Albert Schroeder kwuru okwu n’isiokwu ahụ bụ “Ihe A Na-achọ Bụ Ka A Hụ Gị Dị Ka Onye Na-ekwesị Ntụkwasị Obi,” na-emesi ya ike mkpa ọ dị ndị Chineke ịnọgide n’ikwesị ntụkwasị obi. (1 Ndị Kọrint 4:2) Onye kwuru okwu nraranye ahụ bụ Lyman Swingle, bụ́ onye tụlere owuwu nke ụlọ nsọ ahụ dị ebube nke oge Solomọn. Ọ bụ eziokwu na ụlọ nsọ ahụ nwere nkwado na nnwapụta nke Chineke, Jehova mere ka ọ pụta ìhè na ihe dị mkpa karịa ụlọ ahụ bụ nguzosi ike na nrubeisi nke ndị ahụ raara onwe ha nye ya. N’ụzọ dị otú a, Nwanna Swingle gosiri na ọmarịcha alaka ụlọ ọrụ ahụ dị n’Igieduma abụghị ebe njedebe n’onwe ya kama na ọ bụ ụzọ a ga-esi mee ka ezi ofufe gaa n’ihu.

N’echi ya, e mere nzukọ ndị pụrụ iche ndị e jikọtara ha na nraranye ahụ n’obodo atọ dị na Nigeria. Ihe karịrị 60,000 mmadụ bịara nnọkọ ndị a.

N’oge ochie, mgbe ndị na-asụ asụsụ Edo na Nigeria bịara ịkwanyere onyeeze ukwu ùgwù, a na-enwe oké ememe na nṅụrị ọṅụ. Igieduma (nke a na-akpọbu ugie dunai) bụ okwu a na-eji eme ihe iji kọwaa ihe ịga nke ọma e nwere n’ime nnọkọ ọṅụ dị otú ahụ. Nye Ndị Jehova, ndị bịara n’ụbọchị nraranye ahụ ịkwanyere Eze nke Eluigwe na Ala, bụ́ Jehova Chineke ùgwù, e nweghị ọtụtụ okwu ọzọ ndị pụrụ izi ezi karịa nke ahụ. Nye 145,025 ndị nkwusa Alaeze nọ na Nigeria, okwu ahụ bụ “Igieduma” na-echetara ha ebe ha na-esi enweta nduzi na ndụmọdụ ọchịchị Chineke, tinyekwara akwụkwọ ndị e biri ebi ndị ga-enyere ha aka ịga n’ihu n’ịrụ ọrụ Chineke n’ụzọ nke Chineke na Nigeria.

[Foto ndị dị na peeji nke 24, 25]

1. Ụlọ obibi ndị ahụ

2. Ụlọ Nzukọ Alaeze

3. Ụlọ services

4. Ọfis

5. Ebe Obibi Akwụkwọ

6. Ụlọ nrụzi ụgbọ ala

7. Ụlọ ígwè na-enye ọkụ

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

Nwanna Brown na nwunye ya n’ihu alaka ụlọ ọrụ e nwere n’afọ ndị 1940

Ebe nnabata ndị ọbịa n’ebe obibi akwụkwo ahụ

Ime ụlọ obibi Betel

[Foto ndị dị na peeji nke 27]

Igwè offset nke na-ebi ihe na kọlọ abụọ

Ibubanye akwụkwọ na moto

Ụlọ Nzukọ Alaeze

Ngalaba Ije Ozi

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya