Ì Na-echeta?
Ọ masịwo gi igu mbiputa Ụlọ Nche ndị na-adịbeghị anya gara aga? Ya bụrụ otú ahụ, lee ma i ga-enwe ike ịza ajụjụ ndị sonụ:
◻ Kemgbe a tụbaworo ndị mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi na Tatarọs, gịnị ka nke a pụtawooro ha? (2 Pita 2:4)
Ha enweghịkwa ọnọdụ ọ bụla ná nzukọ dị nsọ nke Jehova, a na-ebipụ ha pụọ n’ìhè nke sitere n’aka Chineke. Otú ọ dị, ha ka na-eme ihe n’okpuru nduzi Setan, ha nọgidekwara na-enwe mmekọrịta chiri anya n’ebe ụmụ mmadụ nọ, na-agbalị ịchịkwa ndị ikom, ndị inyom, na ọbụna ụmuntakiri. (Mkpughe 12:12, 17)—4/15, peji 14.
◻ N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ‘ịkpọ ihe bụ ihe ọjọọ n’anya Jehova asị’? (Abụ Ọma 97:10)
Ndị kpọrọ ihe ọjọọ asi agaghi achọ ụzọ ha ga-esi kere òkè na ya. N’aka nke ọzọ, ndị na-akpọghị ya asị pụrụ izere ikere òkè na ya kpọmkwem, ma jiri uche ha na-enwe agụụ ikere okè n’ihe ọjọọ.—4/15, peji 21.
◻ Ṅ’ilu Jisọs banyere talent ndị ahụ, ezi ihe mmụta dị aṅaa ka e setịpụụrụ ndị nile na-ekwupụta na ha bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst? (Matiu 25:14-30)
Ha aghaghị ịrụ ọrụ iji mụbaa ihe Onyenwe ha nke eluigwe nwere site n’ikere òkè zuru ezu n’ọrụ nkwusa ahụ. Ọ bụ nanị mgbe ahụ ka ha ga-ejide n’aka na ha ga-anata ịja mma nke Jisọs, natakwa ụgwọ ọrụ. Ha si otú a na-ezere ịbụ ndị a tụpụrụ n’ọchichịrị nke èzí, nakwa e mesia mbibi.—5/1, peji 9.
◻ Gịnị ka Jisọs bụ n’uche mgbe ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha kpee ekpere, sị: “Ewebala anyị n’ime ọnwụnwa”? (Matiu 6:13)
E kwesịghị ịkọwa okwu ahụ dị ka nke pụtara na Jehova na-anwa
anyị ime mmehie. Kama nke ahụ, n’ime otú ahụ, anyị pụrụ ịrịọ Jehova ka ọ ghara ikwe ka anyị kwenye mgbe a nwara ma ọ bụ rụgide anyi inupụrụ ya isi. Anyi pụrụ ịrịọ Nna anyị ka o duzie nzọụkwụ anyị ka ọnwụnwa ọ bụla nke sikarịịrị anyị ike ghara ibiara anyi. (1 Ndị Kọrịnt 10:13)—5/15, peji 19.
◻ Ò kwesịrị ekwesị ka onye Kraịst nara mmịnye nke akụkụ ụfọdụ nke ọbara, dị ka immune globulin ma ọ bụ albumin?
N’irube isi n’iwu Chineke, ndị Kraist adịghị anara mminye ọbara nke ihe ndị bụ isi mejupụtara ọbara—plasma, mkpụrụ ndụ ndị na-acha ụhie uhie, mkpụrụ ndụ ndị na-acha ụcha, ma ọ bụ platelet. Ma otú ọ dị, ụfọdụ Ndịàmà Jehova echewo na ha nwere ike ịnara mmịnye nke otụ n’ime akụkụ protein ndị dị nta dị na plasma. Ọ bụ ihe na-akpali mmasị imara na ụfọdụ n’ime protein ndị a na-esite n’ahụ nwanyị dị ime gafee n’usoro ọsụsọ ọbara nke nwa ahụ o bu n’afọ.—6/1, peji 30, 31.
◻ Nzube dị ahaa ka ọsịsa Jisọs sara ụkwụ ndị na-eso ụzọ ya n’oge Ememe Ngabiga ikpeazụ ahụ dị irè mezuru?
Jisọs na-ezi ndị na-eso ụzọ ya ihe banyere mmadụ iweda onwe ya ala. Ọ dighi onye kwesịri ịchọ ọnọ-dụ mbụ, na-eche na ya dị mkpa. Kama nke ahụ mmadụ nile kwesịrị ịgbaso ihe nlereanya nke Jisọs, na-adị njikere ijerịtara ibe ha ozi n’eleghị mmadụ anya n’ihu, n’agbanyeghị otú ọrụ ahụ si bụrụ ihe dị ala ma ọ bụ nke na-adịghị enye obi ụtọ. (Jọn 13:12-17)—6/15, peji 9.
◻ N’echiche dị aṅaa ka ndị Juu bi na Beria ji ‘nyochaa nke ọma’ ihe e deworo n’Akwụkwọ nsọ? (Ọrụ 17:11)
Ọ bụghị na ndị Beria ahụ rụrụ Pọl na ozi o wetaara ha ụka, kama ha mere nnyocha iji nwapụta na Jisọs bụ Mesaịa ahụ n’ezie. Eziokwu ahụ
nke bụ na ọtụtụ n’ime ha ghọrọ ndị kwere ekwe gosiri na nzube ha ziri ezi. (Ọrụ 17:12)—6/15, peji 18.
◻ Gịnị bụ “akwụkwọ agha dị iche iche nke Jehova”? (Ọnụ Ọgụgụ 21:14)
Nke a bụ ndekọ akụkọ ihe mere eme a pụrụ ịdabere na ya nke agha dị iche iche Chineke lụwooro ndị ya. Ma eleghị anya o nwere mmalite ya ná mmeri ahụ Abraham nwere megide ndị agha ahụ wabatara n’Ala Nkwa ahụ dị ka e dekọrọ ya na Jenesis isi 14. Oké ndezu nke akwụkwọ ahụ ga-abụ “agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile” na Ha-Magedọn. (Mkpughe 16:14, 16)—7/1, peji 20, 22.
◻ Olee ụzọ Okwu Chineke, bụ́ Bible, na-esi enyere anyị aka ịnagide ihe mgbụ?
Bible na-agwa anyi ihe mere Jehova ji kwere ka ihe mgbu digide, ọ na-emesikwa anyị obi ike na ihe mgbu ga-agwụsi n’oge na-adịghị anya. (Ndị Rom 5:12; Mkpughe 21:1-5)—7/15, peji 4, 5.
◻ Olee otú ndị Chineke n’oge a pụrụ isi ‘gosipụta ebube nke Jehova dị ka enyo’? (2 Ndị Kọrint 3:18)
Ebube nke Chineke na-enwupụta site ‘n’ìhè nke ozi ọma nke ebube Kraịst, onye bụ onyinyo Chineke.’ Ndịàmà Jehova na-egosipụta ìhè nke a site n’ikwu okwu banyere ebube nke Jehova na ebube nke Alaeze ya nke dị n’aka Ọkpara ya. (2 Ndị Kọrint 4:4-6)—7/15, peji 15, 16.
◻ Olee mgbe e kwesịrị ime mmadụ baptism?
Baptism bụ ihe a ga-eme mgbe mmadụ meworo nraranye zuru ezu, nke a na-akparaghị ókè, nke ihe ọ bụla na-apụghịkwa igbanwe, nye Jehova site na Kraịst Jisọs ime uche Chineke.—8/1, peji 14.