Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 2/01 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2001
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite February 12
  • Izu Na-amalite February 19
  • Izu Na-amalite February 26
  • Izu Na-amalite March 5
Ozi Alaeze Anyi—2001
km 2/01 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite February 12

Abụ nke 6

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. A ga-atụle vidio bụ́ The Bible—Mankind’s Oldest Modern Book ná Nzukọ Ije Ozi n’izu nke February 26. Ntụle ahụ ga-adabere n’ajụjụ ndị e depụtara na peeji nke 7 nke mbipụta nke a nke Ozi Alaeze Anyị.

15 min: “Nye Jehova Otuto Site n’Ọrụ Ọma.”a Gụnye ihe ndị e kwuru n’akwụkwọ Proclaimers, peeji nke 187, paragraf nke 2-3.

20 min: “Ụzọ Isi Mee Ka Ndị Ọzọ Kwenye.” Nkwurịta okwu nke onye nduzi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ na onye ọsụ ụzọ ma ọ bụ onye nkwusa dị irè ga-enwe, dabere n’isiokwu ahụ nakwa n’isi ihe ndị a họtara site n’Ụlọ Nche nke May 15, 1998, peeji nke 21-23. Tụleenụ igbe dị na peeji nke 23, “Iru n’Obi Onye Ị Na-amụrụ Ihe.” Mgbe unu họrọsịịrị otu nkwenkwe okpukpe ụgha a na-anụkarị n’ókèala ọgbakọ, kwurịtanụ ụzọ isi mee ka mmadụ kwenye n’ihe Bible na-ekwu n’isiokwu ahụ.

Abụ nke 208 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite February 19

Abụ nke 221

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.

13 min: Mkpa ọgbakọ. Tụlee “Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Ụbọchị Mgbakọ Pụrụ Iche.”

22 min: “Mee Ka A Mara Aha Jehova na Omume Ya.”b Onye okenye atụlee atụmatụ ndị pụrụ iche ọgbakọ na-eme maka ọrụ ka ukwuu na March na April, gụnyere mgbalị a na-eme iji gbaa ọtụtụ ndị ume ruo n’ókè o kwere mee ịsụ ụzọ inyeaka. Kpọọ ụfọdụ ndị sụrụ ụzọ n’April gara aga ka ha kọọ afọ ojuju ime otú ahụ wetaara ha. Lekwasị anya n’inyere onye nkwusa ọ bụla na-adịghị ejekwa ozi, nke ruru eru, aka isonyeghachiri anyị n’ozi nakwa n’inyere ụmụaka na ndị ọzọ a na-amụrụ Bible aka iru eru dị ka ndị nkwusa a na-emebeghị baptism.—Lee Igbe Ajụjụ dị n’Ozi Alaeze Anyị nke November 2000.

Abụ nke 27 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite February 26

Abụ nke 48

8 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka February.

12 min: Ụzọ Iche Ihe n’Ihu Ndị A Tụrụ Aro Ha Maka Akwụkwọ Ihe Ọmụma. Ọ̀ dị ụzọ iche ihe n’ihu nke i bu n’obi maka iji nyefee akwụkwọ Ihe Ọmụma na March? Ọ bụrụ na i lee anya n’azụ mbipụta Ozi Alaeze Anyị ndị gara aga, ị ga-ahụ aro dị iche iche maka nleta mbụ, ọtụtụ n’ime ha nwekwara aro maka ime nletaghachi. Tụleghachi abụọ ma ọ bụ atọ n’ime ụzọ iche ihe n’ihu ndị a a tụrụ aro ha. (March, June, November 1996; June 1997; March 1998) Mee ihe ngosi nke aro abụọ dị ná mbipụta nke November 1996 maka iji ụzọ ịga n’ihe kpọmkwem amalite ọmụmụ Bible. Gbaa mmadụ nile ume itinye mgbalị pụrụ iche iji malite ọmụmụ ihe ndị ọhụrụ.

25 min: “Ime Ka E Nwee Ekele Maka Vidio bụ́ The Bible—Mankind’s Oldest Modern Book.” Okwu a ga-eso ndị na-ege ntị tụlee na-eji ajụjụ ndị e depụtara na peeji nke 7 eme ihe. Mee ka ọ pụta ìhè bụ́ eziokwu ahụ bụ́ na n’ihi na e bipụtawo ihe karịrị 100 nde n’ime ya n’ozuzu ma ọ bụ n’akụkụ ya ụfọdụ n’asụsụ 37, New World Translation bụ otu n’ime Bible ndị a kasị ekesa. N’April, anyị ga-atụle vidio nke atọ dị n’usoro a, nke bụ́ The Bible—Its Power in Your Life. N’ọnọdụ ya unu pụrụ ịtụle “Chineke Na-ahụ Onye Weere Obi Ụtọ Na-enye n’Anya.” Okwu onye okenye ga-ekwu dabere n’Ụlọ Nche nke November 1, 1998, peeji nke 24-28.

Abụ nke 64 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite March 5

Abụ nke 81

5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

18 min: “Jehova Na-enye Ike.”c Jụta ndị na-ege ntị otú akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ahụ si metụta ihe a na-atụle.

22 min: “Iji Telifon Na-agba Àmà n’Ụzọ Na-aga nke Ọma.”d Nke onye nlekọta ije ozi ga-eme. Gụnye agbamume dị n’Ụlọ Nche nke December 15, 1999, peeji nke 23, paragraf nke 17. Mee ndokwa ka a kọọ ahụmahụ ole na ole dị mkpirikpi ndị na-egosi ihe ịga nke ọma e nwere n’ọrụ a n’ókèala unu ma ọ bụrụ na ọ dị. N’ọnọdụ ya unu pụrụ ịtụle “Ì Nwere ‘Obi Na-anụ Ihe’?” Okwu onye okenye ga-ekwu dabere n’Ụlọ Nche nke July 15, 1998, peeji nke 29-31.

Abụ nke 108 na ekpere mmechi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

d Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya