Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na February: Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!, ma ọ bụ akwụkwọ ọ bụla mere ochie karị bụ́ nke nwere peeji dị 192 nke ọgbakọ nwere. March: Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. A ga-eme mgbalị pụrụ iche ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi. April: Magazin Ụlọ Nche na Teta! Ebe e gosiri mmasị mgbe a gara nletaghachi, a pụrụ inyefe ụtụ. Nyefee akwụkwọ Ihe Ọmụma ma ọ bụ broshuọ Na-achọ, na-eburu n’obi ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi.
◼ Onyeisi oche ndị nlekọta ma ọ bụ onye ọ họpụtara kwesịrị ịgụzigharị ihe ndekọ ego ọgbakọ na March 1 ma ọ bụ ngwa ngwa o kwere omume mgbe ọ gasịrị. Mgbe e meworo nke a, maara ọgbakọ ọkwa mgbe a gụsịrị akụkọ ndekọ ego ọzọ.
◼ Odeakwụkwọ na onye nlekọta ije ozi kwesịrị ịtụleghachi ọrụ ndị ọsụ ụzọ oge nile dum. Ọ bụrụ na nke ọ bụla na-enwe ihe isi ike ịrụzu ọnụ ọgụgụ awa a chọrọ, ndị okenye kwesịrị ime ndokwa ka e nyere ya aka. Maka aro ụfọdụ, tụleghachi akwụkwọ ozi bụ́ S-201 ndị Society na-ezite kwa afọ. Leekwa paragraf nke 12-20 n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke September 1986.
◼ Society na-achọsi ike ụmụnna nwoke nwere ahụmahụ n’ịnya bọs, obere ụgbọala na gwongworo. Onye ọ bụla nke chere na ya ruru eru, nke nwekwara mmasị ije ozi na Betel kwesịrị ideta akwụkwọ iji gwa Society ma kwuo ka e zitere ya fọm Betel, ọ gwụla ma o nwetaworị fọm ahụ ná mgbakọ distrikti e mere na nso nso a. Ndị na-etinye akwụkwọ kwesịrị ịbụ ụmụnna nwoke na-enweghị nwunye, bụ́ ndị nọ n’agbata afọ 19 na 35.
◼ Akwụkwọ ọhụrụ ndị e nwere:
Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I—Bekee, Efịk, French, Gun, Igbo, Yoruba
Ndịàmà Jehova—Ole Ndị Ka Ha Bụ? Gịnị Ka Ha Kweere?—Bekee, Igbo
Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!—Bekee, Efịk, French, Gun, Hausa, Igbo, Isoko, Tiv, Yoruba
◼ Biko rịba ama na Ememe Ncheta nke 2002 ga-abụ na Thursday, March 28, mgbe anyanwụ dasịrị dị ka a mara ọkwa ya n’Ozi Alaeze Anyị nke January 2001, ọ bụghị na Friday, March 22, dị ka e gosiri ná ngwụcha kalenda 2001.