Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 2/01 p. 3-4
  • Mee Ka A Mara Aha Jehova na Omume Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mee Ka A Mara Aha Jehova na Omume Ya
  • Ozi Alaeze Anyi—2001
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Kwusaa Okwu Chineke n’Ụzọ Zuru Ezu”
    Ozi Alaeze Anyi—2002
  • ‘Gbasie Àmà Ike Banyere Ozi Ọma Ahụ’
    Ozi Alaeze Anyi—2008
  • Nọgide Na-akọ Banyere Oké Ọrụ Nile nke Jehova
    Ozi Alaeze Anyi—2004
  • Kpọsaa Ịdị Mma Jehova n’Ebe Nile
    Ozi Alaeze Anyi—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2001
km 2/01 p. 3-4

Mee Ka A Mara Aha Jehova na Omume Ya

1 “Keleenụ Jehova, kpọkuonụ aha Ya; meenụ ka a mara omume Ya nile n’etiti ndị nile n’ụwa. . . . Ka obi ndị na-achọ Jehova ṅụrịa.” (Abụ Ọma 105:1, 3) Ọbụ abụ ahụ bụ́ onye dere okwu ndị ahụ nwetara ọṅụ dị ukwuu n’onwe ya n’ịgwa ndị ọzọ banyere Jehova na “omume” ya. Omume ndị dị aṅaa? Obi abụọ adịghị ya na ọ bụ ndị e jikọtara ha na ịchịisi dị ebube nke Chineke nakwa “ozi nzọpụta Ya.”—Abụ Ọma 96:2, 3; 145:11, 12.

2 Ka anyị na-eru nso n’oge Ememe Ncheta 2001, anyị nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji na-aṅụrị ọṅụ banyere otú Jehova si na-emeso anyị ihe. N’ihi gịnị? Obi abụọ adịghị ya na Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị bụ ememe kasị mkpa n’afọ nye ezi ndị Kraịst nile. Ọ dịghị ememe ọzọ dị ka ya ma a bịa n’ịdị mkpa, nzube, ma ọ bụ n’ụzọ e si eme ya. Nke a bụ oge anyị nile ga-echeta ihe Jehova na Jisọs meworo iji meghee ụzọ maka nzọpụta anyị. Ka a sịkwa ihe mere na n’oge Ememe Ncheta, anyị na-atụkarị anya ịhụ mmụba n’ozi ubi, ka anyị na-eme ka a mara “ozi nzọpụta Ya”!

3 Ị̀ Ga-asụ Ụzọ Inyeaka? N’April gara aga, ọnụ ọgụgụ kasị elu e nwetụrụla nke bụ́ mmadụ 153,774 denyere aha dị ka ndị ọsụ ụzọ inyeaka. N’afọ a, ànyị pụrụ ime March na April ọnwa ndị pụrụ iche maka ọrụ ka ukwuu n’ozi? March nwere Saturday ise, April nwekwara Sunday ise. Site n’ime atụmatụ ije ozi ụbọchị dum ná ngwụsị izu, ọtụtụ ndị nkwusa bụ́ ndị nwere ọrụ oge nile achọpụtawo na ha pụrụ ịsụ ụzọ inyeaka. Iji rụtazuo awa 50 a chọrọ kwa ọnwa, ọ dị onye ọsụ ụzọ inyeaka mkpa inweta ihe dị ka awa 12 ná nkezi kwa izu. Jiri nlezianya tụlee usoro ihe omume a tụrụ aro ya n’igbe dị na peeji nke 4. Otu n’ime ha ọ̀ pụrụ ịdaba n’ọnọdụ gị? Ọ bụrụ na ọ dabaghị, ikekwe ị pụrụ imepụta usoro ihe omume nke gị maka iji sụọ ụzọ inyeaka na March na April afọ a.

4 Ndị okenye kwesịrị ịmalite ugbu a kwalitewe ịnụ ọkụ n’obi na nkwado maka ije ozi ka ukwuu. N’afọ gara aga, n’otu ọgbakọ ebe ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi nile denyere aha ha dị ka ndị ọsụ ụzọ inyeaka, mmadụ 64 n’ime ndị nkwusa 121 sụrụ ụzọ n’April! Obi tọkwara ọgbakọ ụtọ ịhụ ka ndị nkwusa isii a na-emebeghị baptism malitere inye akụkọ ozi na March na April. N’ezie, ọ bụ oge kasị mma ka ụmụaka na ndị ọhụrụ jụọ ndị okenye ma hà ruru eru ịmalite ikere òkè n’ọrụ ịgba àmà a na-arụ maka ọha.

5 Itinyekwu Mgbalị Na-eweta Ngọzi: Ọgbakọ ndị na-esetịpụ ihe mgbaru ọsọ ndị pụrụ iche ma na-etinyekwu mgbalị na-enweta ọtụtụ ngọzi. Ọgbakọ ụfọdụ pụrụ itinye uche karịsịa n’ịrụzu ókèala a na-adịghị arụkebe, na-elekwasị anya n’ụdị ụzọ ndị ọzọ nke ịgba àmà, ma ọ bụ imesi iji telifon agba àmà ike—ụzọ dị irè nke isi na-akpọtụrụ ndị na-anọghị n’ụlọ nakwa ndị bi n’ebe na-adịghị mfe ngaru.

6 Ọ̀ bụ iwu na ahụ esighị ike ma ọ bụ ime agadi ga-egbochi onye ọ bụla ikere òkè ruo n’ókè o kwere mee n’ozi? Ọ bụghị n’ọnọdụ nile. Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwanyị dị afọ 86, onye na-arịa ọrịa cancer, sụrụ ụzọ inyeaka n’April n’agbanyeghị ụkwụ ya zara aza. Iji telifon agba àmà mere ka o kwe ya omume ikere òkè zuru ezu n’ozi, na-amụba otuto ọ na-enye Jehova. Nke a nwere mmetụta na-akpali akpali ma n’ebe ọ nọ ma n’ọgbakọ.

7 Kwadebe nke Ọma Maka Ememe Ncheta: N’afọ a, Ememe Ncheta dabara n’April 8. Ebe nke a bụ na Sunday, o kwesịrị ikwekwu ọtụtụ ndị omume ịbịa. Anyị pụrụ inwe ọnụ ọgụgụ kasịnụ anyị nwetụworo ma ọ bụrụ na anyị emee òkè nke anyị site (1) n’anyị onwe anyị ịbịa nakwa (2) ịkpọ ndị ọzọ òkù isonyere anyị n’Ememe Ncheta. Ole ndị ka anyị kwesịrị ịkpọ?

8 Nyochaa ihe ndekọ ozi ubi gị maka aha nke ndị gosiworo mmasị n’eziokwu ahụ, ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na ị dịghị agachi anya na nke ha. Izu abụọ ma ọ bụ atọ tupu Ememe Ncheta, lekwasị anya n’iji akwụkwọ ịkpọ òkù maka Ememe Ncheta gaa leta ndị a nile. Ọ bụrụ na ọnọdụ gị enye ohere maka ya, kweta imere ndị ga-enwe mmasị ịbịa ndokwa otú ha ga-esi bịa.

9 N’ọgbakọ ụfọdụ, a naghị eji akwụkwọ ịkpọ òkù Ememe Ncheta nile ahụ e biri ebi eme ihe. Ndị odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ijide n’aka na e wepụtara akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ n’ezigbo oge ka e wee kesaa ha nile. Ị pụrụ ịchọ iji ígwè typewriter ma ọ bụ aka gị denye n’ụzọ dị mma oge na ebe a ga-anọ mee Ememe Ncheta n’ala ala nke akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ. Ma ọ bụ ị pụrụ inyefekọta ya na mpempe akwụkwọ na-egosi adres Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụrụ na ọ bụ ebe ahụ ka unu ga-anọ mee Ememe Ncheta ahụ. Dị ka ihe ncheta, n’ihe ka ọtụtụ n’ọnọdụ, e kwesịrị inye onye nwe ụlọ akwụkwọ ịkpọ òkù Ememe Ncheta ihu na ihu.

10 Cheta Ndị Na-adịghị Ejekwa Ozi: Ọ bụ ihe na-enye ọṅụ mgbe onye a na-amụrụ Bible raara onwe ya nye Jehova ma gosipụta nke a site n’ịbụ onye e mikpuru n’ime mmiri. Otú ọ dị, kwa afọ, ụfọdụ ndị n’etiti anyị na-akwụsị iso anyị akpakọrịta, ha na-akwụsịkwa ịgwa ndị ọzọ banyere aha Jehova na otú o si eme ihe. Anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji nwee nchegbu. Ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtụ ná ndị na-adịghị ejekwa ozi ajụbeghị eziokwu ahụ, ọ pụrụ ịbụ na ha akwụsịwo ime nkwusa n’ihi nkụda mmụọ, nsogbu onwe onye, ma ọ bụ nchegbu ndị ọzọ nke ndụ. (Mat. 13:20-22) Ndị nwere ike ọgwụgwụ ime mmụọ chọrọ enyemaka iji lọghachite n’ọgbakọ tupu usoro ihe Setan elomie ha. (1 Pita 5:8) N’oge Ememe Ncheta a, anyị chọrọ itinye mgbalị pụrụ iche iji nyere ndị nile ruru eru bụ́ ndị na-adịghị ejekwa ozi aka ikere òkè ọzọ n’ikwusa ozi ọma.

11 Odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ime ka ndị nduzi ọmụmụ akwụkwọ mara banyere ndị ọ bụla na-adịghị ejekwa ozi so n’ígwè ha. Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ ga-ebute ụzọ n’ime ndokwa ka e jee nleta ọzụzụ atụrụ na nke ndị nile na-adịghị ejekwa ozi. Ọ bụrụ na a chọpụta na onye ahụ ga-erite uru site n’iduziri ya ọmụmụ Bible, onye nlekọta ije ozi ga-eme ndokwa ka e nye aka, mgbe ya na ndị ọzọ so na kọmitịị ije ozi gbasịworo izu iji chọpụta onye ga-akasi kwesị ekwesị iduzi ọmụmụ ihe ahụ. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na ọ gaghị adị mkpa iduzi ọmụmụ ihe ahụ ruo ogologo oge, onye e kenyere iduzi ya pụrụ ịgụrụ oge, nletaghachi, na ọmụmụ Bible.

12 N’April gara aga, otu nwanna nwanyị nke na-arụ ọrụ site n’ụlọ ruo n’ụlọ nyere otu nwa okorobịa magazin n’okporo ámá. O kwuru na nwunye ya bụ Onyeàmà na-adịghị ejekwa ozi. Ọ jụrụ ebe Ụlọ Nzukọ Alaeze dị, gwakwa nwanna nwanyị ahụ ka ọ bịa leta ya na nwunye ya. N’ihi ya, di na nwunye ahụ gara nzukọ na-esonụ, kwerekwa ka a mụọrọ ha Bible.

13 Jikere Maka Ọrụ Ka Ukwuu! Ọbụ abụ ahụ bụ́ onye kwupụtara na anyị kwesịrị ime ka a mara aha Jehova na otú o si eme ihe gbakwụnyere, sị: “Bụkuonụ Ya abụ, bụkuonụ Ya abụ ọma; tụgharịanụ uche n’oké ọrụ Ya nile. Na-etonụ onwe unu n’aha nsọ Ya.” (Abụ Ọma 105:2, 3) Ka anyị gosipụta nchegbu anyị nwere maka aha ukwu Jehova na “oké ọrụ” ya site n’anyị ịmụba mgbalị anyị na-etinye n’ozi, na-eme oge Ememe Ncheta a nke kasịnụ e nwetụworo!

Igbe dị na peeji nke 4]

Ụzọ Dị Iche Iche Isi Mee Ndokwa Maka Awa 12 Kwa Izu Iji Sụọ Ụzọ Inyeaka

Ụbọchị Awa

Monday 1 2 − −

Tuesday 1 − 3 −

Wednesday 1 2 − 5

Thursday 1 − 3 −

Friday 1 2 − −

Saturday 5 4 3 5

Sunday 2 2 3 2

Ngụkọta: 12 12 12 12

Otu n’ime usoro ihe omume ndị a ọ̀ pụrụ ịdabara gị? Ma ọ́ dabaraghị gị, gịnị ma i mepụta usoro ihe omume nke gị?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya