Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 1/08 p. 3-6
  • ‘Gbasie Àmà Ike Banyere Ozi Ọma Ahụ’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Gbasie Àmà Ike Banyere Ozi Ọma Ahụ’
  • Ozi Alaeze Anyi—2008
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Kpọsaa Ịdị Mma Jehova n’Ebe Nile
    Ozi Alaeze Anyi—2007
  • “Kwusaa Okwu Chineke n’Ụzọ Zuru Ezu”
    Ozi Alaeze Anyi—2002
  • Nọgide Na-akọ Banyere Oké Ọrụ Nile nke Jehova
    Ozi Alaeze Anyi—2004
  • Oge Ncheta Ọnwụ Jizọs—Oge E Ji Agakwu Ozi Ọma!
    Ozi Alaeze Anyi—2011
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2008
km 1/08 p. 3-6

‘Gbasie Àmà Ike Banyere Ozi Ọma Ahụ’

1. Olee ozi ọma anyị nwere izi ndị mmadụ?

1 N’ụwa ebe akụkọ ọma dị ụkọ, anyị nwere ihe ùgwù nke “ịgbasi àmà ike banyere ozi ọma nke obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ.” (Ọrụ 20:24) Nke a gụnyere ime ka ndị mmadụ mara na n’oge na-adịghị anya, ụwa ọhụrụ ezi omume nke Jehova, bụ́ ebe ‘ihe mbụ niile ga-agabigawo,’ ga-anọchi anya ‘oge ikpeazụ a.’ (2 Tim. 3:1-5; Mkpu. 21:4) N’oge ahụ, ọrịa agaghị adịkwa. (Aịza. 33:24) Ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ga-esi n’ili pụta ma gakwurughachi ndị ikwu na ibe ha. (Jọn 5:28, 29) A ga-eme ka ụwa niile ghọọ paradaịs mara mma. (Aịza. 65:21-23) Nke a bụ naanị ihe atụ nke ozi ọma anyị nwere izi ndị mmadụ!

2. Olee ihe mere oge Ncheta Ọnwụ Jizọs ji bụrụ oge magburu onwe ya iji kwusaa ozi ọma?

2 Ọnwa March, April, na May ga-abụ ọnwa ndị magburu onwe ha iji zisaa ozi ọma dị otú ahụ. N’ọnwa ndị a n’ọtụtụ ebe n’ụwa, ihu igwe na-adị mma, bụ́ nke na-eme ka ọ dịrị ndị mmadụ mfe ịnọ ọdụ n’ozi. Ọzọkwa, a ga-eme ihe omume kasị mkpa a na-eme n’afọ, bụ́ Ncheta Ọnwụ Jizọs, gburugburu ụwa mgbe anyanwụ dasịrị na Saturday, March 22. Anyị kwesịrị ịmalite ugbu a kwadowe ịmụba ozi anyị.

3. Olee ihe ga-enyere ezinụlọ dị iche iche aka ịmụba ozi ha?

3 Rụọ Ọrụ Ọsụ Ụzọ Inyeaka: Ì nwere ike ịhazi onwe gị iji rụọ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka n’otu n’ime ọnwa atọ ndị a, ma ọ̀ bụ abụọ, ma ọ̀ bụkwanụ ha atọ? Ọ́ gaghị adị mma ka unu wepụta oge n’oge ọzọ unu ga-enwe ọmụmụ ihe ezinụlọ unu iji tụlee okwu a? Ọ bụrụ na mmadụ niile nọ n’ezinụlọ agbakọta aka, otu onye n’ime ha ma ọ bụ karịa nwere ike ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. (Ilu 15:22) Kpegaranụ Jehova ekpere banyere okwu a, unu ga-ahụkwa otú ọ ga-esi gọzie mgbalị unu. (Ilu 16:3) Ya bụrụgodị na ọ dịghị onye nọ n’ezinụlọ unu nke ga-enwe ike ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka, mmadụ niile nọ n’ezinụlọ nwere ike isetịpụrụ onwe ha ihe mgbaru ọsọ nke ịmụba ozi ha site n’iso ndị ọsụ ụzọ aga ozi ọma.

4. Olee otú anyị nwere ike isi hazie oge anyị iji rụọ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka ma ọ bụrụ na ọrụ anyị anaghị enye anyị ohere?

4 Ọ bụrụ na ị na-arụ ọrụ na-anaghị enye gị ohere, i nwere ike ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka ma ọ bụrụ na ị hazie oge gị nke ọma. I nwere ike iji oge ụfọdụ kwusaa ozi ọma mgbe ị na-ezu ike nri ehihie. Ma ọ bụ i nwere ike ịrịọ ka e kenye gị ókèala n’ebe dịdebere ụlọ gị ma ọ bụ ụlọ ọrụ gị ka i wee nwee ike iji ihe dị ka otu awa zie ozi ọma tupu gị amalite ọrụ ma ọ bụ mgbe i mechiri ọrụ. I nwere ike inwetatụkwu ohere site n’itinye ihe ndị na-adịchaghị mkpa n’ọnwa ọzọ ma ọ bụ site n’ịga ozi malite n’ụtụtụ ruo ná mgbede ná ngwụsị izu. Ụfọdụ anatala ezumike otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ n’ebe ọrụ ha ka ha jiri ya gaa ozi ọma.

5. Olee otú i nwere ike isi nyere ndị agadi ma ọ bụ ndị ọrịa aka ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka?

5 Ya bụrụ na i meela agadi ma ọ bụ na-arịa ọrịa, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na i nwechaghị ume, i nwere ike ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka site n’iji obere oge agatụ ozi ọma kwa ụbọchị. Rịọ Jehova ka o nye gị “ike karịrị ike nkịtị.” (2 Kọr. 4:7) Otu nwanna nwaanyị rụrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka mgbe ọ gbara otu narị afọ na isii! N’ihi enyemaka nke ndị ikwu ya bụ́ Ndị Kraịst na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ, o mere nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ, gaa nletaghachi, gaa duzie ọmụmụ Baịbụl, ma kere òkè n’akụkụ ndị ọzọ nke ozi anyị. O nyere aka malitere mmadụ iri ọmụmụ Baịbụl. O kwuru, sị: “Ọ na-abụ m cheta ihe ùgwù magburu onwe ya m nwere ije ozi dị ka onye ọsụ ụzọ inyeaka, obi m na-ejupụta n’ịhụnanya maka Jehova, Ọkpara ya, na nzukọ Ya, m na-ekelekwa ha. M chọrọ nnọọ ịsị Jehova, ‘i meela!’”

6. Olee otú onye na-eto eto e merela baptizim nke ka na-aga akwụkwọ nwere ike isi rụọ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka?

6 Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto e merela baptizim nke ka na-aga akwụkwọ, i nwekwara ike ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. Dị ka ndị ọrụ ha na-anaghị enye ohere, o nwere ike ịbụ na oge ị ga-ewepụta iji na-aga ozi ga-abụkarị ná ngwụsị izu. Ikekwe, i nwekwara ike iji ihe dị ka otu awa gaa ozi ma a gbasaa akwụkwọ n’ụbọchị ụfọdụ. Ùnu ga-enwe ezumike ụlọ akwụkwọ nke ị pụrụ iji gaa ozi ọma? Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka, gwa ndị mụrụ gị.

7. Olee ihe ndị okenye nwere ike ime iji kpalie ụmụnna ijekwu ozi n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs?

7 Mee Ka Ọ Nụọ Ndị Mmadụ Ọkụ n’Obi: Ndị okenye nwere nnọọ ike iji ihe nlereanya ha kpalie ndị nọ n’ọgbakọ ha ịchọ ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. (1 Pita 5:2, 3) Ha nwere ike ime ndokwa ka e nwekwuo nzukọ ije ozi ubi maka ndị ga-achọ ịga ozi n’isi ụtụtụ, ma ọ bụ mgbe a gbasara akwụkwọ, ma ọ bụkwanụ mgbe ọrụ mechiri. Onye nlekọta ije ozi kwesịrị ịhụ na e kenyere ụmụnna ndị ruru eru iduzi nzukọ maka ozi ubi, nakwa na e nwere ókèala, magazin, nakwa akwụkwọ ga-ezunụ n’ọnwa ndị a a ga-eje ozi n’ụzọ pụrụ iche.

8. Olee ihe anyị mụtara site n’ihe mere n’otu ọgbakọ?

8 N’otu ọgbakọ, ọnwa ole na ole tupu oge Ncheta Ọnwụ Jizọs eruo, ndị okenye malitere ịgba ụmụnna ume ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. Ha na-amara ọgbakọ ọkwa kwa izu mmadụ ole a kwadorola ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. Nke a mere ka obi sie ndị na-achọ ịmụba ozi ha ike na ha ga-enwe ọtụtụ ndị ha na ha ga na-eso aga ozi. A haziri ka e nwekwuo nzukọ ije ozi ubi n’isi ụtụtụ nakwa ná mgbede. Ihe si na ya pụta bụ na ndị nkwusa iri ise na atọ rụrụ ọsụ ụzọ inyeaka n’April, bụ́ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara nke ndị nkwusa nọ n’ọgbakọ ahụ!

9. Olee ihe mere oge Ncheta Ọnwụ Jizọs ji bụrụ oge magburu onwe ya maka ndị ruru eru ịmalite ikwusa ozi ọma?

9 Nyere Ndị Ọzọ Aka Ikwusa Ozi Ọma: Mgbe ndị ọhụrụ na ndị na-eto eto ruru ịghọ ndị nkwusa, e nwere ike ịgwa ha ka ha soro ndị nkwusa nwerela ahụmahụ gaa ozi ọma. E nwere ike inwe ohere ime nke ahụ n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs, bụ́ mgbe ọtụtụ ndị nọ n’ọgbakọ ga-amụba ozi ha. Ò nwere onye ị na-amụrụ Baịbụl nke na-enwe ọganihu, bụ́ onye merela ka ndụ ya kwekọọ n’ụkpụrụ ezi omume Jehova? Ì nwere ụmụ na-akpa ezi àgwà bụ́ ndị na-enwe nnọọ ọganihu ma ha aghọbeghị ndị nkwusa? Ọ bụrụ na ndị dị otú ahụ agwala gị na ha chọrọ ịghọ ndị nkwusa, gị echeekwa na ha ruru eru, gwa otu n’ime ndị okenye. Onyeisi oche ndị nlekọta ga-eme ndokwa ka gị na nwa gị ma ọ bụ onye ahụ ị na-amụrụ ihe na ndị okenye abụọ kwurịta ya.

10. Olee ihe ndị okenye nwere ike ime iji nyere ndị na-anaghị ejekwa ozi aka?

10 Ọnwa ndị a na-abịa abịa ga-abụkwa oge pụrụ iche e nwere ike iji nyere ndị na-anaghị ejekwa ozi aka ịmaliteghachi iso ọgbakọ eje ozi. Ndị nlekọta Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ na ndị okenye ndị ọzọ ga-agbalịsi ike ileta ndị dị otú ahụ ma kpọọ ha òkù n’otu n’otu iso ha gaa ozi ọma. Ya bụrụ na ọ dịla anya ha kwụsịrị ije ozi, ndị okenye abụọ kwesịrị ibu ụzọ gwa ha okwu iji chọpụta ma ha rukwara eru.—km-IB 11/00 p. 7.

11. Olee ụzọ kasịnụ Chineke sirila gosi ‘obiọma ya na-erughịrị mmadụ’?

11 Kwadebe Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: Ihe mgbapụta Chineke nyere anyị bụ ụzọ kasịnụ o sirila gosi anyị ‘obiọma ya nke na-erughịrị mmadụ.’ (Ọrụ 20:24) Ọtụtụ nde ndị nwere ekele maka ihe mgbapụta a n’ụwa niile ga-ezukọta na Saturday, March 22, mgbe anyanwụ dasịrị, iji cheta ọnwụ Kraịst. Anyị kwesịrị ịkpọ ndị niile nwere obi eziokwu òkù ịbịa ncheta a dị oké mkpa nke na-agba àmà banyere obiọma na-erughịrị mmadụ Jehova nwere n’ebe ụmụ mmadụ nọ ma nyere ha aka ịbịa.

12. Olee ndị anyị kwesịrị ịkpọ òkù maka Ncheta Ọnwụ Jizọs?

12 Depụta aha ndị ị chọrọ ịkpọ. Obi abụọ adịghị ya na ị ga-edenye aha ndị ikwu gị, ndị agbata obi gị, ndị ọrụ ibe gị, ụmụ akwụkwọ ibe gị, ndị ị na-amụburu Baịbụl na ndị ị ka na-amụrụ Baịbụl ugbu a, na ndị niile ị na-aga nletaghachi na nke ha mgbe niile. Ọ bụrụ na ụfọdụ ndị ị kpọrọ òkù nwere ajụjụ ha chọrọ ịjụ banyere Ncheta Ọnwụ Jizọs, i nwere ike ịga n’ihe odide ntụkwasị dị n’akwụkwọ Bible Na-akụzi na peeji nke 206-208, nke na-ekwu banyere Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. Nke a nwedịrị ike ime ka ị malite iduzi ọmụmụ Baịbụl n’ihi na ọ ga-enye gị ohere igosi onye nwe ụlọ akwụkwọ anyị ji eduziri ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl.

13. Olee otú Jehova siri gọzie mgbalị nke ndị nkwusa abụọ, bụ́ ndị kpebisiri ike ịkpọ ndị mmadụ òkù ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs?

13 Otu nwanna nwaanyị depụtara ezinụlọ iri anọ na asatọ ọ ga-akpọ òkù. Ezinụlọ nke ọ bụla ọ kpọrọ, ya akanye ihe n’aha ha iji gosi na ọ kpọọla ha, detuokwa ụbọchị ọ kpọrọ ha. Obi dị ya nnọọ ụtọ na mmadụ iri abụọ na isii n’ime ndị ọ kpọrọ bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs! Otu nwanna nwoke nke nwere ụlọ ahịa kpọrọ onye na-erere ya ahịa, nke bụbu onye ụkọchukwu. Nwoke ahụ bịara ma mesịa tie mkpu, sị, “Ihe m mụtara na Baịbụl n’otu awa karịrị nnọọ ihe m mụtara n’afọ iri atọ m nọrọ na Chọọchị Katọlik.” Obere oge ka Ncheta Ọnwụ Jizọs gasịrị, o kwetara ka e jiri akwụkwọ Bible Na-akụzi mụwara ya ihe.

14. Olee mkpọsa a ga-eme gburugburu ụwa malite na March 1?

14 Mkpọsa: Malite na Saturday, March 1, ruo na March 22, a ga-ekesa akwụkwọ ịkpọ òkù pụrụ iche maka Ncheta Ọnwụ Jizọs gburugburu ụwa. Mmadụ niile kwesịrị iso mee mkpọsa a dị mkpa. Ọ ga-aka mma inye onye nwe ụlọ akwụkwọ ịkpọ òkù n’aka karịa ịfanye ya n’ọnụ ụzọ ya. Ma, ọ bụrụ na ókèala unu buru ibu, ndị okenye unu nwere ike ikpebi ka e jiri akọ debere ndị na-anọghị n’ụlọ akwụkwọ ịkpọ òkù. Ná ngwụsị izu, anyị ga na-enyekwa ndị mmadụ magazin anyị ndị ọhụrụ.

15. Olee otú anyị nwere ike isi nye ndị mmadụ akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ?

15 Ebe ọ bụ na oge anyị nwere iji kesaa akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ ebughị ibu, ọ ga-akasị mma ikwu naanị okwu ole na ole tupu anyị enye ya mmadụ. Jiri ihu ọchị na ịnụ ọkụ n’obi na-ekesa ya. I nwere ike ikwu ihe dị ka nke a: “Anyị chọrọ ịhụ na a kpọrọ ma gị, ma ndị ezinụlọ gị, ma ndị enyi gị òkù ịbịa otu ihe omume pụrụ iche a ga-eme na March 22. Lekwa akwụkwọ ịkpọ òkù nke gị. E dere ihe ndị ọzọ ga-adị gị mkpa ịmata n’akwụkwọ ịkpọ òkù a.” Onye nwe ụlọ nwere ike inwe ajụjụ. Ma ọ bụkwanụ ya anara akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ ma kwuo na ya ga-abịa. Detuo aha ya na otú o si gosi mmasị ma mee ndokwa ịgaghachi na nke ya.

16. Olee ahụmahụ e nwere nke gosiri uru ọ bara ịkpọ ndị bi n’ókèala anyị òkù ịbịa Ncheta Ọnwụ Jizọs?

16 N’afọ gara aga, otu onye agha hụrụ akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ n’ọnụ ụzọ ya. O kpebiri na ya ga-aga, ma ọ ghaghị ịnata onye ka ya n’ọkwá ikike. Mgbe o gosiri nna ya ukwu akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ, nna ya ukwu gbachiri nkịtị ma mechaa kwuo na ndị mụrụ ya bụ Ndịàmà nakwa na ya na-esobu ha aga ọmụmụ ihe. Ọ bụghị naanị na o nyere onye agha ahụ ikike ịga kamakwa o so ya gaa Ncheta Ọnwụ Jizọs!

17. Olee otú anyị si egosi na nzube nke obiọma na-erughịrị anyị Chineke meere anyị efunahụbeghị anyị?

17 Gosi na I Ji Ihe Jehova Meere Gị Kpọrọ Ihe: Ka oge Ncheta Ọnwụ Jizọs nke afọ 2008 na-eru nso, ka onye ọ bụla n’ime anyị chebara obiọma na-erughịrị anyị Jehova meere anyị echiche. Pọl onyeozi dere, sị: “Anyị na-arịọsikwa unu ike ka unu ghara ịnara obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ ma nzube ya efunahụ unu.” (2 Kọr. 6:1) Olee otú anyị si egosi na nzube nke obiọma na-erughịrị anyị Chineke meere anyị efunahụbeghị anyị? Pọl dere, sị: “N’ụzọ niile, anyị na-eme ka a mata anyị dị ka ndị ozi Chineke.” (2 Kọr. 6:4) N’ihi ya, anyị na-egosi na obi dị anyị ụtọ maka onyinye Jehova nyere anyị site n’ịkpa ezi àgwà na iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma. Oge Ncheta Ọnwụ Jizọs ga-enye anyị ohere magburu onwe ya ịmụba ozi anyị, na-agbasi àmà ike banyere ozi ọma ahụ.

Igbe dị na peeji nke 3]

Olee Ndị Nwere Ike Iso Rụọ Ọrụ Ọsụ Ụzọ Inyeaka?

◼ Ezinụlọ dum

◼ Ndị ọrụ ha na-anaghị enye ohere

◼ Ndị agadi na ndị ahụ́ na-adịghị

◼ Ndị na-aga akwụkwọ

Igbe dị na peeji nke 4]

Mgbe A Na-eke Akwụkwọ Ịkpọ Òkù Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs:

◼ Kwuo naanị okwu ole na ole; jiri ịnụ ọkụ n’obi kwuo okwu

◼ Detuo aha ndị nwere mmasị ma gaghachi na nke ha

◼ Nye ndị mmadụ magazin ná ngwụsị izu

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya