Oge Ncheta Ọnwụ Jizọs—Oge E Ji Agakwu Ozi Ọma!
1. Olee ihe ndị mere anyị ga-eji chewe echiche ịgakwu ozi ọma n’ọnwa Mach, Eprel, na Mee?
1 Ì nwere ike iwepụtakwu oge gaa ozi ọma n’ọnwa Mach, Eprel, na Mee? Ụfọdụ ndị nkwusa ga-anọ ezumike n’oge ahụ, nke na ha ga-enwekwu ohere ịga ozi ọma. Malite n’Eprel 2, anyị ga-ebido ikesa akwụkwọ ịkpọ òkù pụrụ iche iji kpọọ ndị nwere mmasị ka ha bịa soro anyị cheta ọnwụ Jizọs n’Eprel 17. E mechaa Ncheta Ọnwụ Jizọs, anyị ga-agbalị gaghachi na nke ndị bịaranụ iji hụ na mmasị ha nwere ịmụ Baịbụl anyụghị ọkụ. Anyị ga-ejikwa ohere ahụ kpọọ ha ka ha bịa gere okwu ihu ọha pụrụ iche a ga-ekwu n’izu Eprel 25. N’eziokwu, e nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji chewe echiche ịgakwu ozi ọma n’ọnwa Mach, Eprel, na Mee.
2. Olee otu ụzọ kacha mma anyị ga-esi agakwu ozi ọma?
2 Ịsụ Ụzọ Inyeaka: Otu ụzọ kacha mma isi gakwuo ozi ọma n’ọnwa ndị ahụ bụ ịsụ ụzọ inyeaka. Ebe ọ bụ na anyị niile nwere ọtụtụ ihe anyị na-eme, ọ dị mkpa ka anyị hazie ihe ndị anyị na-eme ma belata oge anyị ji eme ihe ụfọdụ iji nwee ohere ịsụ ụzọ inyeaka. (Ilu 21:5) Ka i nwee ike ịrụ ya, i nwere ike ịhapụtụgodị ihe ụfọdụ na-adịchaghị mkpa ị na-eme n’ụbọchị. (Fil. 1:9-11) Í cheghị na ọ ga-adị mma ka ị gwa ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ unu na ị chọrọ ịsụ ụzọ inyeaka iji mara ma hà ga-eso gị?
3. Olee otú ezinụlọ nwere ike isi wepụtakwuo oge maka ozi ọma?
3 Mgbe ọzọ unu ga-enwe Ofufe Ezinụlọ, ọ ga-adị mma ma gị na ndị ezinụlọ unu kwurịta ya. (Ilu 15:22) Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ezinụlọ unu enye aka, ụfọdụ ndị ezinụlọ unu nwere ike ịsụ ụzọ inyeaka n’otu ọnwa ma ọ bụ karịa. Ọ́ bụrụkwanụ na unu atụlechaa ya ma chọpụta na ọ gaghị adịrị onye ọ bụla n’ime unu mfe ịsụ ụzọ inyeaka, gịnị ka unu nwere ike ime? Unu nwere ike ịhazi ịna-aga ozi ọma n’uhuruchi ụfọdụ ma ọ bụkwanụ na-anọtekwu aka n’ozi ọma ná ngwụsị izu.
4. Olee ngọzi mmadụ ga-enweta ma ọ gakwuo ozi ọma n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs?
4 Jehova na-ahụ mbọ niile anyị na-agba ime ihe dị ya mma, o jikwa àjà ndị anyị na-achụ kpọrọ ihe. (Hib. 6:10) Mmadụ na-enwe ọṅụ ma o nye Jehova na ndị ọzọ ihe. (1 Ihe 29:9; Ọrụ 20:35) Ì nwere ike ịgakwu ozi ọma n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs ma nwee ọṅụ na ngọzi ndị so ya?