Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Febụwarị 14
IZU NA-AMALITE NA FEBỤWARỊ 14
Abụ nke 72 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cf isi nke 17 ¶16-20, igbe dị na p. 181 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Nehemaya 9-11 (Nkeji 10)
Nke 1: Nehemaya 11:1-14 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: E Nweghị Ọnụ Ọgụgụ Ole E Kwuru Ga-enweta Ndụ Ebighị Ebi n’Ụwa—td 30CH (Nkeji 5)
Nke 3: Ụzọ Dị Iche Iche Chineke Si Egosi Obiọma Na-erughịrị Mmadụ—1 Pita 4:10 (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 12: Otú E Si Eso Onye Mmadụ Na-amabughị Nwee Mkparịta Ụka. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ, nke si n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 62-64. Jiri nkeji ole na ole gbaa onye nkwusa ajụjụ ọnụ. Ọ ga-abụ onye ma otú e si amalite mkparịta ụka ma ọ chọọ izi mmadụ ozi ọma n’oge ọ na-anọghị n’ozi ma ọ bụ n’oge ọ nọ n’ozi ụlọ n’ụlọ.
Nkeji 18: “Oge Ncheta Ọnwụ Jizọs—Oge E Ji Agakwu Ozi Ọma!” Ajụjụ na azịza. Ọ bụ onye nlekọta ije ozi ga-eduzi ya. Unu tụlechaa paragraf ndị ahụ, kwuo ndokwa e merela maka nzukọ ozi ubi n’ọnwa Mach, Eprel, na Mee. Tụọrọ ụmụnna aro ụzọ dị iche iche ha nwere ike isi hazie oge ha, n’agbanyeghị ọnọdụ ha, iji nweta awa iri ise a chọrọ n’aka ndị ọsụ ụzọ inyeaka n’otu ọnwa. Gbaa ndị nkwusa abụọ ma ọ bụ ndị nkwusa atọ ajụjụ ọnụ. Ha ga-abụ ndị rụrụ ọrụ ịsụ ụzọ inyeaka n’afọ gara aga n’oge ncheta ọnwụ Jizọs n’agbanyeghị ọtụtụ ọrụ ha ji n’aka ma ọ bụkwanụ ihe isi ike ndị ha nwere.
Abụ nke 8 na Ekpere