Ihe Ndị E Nwere Ike Ikwu Mgbe A Na-enyefe Magazin Ndị A
Jenụwarị 1
Gụọ Jenesis 2:16, 17. Kwuzie sị: “Ụfọdụ ndị na-ekwu na tupu Adam emehie, Chineke ma na ọ ga-emehie. Ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụrụ na Chineke ma na ọ ga-eri mkpụrụ osisi ahụ ma sị ya erila ya, ọ pụtara na Chineke bụ onye ihu abụọ. Gịnị ka i chere? [Chere ka ọ zaa.] Isiokwu a malitere na peeji nke 13 kọwara otú Chineke si eji ikike o nwere ịma ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu ama ihe ndị ga-emenụ.”
Jenụwarị–Mach
Gụọ Jems 3:7, 8. Jụzie, sị: “Ì kwetara na ọ dịghị mfe ịkwa ire anyị nga? [Chere ka ọ zaa.] Isiokwu a kọwara amaokwu Baịbụl ndị ga-enyere anyị aka ịchịkwa ihe a dị nta dị n’ahụ́ anyị ma ọ na-akpa ike.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 30.
Febụwarị 1
“Ọtụtụ ndị di na nwunye taa na-agbakarị alụkwaghịm. Gịnị ka i chere kpatara ya? [Chere ka ọ zaa.] Legodị ndụmọdụ a nyeerela ọtụtụ ndị di na nwunye aka. [Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 10:24.] Na magazin a, e kwuru ihe isii ndị di na nwunye na-ekwukarị na ọ bụ ya na-esere ha, kwuokwa otú ime ihe ndị e kwuru na Baịbụl ga-esi enyere ha aka.”
Jenụwarị–Mach
“Ọtụtụ ndị ajụọla sị, ‘Ọ bụrụ na Chineke dị, gịnị mere o gbubeghị Ekwensu?’ Ị̀ jụtụla ụdị ihe a? [Chere ka ọ zaa.] Isiokwu a dị na peeji nke 10 na nke 11 kwuru ihe Baịbụl zara n’ajụjụ ahụ. O kwukwara otú ụwa ga-adị mgbe a ga-egbu Ekwensu.” Gụọ Mkpughe 21:3, 4.