Akụkọ Ozi
Obi dị anyị ụtọ ịgwa unu na n’ọnwa Ọgọst 2010, bụ́ ngwụcha afọ ije ozi 2010, ndị nkwusa nyere akụkọ ozi ha dị 320,266. Nke a bụ ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kacha elu anyị nwetụrụla. Anyị nwekwara ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kacha elu ná ndị ọsụ ụzọ oge niile nakwa n’ọmụmụ Baịbụl anyị na-eduziri ndị mmadụ. Ndị ọsụ ụzọ oge niile dị 31,162, ebe ọmụmụ Baịbụl ndị e duziri dị 687,104. E wezụga nke ahụ, e mere mmadụ 14,051 baptizim n’afọ ije ozi 2010. Ọnụ ọgụgụ a karịkwara nke afọ ije ozi 2009.