Ihe Ndị A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị A
Ụlọ Nche February 1
“Ọ̀ dị gị ka Chineke ọ̀ na-anụ ekpere niile? [Chere ka ọ zaa.] Lee ihe Jizọs kwuru banyere ya. [Gụọ Matiu 6:7.] Isiokwu a mara mma kwuru otú Baịbụl si zaa ajụjụ anọ a na-ajụkarị banyere ekpere.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 16.
Teta! January–March
“Olee onye ị ga-ewere ka onye ihe na-agara nke ọma? [Chere ka ọ zaa.] Baịbụl kwuru kpọmkwem ihe a ga-eji mara onye ihe na-agara nke ọma. [Gụọ Abụ Ọma 1:3.] Mmadụ na-enwe ezi ihe ịga nke ọma ma ọ na-ebi ụdị ndụ kasị mma, ya bụ, ụdị ndụ Chineke chọrọ ka anyị na-ebi nke kwekọrọ n’uche ya. Ọ bụrụ na ị gụọ peeji nke 3-9 nke magazin a, ị ga-achọpụta otú i nwere ike isi nwee ihe ịga nke ọma.
Ụlọ Nche March 1
“Ì chere na a kara ihe ọ bụla na-eme ná ndụ mmadụ aka tupu ya emewe? [Chere ka ọ zaa.] Lee ihe Baịbụl kwuru banyere nke a. [Gụọ Ekliziastis 9:11.] Magazin a gosiri na ọ bụ eziokwu na Chineke akaala ya akaa na ụwa ga-aka mma n’ọdịnihu, ọ na-ahapụ ka onye ọ bụla n’ime anyị jiri aka ya kpebie ụdị ndụ ọ ga-ebi.”
Teta!® January–March
“Ama m na ị maara na a mụrụ Jizọs na Betlehem. Ma, ị̀ ma mgbe a mụrụ ya? [Chere ka ọ zaa.] O nwere ike iju gị anya ịma na e deghị kpọmkwem ụbọchị a mụrụ Kraịst na Baịbụl. Gee ntị ka m gụọrọ gị ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere ọmụmụ ya. [Gụọ Luk 2:4-8.] N’ihi ihe a ebe a kwuru, o yighị ka ndị ọzụzụ atụrụ hà ga-anọ n’èzí n’abalị December ahụ oké oyi na-atụ. Magazin a kwuru ihe ndị mere ọtụtụ ndị kpọrọ onwe ha Ndị Kraịst ji were December 25 dị ka ụbọchị a mụrụ Jizọs.” Lee isiokwu dị na peeji nke 12.