Ihe Ndị E Nwere Ike Ikwu Mgbe A Na-enyefe Magazin Ndị A
Ụlọ Nche Mach 1
Gụọ Ọpụpụ 20:15. Kwuzie, sị: “Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị na-agbalị ime ihe a Baịbụl kwuru, ụfọdụ chere na ọ dịghị njọ ma mmadụ zuo ohi ma ọ bụ ghara ịkwụwa aka ọtọ ma ihe siwe ike. Gịnị ka i chere? [Chere ka ọ zaa.] Isiokwu a kwuru uru ọ bara mmadụ ịkwụwa aka ya ọtọ mgbe niile.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 12.
Teta! Eprel–Jun
“Gụọ Ọrụ 17:31a. Kwuzie sị: “Ọ na-abụ e kwute okwu Ụbọchị Ikpe, ụjọ abịa ọtụtụ ndị. Olee otú ọ na-adị gị ma ị nụ gbasara ya? [Chere ka ọ zaa.] Baịbụl kwuru na ụmụ mmadụ ga-enweta ọtụtụ ngọzi n’Ụbọchị Ikpe. Ọ bụ ya ka a kọwara n’isiokwu a.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 10.
Ụlọ Nche Eprel 1
“A jụọ ndị mmadụ onye ha chere kacha gbanwee ụmụ mmadụ, ọtụtụ na-asị na ọ bụ Jizọs. Ì chere na ha zatara ya? [Chere ka ọ zaa.] Lekwa ihe mere anyị ga-eji leba anya n’ihe dị iche iche ndị mmadụ chere banyere Jizọs iji mata nke bụ́ eziokwu. [Gụọ Jọn 17:3.] Ụlọ Nche a pụrụ iche kọwara ihe Baịbụl kwuru gbasara Jizọs na ihe ndị ọ kụziri.”
Teta! Eprel–Jun
“Ndị na-agba alụkwaghịm taa bụ ájá. Ì chere na ọtụtụ di na nwunye ndị na-agba alụkwaghịm na-ebu ụzọ chebara nsogbu ndị ọ ga-akpatara ha echiche tupu ha ekpebie ịgba alụkwaghịm? [Chere ka ọ zaa. Gụzie Ilu 14:15.] Magazin a kwuru ihe anọ di na nwunye chọrọ ịgba alụkwaghịm kwesịrị ibu ụzọ chebara echiche.”