Akwụkwọ Ozi Si n’Aka Òtù Na-achị Isi
Ezi Ndịàmà Jehova Ibe Anyị:
Anyị nwere nnọọ ihe ùgwù ịbụ ndị a kpọkwasịrị aha Jehova, onye bụ́ Ọkaakaa Eluigwe na Ala! Aha ahụ na-adịru ebighị ebi, ọ dịghị agbanwe agbanwe, o nweghịkwa aha a ga-eji tụnyere ya. Ọ bụ Jehova kpọkwasịrị anyị aha ya, e jikwa aha a pụrụ iche mara anyị kemgbe afọ 1931. (Aịza. 43:10) Anyị anaghị eme ihere ịgwa ndị mmadụ na anyị bụ Ndịàmà Jehova.
Ekwensu na-agbalịsi ike ịhụ na a kwụsịrị ịkpọ aha Chineke. Mba ndị dị n’ụwa, bụ́ ndị Ekwensu na-achị, ajụla aha Jehova. Babịlọn Ukwu ahụ, nke bụ́ alaeze okpukpe ụgha nke zuru ụwa ọnụ, kpọrọ aha Chineke asị, ha ewepụdịla ya n’ọtụtụ Baịbụl ha sụgharịrị. Ma Jizọs ejighị aha Nna ya gwurie egwu, ọ bụdị ya bụ ihe mbụ o kwuru okwu ya n’ekpere ahụ ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya. Ọ sịrị: “Ya mere, kpeenụ ekpere otú a: ‘Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ.’” (Mat. 6:9) N’ekpere ọzọ o si n’ala ala obi kpegara Nna ya, ọ sịrị: “Emewo m ka aha gị pụta ìhè nye ndị i si n’ụwa nye m.” (Jọn 17:6) Ebe ọ bụ na anyị na-eṅomi ihe nlereanya ọma Jizọs, anyị ekpebisikwuola ike na anyị ga-eji ike anyị niile kwusaa aha Jehova n’ụwa niile.
Isiokwu dịịrị afọ 2009, nke bụ́ ‘Gbasie àmà ike banyere ozi ọma ahụ,’ gbara anyị ume ijezu ozi anyị. (Ọrụ 20:24) O doro anya na Jehova agọziela nnọọ mgbalị niile anyị mere n’afọ ije ozi gara aga. A gbara àmà dị ukwuu n’ụwa niile, o wetakwaara aha Jehova otuto na nsọpụrụ. Ndị nkwusa 7,313,173 bụ ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kacha elu anyị nwere n’afọ gara aga. Ha kwusaara ndị nwere ezi obi ozi ọma ma jiri Baịbụl kụziere ha ihe ndị ga-enyere ha aka idi nsogbu ndị ha na-enwe kwa ụbọchị. Mmadụ 18,168,323 ndị bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs gosiri na a ka nwere ọtụtụ nde ndị ka nwekwara ike ịbịa kpọkuo aha Jehova tupu e bibie ụwa ọjọọ a.
Ọ bụrụ na Jehova ekwe, anyị ga-anọgide na-eji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusara ndị mmadụ ozi ọma Alaeze ahụ, na-agbalịsikwa ike ịhụ na anyị kwusaara ndị niile nọ n’ókèala anyị ozi ọma. (Mat. 24:14; Mak 13:10) Ma ọ̀ bụ n’ozi ụlọ n’ụlọ, n’ozi okporo ámá, mgbe anyị ji akwụkwọ ozi na telefon na-agba àmà, ma ọ̀ bụdị mgbe anyị na-anọghị n’ozi, ka anyị gbalịsie ike mee ka ọtụtụ ndị mara aha Jehova na nzube ya.
Anyị nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji kwere na n’oge na-adịghị anya, Jehova ga-eme ihe iji hụ na e doro aha ya nsọ. (Ezik. 36:23) Oge Chineke ga-ekpochapụ ndị niile na-akatọ aha ya ji ọsọ na-abịa. Ụbọchị ahụ ga-abụ ụbọchị obi ụtọ maka ndị niile rubeere Jehova isi, bụ́ ndị kwusara aha Jehova ma mee ka ndị mmadụ mara na ọ bụ Ọkaakaa eluigwe na ala!
Jehova gosiri nnọọ na ya hụrụ ndị ya n’anya ná Mgbakọ Distrikti na Mgbakọ Mba Niile ndị e nwere n’afọ 2009, nke isiokwu ya bụ “Na-echenụ Nche!” Mgbakọ ndị ahụ bụ nnọọ ihe pụrụ iche mere n’akụkọ gbasara Ndịàmà Jehova, o nyekwaara anyị aka ịna-eche nche ma na-eburu ụbọchị Jehova n’uche.—Mak 13:37; 1 Tesa. 5:1, 2, 4.
N’ezie, Jehova na-enyere anyị aka; ọ na-emekwa ka obi anyị jupụta n’ọṅụ. Ọ na-eme ka anyị makpuru n’ebe ịta nri nke ahịhịa jupụtara ma na-edu anyị n’ebe izu ike nke mmiri jupụtara.—Ọma 23:1, 2; 100:2, 5.
Obi sie unu ike na Jehova ga-anọgide na-agọzi unu ka unu na-agba mbọ n’ozi Alaeze ya n’ọnwa ndị na-abịanụ!
Maranụ na anyị hụrụ unu n’anya,
Ụmụnna unu,
Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova