Ihe Ndị E Nwere Ike Ikwu Mgbe A Na-enyefe
Ụlọ Nche Mee 1
“Olee otú i chere ụwa a ga-adị ma ọ bụrụ na onye ọ bụla na-eme ihe Jizọs kwuru ebe a? [Gụọ Matiu 7:12. Chere ka ọ zaa.] Isiokwu a kwuru ụfọdụ ihe ndị Jizọs kụziri iji kọwaa ihe mmadụ ịbụ ezigbo Onye Kraịst pụtara.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 16.
Teta! Eprel-Jun
“Ì chere na ọ kacha mma ka di na nwunye gbaa alụkwaghị ma ha nwee nsogbu? [Chere ka ọ zaa.] Chineke kwuru hoo haa otú o si ele ịgba alụkwaghịm anya na Malakaị 2:16a. Ma, ọ bụrụ na o siere di na nwunye ike idozi nsogbu ha, otú kacha mma isi dozie ya bụ otú Chineke kwuru ka e si dozie ya. Magazin a kọwara otú di na nwunye ga-esi dozie nsogbu ha kama ịgba alụkwaghịm.” Gosi ya isiokwu ndị dị na peeji nke 3-9.
Ụlọ Nche Jun 1
“Ọtụtụ chọọchị taa anaghịzi ekwute okwu mmehie otú ha sibu eme. Ì chere na mmehie aghọọla ihe mgbe ochie, ka ì chere na ọ bụ ihe anyị na-ekwesịghị ileghara anya? [Chere ka ọ zaa. Gụzie Ndị Rom 5:12.] Magazin a kọwara ihe Baịbụl kwuru banyere mmehie.”
Teta! Eprel-Jun
“Ì chere na a ga-enwe Ụbọchị Ikpe? [Chere ka ọ zaa.] Baịbụl kwuru na a ga-enwe ụbọchị ikpe. [Gụọ Ọrụ 17:31.] Ụbọchị Ikpe agaghị adị otú ndị mmadụ chere na ọ ga-adị, kama ọ ga-abụ oge a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ nakwa oge a ga-akụzi iwu Chineke n’ụwa niile.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 10.