Ihe Ndị E Nwere Ike Ikwu Mgbe A Na-enyefe Magazin Ndị A
Mach 1
“E nwere ihe dị iche iche ndị mmadụ na-ekwu banyere Jizọs. Ì chere na ọ bụ ọkpara Chineke ka ọ̀ bụ naanị ezigbo mmadụ bitụrụla n’ụwa?” Chere ka ọ zaa. Gụziere ya ihe e dere n’okpuru otu n’ime ajụjụ ndị e dere ná mkpụrụ akwụkwọ okpotokpo na peeji nke 16-17, gụọkwanụ otu n’ime amaokwu Baịbụl ndị e dere ebe ahụ. Nyefee ya magazin ndị ahụ, gị na ya kwuokwa mgbe ị ga-abịa zaa ajụjụ nke na-esonụ.
Eprel–Jun
“Ụfọdụ na-asị na ndị okpukpe anaghị echebara ihe echiche tupu ha e kwere na ya. Gịnị ka i chere? [Chere ka ọ zaa.] Baịbụl kwuru na mmadụ ekwesịghị ikweta ihe ọ bụla a gwara ya n’ajụghị ase. [Gụọ 1 Jọn 4:1.] Isiokwu malitere na peeji nke 28 kọwara otú anyị ga-esi jide n’aka na ụdị okwukwe anyị nwere bụ nke nwere ezigbo ihe ọ gbakwasịrị ụkwụ na ya.”
Eprel 1
“Ọtụtụ ndị nwere ihe dị iche iche ha kweere banyere Jizọs. Ì chere na ọ dị mkpa ka mmadụ mara nke bụ́ eziokwu banyere Jizọs? [Chere ka ọ zaa. Gụzie Jọn 17:3.] Magazin a kọwara ihe Baịbụl kwuru banyere Jizọs, ebe o si bịa n’ụwa, otú o si bie ndụ n’ụwa, na ihe mere o ji nwụọ.”
Eprel–Jun
“Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị na-arịa ọrịa taa, anyị na-agụrụ ndị mmadụ amaokwu Baịbụl a na-akasi obi. [Gụọ Aịzaya 33:24.] Olee otú i chere ndụ ga-adị mgbe a ga-emezu ihe a Baịbụl kwuru? [Chere ka ọ zaa.] Tupu Chineke e mezuo nkwa a o kwere, e nwere ihe ụfọdụ dị mkpa anyị nwere ike ịna-eme ka ahụ́ na-adịkwu anyị mma. Magazin a kọwara ihe ndị ahụ.”