Ihe I Nwere Ike Ikwu
Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl na Satọdee Mbụ n’Ọnwa Mee
“Ì chetụla echiche ihe mere Chineke ji hapụ ka ihe ọjọọ na ahụhụ ju n’ụwa a? [Chere ka ọ zaa.] O nwere ihe m ga-egosi gị n’ihe a mụ na gị na-ekwu ugbu a, amakwa m na ọ ga-amasị gị.” Gị na ya gụọ ihe e dere n’okpuru ajụjụ nke mbụ dị na peeji nke 16 n’Ụlọ Nche Mee 1. Gụọkwanụ otu n’ime amaokwu Baịbụl ndị e dere ebe ahụ. Nye ya Ụlọ Nche na Teta!, gị na yiekwa mgbe ị ga-abịaghachi ka unu tụlee ajụjụ nke abụọ.
Mee 1
Gụọ Abụ Ọma 37:10, 11. Kwuzie, sị: “Ì chere na amụma a e buru n’ebe a ga-emezu n’oge na-adịghị anya? [Chere ka ọ zaa.] Magazin a kwuru banyere amụma isii ndị e buru na Baịbụl, bụ́ ndị na-emezu n’oge anyị a. Amụma ndị a na-emezu n’oge anyị a na-egosikwa na amụma ahụ anyị gụrụ n’Abụ Ọma 37:10, 11 ga-emezu n’oge na-adịghị anya.”
Eprel–Jun
Ọ bụrụ na ọ bụ onye na-eto eto ka ị hụrụ, mepee peeji nke 10, gosi ya ihe ndị e dere n’okpuru isiokwu nta bụ́ “Gịnị Ka Ị Ma Banyere Ịṅụ Sịga?” ma jụọ ya, sị: “Ì chere na ihe ndị a e kwuru ebe a bụ eziokwu? [Chere ka ọ zaa. Gụzie 2 Ndị Kọrịnt 7:1.] Isiokwu a kọwara ihe ndị i kwesịrị ịma banyere ịṅụ sịga, o kwukwara otú mmadụ ga-esi kwụsị ịṅụ sịga.”