Ihe I Nwere Ike Ikwu
Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl na Satọdee Mbụ n’Ọnwa Julaị
“A kọwa akụkọ gbasara ndị mmụọ ozi, ọ na-atọkarị ndị mmadụ ụtọ. Ma, ì chere na e nwere ndị bụ́ ndị mmụọ ozi n’eziokwu? [Chere ka ọ zaa.] Legodị ihe magazin a kwuru.” Nye ya Ụlọ Nche Julaị 1, gị na ya tụleekwa ihe e kwuru n’ajụjụ nke mbụ dị na peeji nke 16. I mechaa, nyekọta ya Ụlọ Nche ahụ na Teta!, gị na ya yiekwa mgbe ị ga-abịaghachi ka unu tụlee ajụjụ nke abụọ.
Ụlọ Nche Julaị 1
Gụọ Abụ Ọma 65:2. Ị gụchaa, gị asị onye nwe ụlọ: “Ọtụtụ ndị kwetara na Chineke bụ “Onye na-anụ ekpere.” Ọ bụ ya mere ha ji ekpegara ya ekpere kwa ụbọchị. Ma, ụfọdụ na-asị, ‘Ọ bụrụ na Chineke dị, oleenụ ihe mere nsogbu ji ju ebe niile n’ụwa anyị a?’ Gịnị ka i chere? Chineke ọ̀ na-anụ ekpere anyị? [Chere ka ọ zaa.] Ndị mmadụ na-ajụkarị sị: ‘Gịnị mere Onye na-anụ ekpere ji kwe ka ndị mmadụ na-ata ahụhụ?’ Magazin a kwuru ihe Baịbụl zara n’ajụjụ ahụ.”
Teta! Julaị–Septemba
“Kwa afọ, ọtụtụ nde mmadụ na-erite ọrịa ná nri. A sị gị kwuo, ì chere na nri ndị anyị na-eri n’obodo a nwere ike ịna-akpatara anyị ọrịa? [Chere ka ọ zaa.] Magazin a kwuru ụzọ ihe anọ anyị nwere ike ịna-eme, ka nri anyị na ndị ezinụlọ anyị na-eri ghara ịkpatara anyị ọrịa. O kwukwara na n’oge na-adịghị anya, Chineke ga-eme ka nri bụrụ atụrụ tawa n’ụwa. O nweghịkwa onye ga na-erite ọrịa ná nri.” Gụọ Abụ Ọma 104:14, 15.