Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 4/11 p. 4
  • Ịma Ọkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Ọkwa
  • Ozi Alaeze Anyi—2011
Ozi Alaeze Anyi—2011
km 4/11 p. 4

Ịma Ọkwa

◼ Eprel na Mee: Ụlọ Nche na Teta! Mgbe ị gara nletaghachi na nke ndị nwere mmasị, ma hà bụ ndị bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs ma ọ̀ bụkwanụ ndị na-abịa nzukọ anyị ndị ọzọ ma ha anaghị eso eme ihe ndị a na-eme n’ọgbakọ, gbaa mbọ nye ha akwụkwọ Bible Na-akụzi. Jun: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Gbalịa malitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl n’ụbọchị mbụ i ziri ha ozi ọma. Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ nwere akwụkwọ a, ọ bụrụkwa na ha ekweghị ka a mụwara ha Baịbụl, e nwere ike inye ha akwụkwọ ọ bụla merela ochie ọgbakọ nwere. Ma ọ bụkwanụ nye ha akwụkwọ Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe. Julaị na Ọgọst: E nwere ike inye ndị mmadụ broshuọ ọ bụla ọgbakọ nwere, bụ́ nke na-amasị ndị bi n’ókèala unu.

◼ Na Fraịdee, Ọktoba 22, 2010, Nwanna Stephen Lett, onye so n’Òtù Na-achị Isi, wepụtara Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ n’asụsụ Efịk ná mgbakọ e nwere n’Awị, bụ́ ebe dị nso na Kalaba. E si n’Ịntanet mee ka ụmụnna nọ n’Ụlọ Mgbakọ dị n’Ịkọt Ekpene nakwa nke dị n’Uyo nụ ihe Nwanna Lett na-ekwu ozugbo ahụ ọ na-ekwu ya. Ugbu a, e nwere Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ zuru ezu n’asụsụ Efịk, Igbo, na Yoruba.

◼ Malite n’ọnwa Mee, ọgbakọ niile ga na-eji Satọdee mbụ n’ọnwa ọ bụla na-amalitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl. Ihe mere e ji na-ebipụta isiokwu bụ́ “Mụta Ihe n’Okwu Chineke” n’Ụlọ Nche nke ọhaneze bụ ka ndị nkwusa jiri ya na-amalitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl. N’azụ Ozi Alaeze Anyị nke ọnwa ọ bụla, a ga-enwe ebe e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu.” Otu n’ime ihe e dere ebe ahụ ga-abụ maka ịmalitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl na Satọdee mbụ n’ọnwa na-eso ọnwa ahụ. Ndị nke ọzọ abụrụ otú e nwere ike isi nye mmadụ magazin ma ọ bụ akwụkwọ n’ọnwa na-eso ọnwa ahụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya