Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’Eprel 11
IZU NA-AMALITE N’EPREL 11
Abụ nke 44 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 2 ¶8-15 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Job 21-27 (Nkeji 10)
Nke 1: Job 25:1-26:14 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ihe Mere E Kwesịghị Iji Obe Efe Chineke Ofufe (Nkeji 5)
Nke 3: Ihe Mere Amagedọn Ji Bụrụ Ihe Na-egosi na Chineke Hụrụ Anyị n’Anya—td 4B (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa. Gwa ọgbakọ mbọ ndị a gbarala n’ikesa akwụkwọ ịkpọ òkù Ncheta Ọnwụ Jizọs.
Nkeji 10: Ghaa Mkpụrụ Gị, Ekwekwala Ka Aka Gị Zuo Ike. (Ekli. 11:6) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ, nke si n’Ụlọ Nche April 15, 2004, peeji nke 24-26, na Ụlọ Nche October 1, 2004, peeji nke 8. A kọchaa ahụmahụ nke ọ bụla (dị ka oge kwere gị mee), gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ihe ha mụtara.
Nkeji 10: Otú E Si Eji Akwụkwọ Ozi Agba Àmà. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ, nke ga-esi n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 71-73.
Nkeji 10: “A Ga-agba Àmà Dị Egwu.” Ajụjụ na azịza.
Abụ nke 8 na Ekpere