Ihe Ndị A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị A
August 1
“Ọtụtụ ndị chere na ndị ezi omume niile ga-aga eluigwe. Ì chere otú ahụ? [Chere ka ọ zaa.] Legodị ihe e kwuru ebe a banyere ụwa. [Gụọ Abụ Ọma 37:11, 29.] Isiokwu a kọwara ihe Jizọs kwuru banyere ọdịnihu ụmụ mmadụ n’ụwa a.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 22.
October–December
“Ọnwụ nne ma ọ bụ nna so n’ihe ndị na-akacha ewute mmadụ ná ndụ. Ì cheghị otú ahụ? [Chere ka ọ zaa.] Amaokwu Baịbụl ndị dị ka nke a akasiela ọtụtụ ndị obi. [Gụọ Mkpughe 21:4.] Isiokwu a kọwara otú mmadụ, karịchaa onye na-eto eto, ga-esi die ọnwụ nne ya ma ọ bụ nna ya.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 10.
September 1
“Ụfọdụ na-asị na ọ bụrụ na mmadụ na-eme ihe Chineke chọrọ, na Chineke ga-eji akụnụba gọzie onye ahụ, nakwa na onye dara ogbenye bụ onye Chineke na-ahụghị n’anya. Olee ihe i chere? [Chere ka ọ zaa.] Ọ dị mma ịmara na Jizọs abaghị ọgaranya. [Gụọ Luk 9:58.] Magazin a kwuru ụdị ngọzi ndị ohu Chineke ga-atụ anya ya n’aka Chineke.”
October–December
“Ì chere na nsogbu ndị na-eto eto na-enwe taa karịrị nke ndị oge mbụ? [Chere ka ọ zaa.] Ọtụtụ ndị kwetara na amaokwu Baịbụl a kọwara oge anyị a nke ọma. [Gụọ 2 Timoti 3:1.] Magazin a kọwara ụfọdụ ihe Baịbụl kwuru ga-enyere ndị nne na nna na ndị na-eto eto aka idi nsogbu ndị ha na-enwe n’oge a.”