Ihe Ndị A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị A
September 1
“Ọtụtụ ndị chere na ihe ndị a kọrọ n’akwụkwọ Jenesis banyere Adam na Iv bụ akụkọ ifo. Ndị ọzọ kweere na o nwere mgbe Adam na Iv dịrị ndụ n’ụwa a. Olee ihe i chere? [Chere ka ọ zaa.] Lee ihe Jizọs kwuru banyere ha. [Gụọ Mak 10:6-9.] Isiokwu a kwuru ihe gosiri na o nwere mgbe Adam na Iv dịrị ndụ, kọwaakwa ihe mere anyị ga-eji leba anya n’ihe anyị kweere.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 12.
October–December
Gụọ 1 Jọn 4:8. Kwuzie sị: “Ụfọdụ ndị kweere na Chineke na-ata ndị ajọ omume ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ ruo mgbe ebighị ebi. Ndị ọzọ na-ekwu na ịta ndị ọjọọ ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ adabaghị n’ihe ebe a anyị gụrụ kwuru. Gịnị ka i chere? [Chere ka ọ zaa.] Isiokwu a kọwara ihe Baịbụl nwere ikwu n’okwu a.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 26.
October 1
“Anyị niile na-enwe nsogbu ná ndụ. [Kwuo ụfọdụ nsogbu ndị mmadụ na-enwekarị n’ókèala unu.] Ì chere na Chineke nwere ike inyere anyị aka ná nsogbu ndị a anyị na-enwe? [Chere ka ọ zaa.] N’amaokwu Baịbụl a m chọrọ ịgụrụ gị, Jizọs kwuru otu ụzọ Chineke na-esi enyere anyị aka. [Gụọ Luk 11:13.] Magazin a kọwara ihe bụ́ mmụọ nsọ, gwakwa anyị otú o nwere ike isi baara anyị uru.”
October–December
“Onye ọ bụla n’ime anyị enweela mgbe mmadụ kpọrọ ya asị n’enweghị ihe o mere ya. Olee otú i chere Chineke si ele ịkpọasị anya? [Chere ka ọ zaa. Gụzie Ọrụ 10:34, 35.] Baịbụl nwere ike inyere anyị aka idi nsogbu ndị anyị na-enwe n’ihi asị a kpọrọ anyị n’enweghị ihe anyị mere. Ọ na-enyekwara anyị aka iwepụ ụdị ịkpọasị ọ bụla n’obi anyị. A kọwara ihe ndị a niile na magazin a.”