Ihe Ndị E Nwere Ike Ikwu Mgbe A Na-enyefe Magazin Ndị A
Ụlọ Nche Septemba 1
“Ihe mere ndị mmadụ ji eme ihe ọjọọ mgbe ụfọdụ bụ n’ihi na a rafuru ha ka ha na-anụrụ okpukpe ha ọkụ n’obi. Gịnị ka i chere mere e ji nwee ike ịrafu ha? [Chere ka ọ zaa.] Legodị ihe Baịbụl gbara anyị ume ka anyị mee. [Gụọ 1 Jọn 4:1.] Isiokwu a kọwara ihe mere o ji dị mkpa ịchọpụta ma ihe anyị kweere ò kwekọrọ n’ihe Okwu Chineke kwuru.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 10.
Teta! Ọktoba–Disemba
Ụmụ nwaanyị hà kwesịrị ịkụzi ihe n’ụlọ ụka? [Chere ka ọ zaa.] Lee ihe Baịbụl kwuru gbasara otu nwaanyị. [Gụọ Ndị Rom 16:1.] Ma e nwere ebe ọzọ Baịbụl kwuru ka ụmụ nwaanyị na-agbachi nkịtị n’ọgbakọ. Oleezi nke anyị ga-ewe? Isiokwu a ga-akọwara gị ya.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 16.
Ụlọ Nche Ọktoba 1
“Ndị mmadụ n’ụwa niile na-ekpe ekpere n’agbanyeghị okpukpe ha na-ekpe. Ì chere na Chineke na-anụ ma na-aza ekpere niile ahụ? [Chere ka ọ zaa.] Baịbụl gbara anyị ume ka anyị na-ekpe ekpere. [Gụọ Ndị Filipaị 4:6, 7.] Magazin a kwuru otú Baịbụl si zaa ajụjụ asaa ndị mmadụ na-ajụkarị banyere ekpere.”
Teta! Ọktoba–Disemba
“Ndịàmà Jehova hà ezitụla gị ozi ọma? Ị̀ jụtụla onwe gị ihe mere anyị ji na-aga n’ụlọ ndị mmadụ na-ezi ha ozi ọma, n’agbanyeghị na ọtụtụ ndị achọghị iji anya ahụ anyị? [Chere ka ọ zaa. Gụzie Matiu 24:14.] Anyị chọpụtara na e nweela ọtụtụ ihe na-abụghị eziokwu a gwara ndị mmadụ banyere Ndịàmà Jehova. Magazin a ga-agwa gị nke bụ́ eziokwu.”