Ihe Ndị E Nwere Ike Ikwu Mgbe A Na-enyefe Magazin Ndị A
Ụlọ Nche Julaị 1
“Ọtụtụ n’ime anyị anaghị ama ihe anyị ga-ekwu ekwu ma anyị hụ enyi anyị nọ n’oké ọrịa ma ọ bụ nke na-arịa ọrịa ga-emecha gbuo ya. Gịnị ka i chere banyere ihe a Baịbụl kwuru? [Gụọ Jems 1:19. Chere ka ọ zaa.] Isiokwu a kọwara ọtụtụ ihe Baịbụl kwuru mmadụ nwere ike ime iji nyere onye na-arịa ọrịa aka.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 10.
Teta! Julaị–Septemba
“Ì chere na ụkọ ego dị taa ga-akwụsị n’oge na-adịghị anya? [Chere ka ọ zaa.] Ọtụtụ ndị amaghị na Baịbụl nwere ike inyere anyị aka n’oge a ihe siri ike. [Gụọ otu amaokwu Baịbụl dị n’isiokwu ahụ.] Isiokwu a gosiri otú ndụmọdụ dị na Baịbụl nwere ike isi nyere mmadụ aka n’oge ụkọ ego.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 10.
Ụlọ Nche Ọgọst 1
“Ọtụtụ ndị na-atụ ụjọ na agha ọgwụrụ mba ma ọ bụ mgbanwe ihu ígwé ga-ebibi ma ọ bụ laa ụwa a n’iyi. Ì chere na e nwere mgbe ihe dị otú ahụ ga-eme? [Chere ka ọ zaa.] Legodị ihe Baịbụl kwuru n’okwu a. [Gụọ Mkpughe 11:18.] Magazin a zara ajụjụ anọ ndị a na-ajụkarị banyere ọgwụgwụ ụwa.”
Teta! Julaị–Septemba
“Ndị chọọchị na-anakarị ndị òtù ha ego ma ha mee ha baptizim, kwuoro ha okwu agbamakwụkwọ, ma ọ bụ okwu olili ozu. Ì chere na ihe a ha na-eme dị mma? [Chere ka ọ zaa.] Legodị ntụziaka Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya. [Gụọ Matiu 10:7, 8b.] Isiokwu a kọwara ihe Baịbụl kwuru banyere chọọchị ịna ndị mmadụ ego maka ihe ndị ha meere ha.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 24.