Ị̀ Ga-achọ Ịsụ Ụzọ Inyeaka?
1. Olee ihe mere oge a na-echeta ọnwụ Jizọs ji bụrụ oge dị mma anyị kwesịrị iji gakwuo ozi ọma?
1 Oge a na-echeta ọnwụ Jizọs bụ oge dị mma anyị kwesịrị iji agakwu ozi ọma. Ọ bụ oge anyị ji echebara otú Jehova si jiri Ọkpara ya gbapụta anyị echiche, bụ́kwanụ ihe na-egosi na ọ hụrụ anyị n’anya. (Jọn 3:16) Ebe ọ bụ na obi dị anyị ụtọ maka ihe a Jehova meere anyị, anyị na-eji oge Ncheta Ọnwụ Jizọs akọrọ ndị ọzọ gbasara Jehova na ihe ọ na-emere ụmụ mmadụ. (Aịza. 12:4, 5; Luk 6:45) Anyị na-ejikwa oge ahụ akpọ ndị enyi anyị na ndị nọ n’ókèala anyị ka ha bịa soro anyị cheta ọnwụ Jizọs. E chetachaa ọnwụ Jizọs, anyị na-agbakwa mbọ gaa kụzikwuoro ndị bịara ya ihe. Ị̀ ga-asụli ụzọ inyeaka n’ọnwa Mach, Eprel, ma ọ bụ Mee?
2. Gịnị mere ọnwa Mach ji bụrụ ọnwa magburu onwe ya ịsụ ụzọ inyeaka?
2 Soro Mee Ka Ọnwa Mach Bụrụ Ọnwa Pụrụ Iche: Mach ga-abụ ọnwa magburu onwe ya ịsụ ụzọ inyeaka. Ndị ga-asụ ụzọ inyeaka n’ọnwa ahụ ga-eji aka ha kpebie ma hà ga-enye awa iri atọ ma ọ̀ bụkwanụ awa iri ise. Ọ bụrụ na onye nlekọta sekit ga-abịa ileta ọgbakọ unu n’ọnwa Mach, ndị na-asụ ụzọ inyeaka n’ọnwa ahụ nwere ike ịga nzukọ onye nlekọta sekit na ndị ọsụ ụzọ oge niile na ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche ga-enwe. Ha ga-anọ ya ruo n’isi. Ọ bụ na Tuzdee, Mach 26, 2013 ka anyị ga-echeta ọnwụ Jizọs. Ma, anyị ga-ebido na Mach 1 kesawa akwụkwọ anyị ga-eji gwa ndị mmadụ ka ha bịa soro anyị cheta ya. Nke a pụtara na oge anyị ga-eji agwa ndị mmadụ ka ha bịa soro anyị cheta ọnwụ Jizọs n’afọ a ga-aka oge anyị ji gwa ha ya n’afọ ndị gara aga. Ihe ọzọ bụ na Mach nwere ngwụcha izu ise. Gbalịa soro mee ka ọnwa Mach bụrụ ọnwa pụrụ iche n’afọ a.
3. Olee otú anyị nwere ike isi wepụtakwuo oge gaa ozi ọma?
3 Bido Ugbu A Kwadowe: Ọ bụ ugbu a ka i kwesịrị ịhazi onwe gị ka i nwee ike iso sụọ ụzọ inyeaka. Ndị ezinụlọ kwesịrị inyere ibe ha aka. N’ihi ya, mgbe unu na-enwe Ofufe Ezinụlọ, jirinụ oge ụfọdụ kwurịta otú unu ga-esi asụ ụzọ inyeaka. (Ilu 15:22) Ọ bụrụ na ị gaghị asụli ụzọ inyeaka, obi ajọla gị njọ. I nwere ike hazie ihe ị na-eme ma wepụtakwuo oge gaa ozi ọma n’oge ahụ. I nwekwara ike wepụtakwuo otu ụbọchị n’izu ọ bụla ma jiri ya na-aga ozi ọma.
4. Olee uru anyị ga-erite ma ọ bụrụ na anyị ewepụtakwuo oge ga ozi ọma n’ọnwa Mach, Eprel, na Mee?
4 Ọ bụrụ na anyị ewepụtakwuo oge gaa ozi ọma n’ọnwa Mach, Eprel, na Mee, obi ga-adịkwu anyị ụtọ na anyị na-ejere Jehova ozi ma na-enye ndị ọzọ ihe. (Jọn 4:34; Ọrụ 20:35) Ihe kacha mkpa mere anyị kwesịrị iji wepụtakwuo oge gaa ozi ọma n’ọnwa ndị ahụ bụ na anyị ga-eme ka obi Jehova ṅụrịa.—Ilu 27:11.