Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Febụwarị 11
IZU NA-AMALITE NA FEBỤWARỊ 11
Abụ nke 106 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
jr isi nke 5 ¶7-12 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Matiu 26-28 (Nkeji 10)
Nke 1: Matiu 27:24-44 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Olee Otú Ndidi Chineke Ga-esi Mee Ka A Zọpụta Anyị?—2 Pita 3:9, 15 (Nkeji 5)
Nke 3: Ihe Mmehie Bụ—td 26A (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Gịnị Ka Anyị Mụtara? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gụọnụ Matiu 6:19-21 na Luk 16:13. Tụleekwanụ otú amaokwu Baịbụl ndị ahụ ga-esi enyere anyị aka n’ozi ọma.
Nkeji 20: “Ị̀ Ga-achọ Ịsụ Ụzọ Inyeaka?” Ajụjụ na azịza. Ọ bụ onye nlekọta ije ozi ga-eme ihe omume a. Unu tụlechaa paragraf nke 2, gbaa ndị nkwusa abụọ chọrọ ịsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa Mach ajụjụ ọnụ. Otu ga-abụ onye ọrụ ya na-anaghị ekwe ya nwee ohere. Onye nke ọzọ abụrụ onye ahụ́ na-adịchaghị. Olee ihe ha bu n’obi ime, nke ga-enyere ha aka ịsụ ụzọ inyeaka? Unu tụlechaa paragraf nke 3, gwa di na nwunye ka ha mee ihe ngosi ebe ha na-enwe Ofufe Ezinụlọ. Mgbe ha mụchara ihe, ha ewere nkeji ole na ole kwurịta otú ha ga-esi hazie onwe ha ka ha nwee ike ijekwu ozi ọma ma ọ bụ sụọ ụzọ inyeaka. Ha ga-akpọrọ ụmụ ha mee ihe ngosi ahụ ma ọ bụrụ na ha nwere ụmụ.
Abụ nke 122 na Ekpere