Ihe Ga-eme Ka Obi Dịkwuo Anyị Ụtọ n’Oge A Na-echeta Ọnwụ Jizọs
1. Olee ihe anyị ga-eme n’oge a na-echeta ọnwụ Jizọs ka obi dịkwuo anyị ụtọ?
1 Ị̀ ga-achọ ime ihe obi ga-eji dịkwuo gị ụtọ n’ọnwa Mach, Eprel nakwa n’ọnwa Mee? Otu n’ime ihe ị ga-eme ka obi dịkwuo gị ụtọ bụ iwepụtakwu oge gaa ozi ọma ma ọ bụ sụọ ụzọ inyeaka. Olee otú ime ihe ndị a ga-esi mee ka obi dịkwuo gị ụtọ?
2. Olee otú iwepụtakwu oge na-aga ozi ọma ga-esi eme ka obi dịkwuo anyị ụtọ?
2 Ihe Ị Ga-eme: Jehova kere anyị ka anyị na-enwe obi ụtọ ma anyị na-efe ya. (Mat. 5:3) O kekwara anyị otú obi ga na-adị anyị ụtọ ma anyị na-emere ndị ọzọ ihe ọma. (Ọrụ 20:35) Anyị na-ezi ozi ọma, anyị na-emere ndị mmadụ ihe ọma, na-efekwa Chineke. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị na-ewepụtakwu oge na-aga ozi ọma, obi ga na-adịkwu anyị ụtọ, otú e si ezi ozi ọma ga-edokwu anyị anya. Ọ ga-emezi ka obi sie anyị ike, anyị agaghịkwa na-atụ ndị mmadụ ụjọ ma anyị gaa izi ha ozi ọma. Anyị ga-enwekwa ike izi ọtụtụ ndị ozi ọma, ndị anyị ga na-amụrụ Baịbụl ga-ehikwa nne. Ihe a niile ga-eme ka obi na-adị anyị ụtọ.
3. Gịnị mere ọnwa Mach na Eprel ji dị mma ịsụ ụzọ inyeaka?
3 Ọnwa Mach na Eprel dị mma ịsụ ụzọ inyeaka n’ihi na anyị nwere ike jiri aka anyị kpebie inye awa iri atọ ma ọ bụ awa iri ise. Ihe ọzọ mere ha ji dị mma ịsụ ụzọ inyeaka bụ na anyị ga-amalite ịkpọ ndị mmadụ ka ha bịa soro anyị cheta ọnwụ Jizọs. Anyị ga-ebido na Mach 22 kpọwa ha ruo n’Eprel 14. Obi ga-adị ndị nkwusa niile ụtọ n’ihi na anyị ‘ga-eji otu obi’ jezuo ókèala anyị n’oge ahụ.—Zef. 3:9.
4. Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịsụ ụzọ inyeaka?
4 Bido Ugbu A Kwadowe: Ọ ga-adị mma ka ị hazigharịa oge gị ka i nwee ike iwepụtakwu oge jee ozi ọma n’ọnwa Mach, Eprel na Mee ma ọ bụ n’otu n’ime ọnwa atọ a. Ọ bụrụ na ị hazibeghị oge gị, bido ugbu a haziwe ya. Rịọ Jehova ka o nyere gị aka. (Jems 1:5) Kọtatụrụ ya ndị ezinụlọ gị ma ọ bụkwanụ ndị ọgbakọ unu ka ha tụọrọ gị aro ihe ị ga-eme. (Ilu 15:22) O nwere ike ịbụ na ahụ́ adịghị gị ma ọ bụkwanụ na ọrụ ị na-arụ anaghị enye gị efe. Ma, ọ bụrụ na i jisie ike soro sụọ ụzọ inyeaka n’otu n’ime ọnwa atọ ahụ, obi ga-abụ gị sọ ọṅụ.
5. Ọ bụrụ na anyị ewepụtakwuo oge jee ozi ọma n’oge a ga-echeta ọnwụ Jizọs, olee otú obi ga-adị ma anyị ma Jehova?
5 Jehova chọrọ ka obi na-adị ndị na-efe ya ụtọ. (Ọma 32:11) Anyị wepụta oge jekwuo ozi ọma n’oge a na-echeta ọnwụ Jizọs, obi ga-adị anyị ụtọ, dịkwa Nna anyị nke eluigwe.—Ilu 23:24; 27:11.