Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Febụwarị 17
IZU NA-AMALITE NA FEBỤWARỊ 17
Abụ nke 15 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 3 ¶1-10 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Jenesis 29-31 (Nkeji 10)
Nke 1: Jenesis 29:21-35 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Iji Okwukwe Agwọ Ọrịa n’Oge A Esighị n’Aka Chineke—td 19CH (Nkeji 5)
Nke 3: Nrubeisi Na-echebe Gị—lr isi nke 7 (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Olee Otú Anyị Si Mee? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ bụ onye nlekọta ije ozi ga-ekwu ya. Gwa ụmụnna otú unu si nye ndị mmadụ Akụkọ Alaeze nke 38 n’ókèala unu. Kwuo ma ùnu gazuru ókèala unu. Gwa ụmụnna ka ha kwuo uru ha ritere mgbe ha na-enye ndị mmadụ traktị ahụ. Ha kọọkwa ahụmahụ ọ bụla tọrọ ụtọ ha nwere.
Nkeji 5: Ì Ji Ebe Anyị Na-edebe Ihe n’Ịntanet Ezi Ndị Mmadụ Ozi Ọma? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gwa ụmụnna ka ha kwuo otú ha si jiri adres Ịntanet anyị zie ozi ọma. Gbaa ụmụnna ume ka ha na-agwa ndị mmadụ ka ha na-aga jw.org/ig.
Nkeji 15: “Ihe Ga-eme Ka Obi Dịkwuo Anyị Ụtọ n’Oge A Na-echeta Ọnwụ Jizọs.” Ajụjụ na azịza. Ọ bụrụ na e nwere ndị ahụ́ na-adịghị ma ọ bụkwanụ ndị ọrụ ha na-anaghị enye ha efe ma ha chọrọ ịsụ ụzọ inyeaka, gbaa ha ajụjụ ọnụ ka ha kwuo otú ha sị ahazi oge ha. Mgbe unu na-atụle paragraf nke 3, gwa onye nlekọta ije ozi ka o kwuo ndokwa ndị e merela maka nzukọ ozi ubi n’ọnwa Mach, Eprel na Mee.
Abụ nke 8 na Ekpere