Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Ide Ihe Ụfọdụ Gbasara Onye Anyị Ziri Ozi Ọma
Pọl onyeozi gwara Timoti, sị: “Na-elezi onwe gị na ozizi gị anya mgbe niile.” (1 Tim. 4:16) Ihe a Pọl gwara Timoti na-egosi na anyị ekwesịghị iche na o nweghị ihe ọzọ anyị ga-emeli ka otú anyị si ezi ozi ọma dịkwuo mma, ma ànyị ka malitere izi ozi ọma ọhụrụ ma ò teela anyị ziwere ozi ọma. O nwere isiokwu ga na-agba n’Ozi Alaeze Anyị. Isiokwu ahụ bụ “Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma.” Ọ ga-enyere anyị aka ịna-emekwu nke ọma n’ozi ọma. N’isiokwu nke ọ bụla, a ga-ekwu otu ihe ga-enyere anyị aka ịna-eme nke ọma n’ozi anyị, kwuokwa otú anyị ga-esi na-eme ya. E nwee aro ọ bụla a tụrụ, anyị kwesịrị imewe ya n’ọnwa ahụ. N’otu n’ime ihe omume a ga-eme ná Nzukọ Ije Ozi n’ọnwa nke ọzọ, anyị ga-ekwu otú anyị si mee ihe ahụ n’ozi ọma. Ihe anyị ga-agba mbo ime n’ọnwa a bụ ide ihe ụfọdụ gbasara onye anyị ziri ozi ọma.
Ihe Mere O ji Dị Mkpa: Ọ bụrụ na anyị chọrọ ije ozi anyị nke ọma, ọ bụghị naanị ozi ọma ụlọ n’ụlọ ka anyị ga na-aga. Anyị kwesịrị ịgaghachi na nke ndị chọrọ ka anyị bịaghachi ka anyị nwee ike ịkụzikwuru ha ihe Baịbụl kwuru. (Mat. 28:19, 20; 1 Kọr. 3:6-9) Ihe ọ pụtara bụ na anyị ga-achọrọ onye ahụ gaa na nke ya. Anyị ruo, anyị na ya ekwurịtakwuo ihe ọ chọrọ ka anyị na ya kwuo. N’ihi ya, ọ bụrụ na onye anyị ziri ozi ọma chọrọ ka anyị bịaghachi na nke ya, anyị kwesịrị ide ihe gbasara ya n’akwụkwọ.
Ihe Anyị Ga-eme:
• Ị gawa ozi ọma, tinye akwụkwọ na mkpịsị akwụkwọ n’akpa ozi ọma gị. Hụ na akwụkwọ ahụ dị mma n’anya, na-edebekwa ya nke ọma. Ụbọchị ọ bụla i ziri mmadụ ozi ọma, dee ihe gbasara ya n’akwụkwọ ahụ ozugbo.
• Dee aha ya na adres ụlọ ya. Deekwa nọmba ekwentị ya ma ọ bụ adres iimel ya. Dee ihe ị chọpụtara banyere ya na ndị ezinụlọ ya nke ga-enyere gị aka ịma ihe unu ga-akparịta.
• Dee ihe unu kpara nakwa ebe unu gụrụ na Baịbụl. Deekwa ihe ndị o kweere, akwụkwọ i nyere ya, oge na ụbọchị ị gara na nke ya.
• Dee ihe unu ga-akpa ma ị bịa ọzọ. Deekwa ụbọchị ị ga-aga.
• Mgbe ọ bụla ị gara na nke ya, deekwa ihe unu mụrụ. I nwekwara ike ide ihe ndị ọzọ gbasara ya, ndị ga-enyere gị aka ime ka ọ ghọta ihe Baịbụl kwuru.
Mee ihe a n’ọnwa a:
• I dewe ihe gbasara onye i ziri ozi ọma, gwa onye gị na ya so ihe ị na-ede.