Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 12/06 p. 1
  • Gaghachi na Nke Ndị Nile Gositụrụ Mmasị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gaghachi na Nke Ndị Nile Gositụrụ Mmasị
  • Ozi Alaeze Anyi—2006
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nletaghachi Na-eduga n’Ọmụmụ Bible
    Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Nweta Obi Ike Ime Nletaghachi
    Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Nyere Ndị Nwere “Ezi Ọchịchọ Obi” Aka
    Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Jide n’Aka na Ị Gaghachiri!
    Ozi Alaeze Anyi—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2006
km 12/06 p. 1

Gaghachi na Nke Ndị Nile Gositụrụ Mmasị

1 Ihe mere ọtụtụ n’ime anyị ji nọrọ n’eziokwu ahụ taa bụ n’ihi na ọ dị onye chọpụtara mmasị anyị gosiri n’ozi Alaeze ahụ ma jiri ndidi bịaghachi na nke anyị—ikekwe ọtụtụ ugboro—iji hụ na anyị nọgidere na-enwe mmasị na ya. Anyị onwe anyị kwa kwesịrị ịdị na-agbasi mbọ ike ịhụ na anyị gaghachiri na nke ndị nile gositụrụ mmasị. N’ezie, n’iwu ahụ e nyere anyị ka anyị ‘mee ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs,’ ime nletaghachi so na ya.—Mat. 28:19, 20.

2 Chọpụta Mgbe Mmadụ Gosiri Mmasị: Ọ bụrụgodị na mmadụ anataghị anyị akwụkwọ, ihu ya, ụda olu ya, na ụdị okwu ndị o ji na-agwa anyị okwu pụrụ igosi na o nwetụrụ mmasị n’ozi Alaeze ahụ. Anyị pụrụ iji maka nke ahụ gaa nletaghachi na nke ya. Otu nwanna nwoke gara na nke otu nwoke ruo izu ise n’esepụghị aka, nwoke ahụ ekweghịkwa anara ya akwụkwọ anyị. Mgbe nwanna nwoke ahụ gara na nke ya na nke ugboro isii ya, nwoke ahụ natara ya akwụkwọ, e mesịakwa, a malitere iduziri ya ọmụmụ Bible.

3 Ọ bụrụ na ị chọpụta na mmadụ gosiri mmasị, gaghachi na nke ya ozugbo, ikekwe n’ime ụbọchị ole na ole. Enyela “ajọ onye ahụ” ohere ịpụnara onye ahụ ihe a ghaworo n’obi ya. (Mat. 13:19) Hụ na ị gaghachiri na nke ya kpọmkwem n’oge unu yiri àgbà ka ị bịa.—Mat. 5:37.

4 Mgbe Ị Na-agba Àmà n’Okporo Ámá: Ị̀ na-agbalịsi ike ime ka ndị gosiri mmasị mgbe i ziri ha ozi ọma n’okporo ámá ma ọ bụ n’oge ị na-anọghị n’ozi nọgide na-enwe mmasị? Mgbe i zisịrị onye ahụ ozi ọma, ị pụrụ ikwu, sị: “Mkparịta ụka anyị a tọrọ m ụtọ. Olee otú anyị ga-esi ahụ ọzọ ka anyị wee gaa n’ihu ná mkparịta ụka a?” Mgbe o kwesịrị ekwesị, ụfọdụ ndị nkwusa pụrụ ịhọrọ inye onye ahụ nwere mmasị nọmba fon ha ma ọ bụkwanụ nata onye ahụ nọmba fon ya mgbe ha nyesịrị ya nọmba fon nke ha. Ọ bụrụ na ndị mmadụ na-ahụkarị gị n’otu ebe n’okporo ámá ka ị na-ezi ozi ọma, ọ gaghị esiri ha ike inye gị nọmba fon ha ma ọ bụ adres ha. Ọ bụrụgodị na ha ajụ inye gị nọmba fon ma ọ bụ adres ha, ị ka pụkwara ịhụ na mmasị ahụ ha nwere dịgidere site n’ịgbara ha àmà n’oge ọzọ ị hụrụ ha n’okporo ámá.

5 Mgbe anyị hụrụ fụlawa anyị na-agba mmiri ma na-elekọta ka ọ na-eto nke ọma, anyị na-enwe ọṅụ. N’otu aka ahụ, anyị pụrụ inweta ọṅụ dị ukwuu site n’ime nletaghachi na inyere ndị mmadụ aka ịhụ na ha na Chineke dị ná mma. (1 Kọr. 3:6) Mee ka ọ bụrụ ihe mgbaru ọsọ gị ịdị na-agaghachi na nke ndị nile gositụrụ mmasị.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya