Nyere Ndị Nwere “Ezi Ọchịchọ Obi” Aka
1. Ole ndị ka Jehova na-achịkọtara onwe ya taa?
1 Onye ọ bụla nwere ọchịchọ gbanyesiri mkpọrọgwụ ike n’obi ihe atụ ya. (Mat. 12:35) Bible na-ekwu banyere onye ‘obi ya dị nanị n’ibu agha.’ (Ọma 55:21) Ụfọdụ ndị “na-enwe ọnụma.” (Ilu 29:22) Ma e nwekwara ndị “nwere ezi ọchịchọ obi maka ndụ ebighị.” (Ọrụ 13:48) Taa, Jehova na-achịkọtara onwe ya ndị dị otú ahụ nwere ezi ọchịchọ obi. (Hag. 2:7) Olee otú anyị pụrụ isi nyere ha aka ịghọ ndị na-efe Jehova?
2. Gịnị ka ịrụzu ọrụ anyị nke ime ndị na-eso ụzọ na-agụnye?
2 Iji Ịdị Uchu Na-eme Nletaghachi: Inwe echiche kwesịrị ekwesị banyere ime nletaghachi dị anyị mkpa iji rụzuo ọrụ anyị nke ime ndị na-eso ụzọ. (Mat. 28:19, 20) Ànyị na-eji ịdị uchu esochi mmasị anyị chọtara? Ànyị na-eletaghachi ndị nile natara anyị akwụkwọ ma ọ bụ ndị gosiri mmasị n’ozi ọma ahụ? Ànyị na-anọgidesi ike ná mgbalị anyị inyere ha aka ito eto n’ụzọ ime mmụọ? Ebe ọ bụ na o metụtara ndụ, anyị kwesịrị ịgbalị ịzụlite mmasị nile anyị chọtara.
3. Gịnị ka i kwesịrị ime mgbe gị na mmadụ kparịtasịrị ụka n’ozi?
3 Mgbe ị ka na-echeta mkparịta ụka nke gị na onye ahụ nwere mmasị, wepụta oge iji detuo aha na adres ya. Detuo isiokwu unu kwurịtara, akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị a gụrụ, na akwụkwọ i nyefere. Mgbe nke ahụ gasịrị, gbalịa gaghachi ngwa ngwa o kwere mee.
4. Olee otú ị pụrụ isi mee nletaghachi ndị dị irè?
4 Ime Nletaghachi: Mgbe ị na-eme nletaghachi, ọ ga-adị mma inwe omume enyi na igosi ezi mmasị onwe onye n’ebe onye nwe ụlọ nọ. Mee ka mkparịta ụka unu dị mfe nghọta ma dabere n’Akwụkwọ Nsọ. Kwadebe otu isiokwu Bible na-adọrọ mmasị nke gị na ya ga-ekwurịta, ná ngwụsị nke nleta ahụ kwa, jụọ otu ajụjụ nke a pụrụ ịza ná nleta nke ọzọ. Ọ ga-akasị mma ma i zere ịrụ ụka n’ụzọ na-adịghị mkpa banyere echiche ndị na-adabereghị n’Akwụkwọ Nsọ, bụ́ nke onye nwe ụlọ pụrụ iwelite. Gbalịsie ike ịgbakwasị ụkwụ n’ihe ndị gị na ya kwekọrịtara.—Kọl. 4:6.
5. Mgbalị dị aṅaa ka otu onye ọsụ ụzọ mere, oleekwa ihe ndị si na ya pụta?
5 Ime nletaghachi chọrọ mgbalị, ma ụgwọ ọrụ ndị na-esi na ya apụta na-enye afọ ojuju. Otu onye ọsụ ụzọ na Japan setịpụrụ ihe mgbaru ọsọ nke inwetakwu nletaghachi kwa ọnwa. Ọ malitere inwe ihe ndekọ nke ndị nile o zutere n’ozi ụlọ n’ụlọ, n’ime ụbọchị asaa kwa, o letaghachiri ha. Ọ kwadebere ihe ọ ga-ekwu nke ọma ma jezuo ozi ya, na-enwe obi ike zuru ezu n’ozi ahụ nke ọ na-ezisa. N’otu n’ime nletaghachi ndị o mere, ọ maliteere otu onye ọmụmụ ihe, bụ́ onye kwuburu, sị: “Ọ dịtụbeghị mgbe m nabatara unu. Nke a bụ nke mbụ m na-aṅa unu ntị.” Ojiji onye ọsụ ụzọ ahụ ji ịhụnanya nọgidesie ike na-achọ inwetakwu nletaghachi rụpụtara ihe. Ná ngwụsị ọnwa ahụ, o duziri ọmụmụ Bible iri.
6. N’ihi gịnị ka anyị na-aghaghị ịnọgidesi ike n’ime nletaghachi?
6 Ọnọdụ ndị mmadụ na-agbanwe agbanwe mgbe nile. (1 Kọr. 7:31) A na-emekarị ọtụtụ mgbalị iji nwetaghachi onye nwere mmasị n’ụlọ. Site n’anyị iji ịdị uchu na-eme nletaghachi, anyị pụrụ inyere ndị nwere ezi ọchịchọ obi aka ịbanye n’ụzọ ahụ na-eduba ná ndụ ebighị ebi.—Mat. 7:13, 14.